Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Nọvemba
I kelechaa onye nwe ụlọ, gwa ya, sị: “Ọtụtụ ndị taa chọrọ ka e nwee ezigbo ọchịchị. Ma, olee ụdị ọchịchị i chere ga-akwụsị nsogbu ụmụ mmadụ? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Ụlọ Nche a kwuru.” Nye ya Ụlọ Nche Nọvemba 1, gị na ya tụleekwa ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16. I mechazie, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Nọvemba 1
I kelechaa onye nwe ụlọ, gwa ya, sị: “E nwere otu ajụjụ anyị na-ajụ ndị mmadụ, anyị ga-achọkwa ịma ihe i chere banyere ya. Weregodị ya na a sị gị jụọ Chineke otu ajụjụ, gịnị ka ị ga-ajụ ya? [Chere ka ọ zaa.] Jizọs kwuru na ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị chọọ ịma ihe na-edoghị anyị anya. [Gụọ Matiu 7:7.] Magazin a zara ajụjụ atọ dị mkpa.” Gosi ya ajụjụ ndị ahụ dị na peeji nke atọ.
Teta! Ọktoba–Disemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “O nwere otu ebe m ga-achọ ka anyị gụọ na Baịbụl. M ga-achọkwa ka ị gwa m ihe i chere banyere ya. [Gụọ Ndị Galeshia 6:7.] Ebe a gosiri na anyị niile ga-aza Chineke ajụjụ ihe ọ bụla anyị na-eme taa. Ma, olee ihe mere i ji chee na anyị ekwesịghị ịghọ aghụghọ n’ihe ọ bụla anyị na-eme? [Chere ka ọ zaa.]” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke iri na anọ. Kwuzie, sị: “Isiokwu a kwuru uru mmadụ ga-erite ma ọ bụrụ na ọ naghị aghọ aghụghọ.”