Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Nọvemba
“Ì chere na ndị na-agba mbọ ime ihe Chineke kwuru na-enwe obi ụtọ karịa ndị na-anaghị agba mbọ ime ya? [Chere ka ọ zaa.] O nwere ihe ndị ga-amasị gị e kwuru na magazin a.” Nye onye nwe ụlọ Ụlọ Nche Nọvemba 1, gị na ya tụleekwa ihe e dere n’okpuru otu n’ime ajụjụ ndị dị na peeji nke 16 na nke 17. Gụọkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. Unu mechazie, nyekwuo ya otu Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ ndị nke ọzọ.
Ụlọ Nche Nọvemba 1
“Ụfọdụ ndị na-eche na ihe Baịbụl na-ekwu ma a bịa n’okwu gbasara mmekọahụ enweghị uru ọ ga-abara ndị oge a. Ha na-asịkwa na naanị ihe Baịbụl na-eme bụ ịkpa mmadụ ahụ́. Ndị ọzọ na-asị na ihe Baịbụl kwuru n’okwu ahụ amaka. Olee ihe gịnwa chere? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe amaokwu Baịbụl a kwuru gbasara ebe ihe ndị e dere na Baịbụl si. [Gụọ 2 Timoti 3:16.] Magazin a kọwara ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ iri ndị mmadụ na-ajụkarị banyere mmekọahụ. O kwukwara otú ndụmọdụ Baịbụl ga-esi abara anyị uru n’okwu a.”
Teta! Ọktoba–Disemba
“Gịnị ka i chere ndị na-anya ụgbọala nwere ike ime ka a ghara ịna-enwekarị ihe mberede okporo ụzọ? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ndị Rom 13:1.] Otú ha ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru bụ idewe iwu na-achị okporo ụzọ, iyi belt oche ụgbọala ha, ilezi ụgbọala ha anya, ịhụ na ha anaghị aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ha anyawa ụgbọala nakwa na ha anaghị eji ekwe ntị ha edegara mmadụ ozi ma ọ bụ na-agụ ozi e ziteere ha mgbe ha na-anya ụgbọala. Isiokwu bidoro na peeji nke 26 na magazin a ga-akọkwuru gị ihe ndị a.”