Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Nọvemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, sị ya: “Biko, gee ntị ka m gụpụta ajụjụ a dị mkpa. [Gụpụta ajụjụ mbụ dị n’azụ Ụlọ Nche Nọvemba 1.] Gịnị ka i chere? [Gụọnụ paragraf abụọ dị n’okpuru ajụjụ ahụ. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ.] Olee ụbọchị ị ga-achọ ka m bịa ọzọ ka anyị kwuo banyere ihe mere Jizọs ji kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ nakwa otú ọrụ ebube a ọ rụrụ si gbasa anyị?”
Ụlọ Nche Nọvemba 1
“Ì chetụla ihe mere ihe ndị jọgburu onwe ha ji eme n’ụwa a? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa gị asị ya:] Mkpughe 12:9 gwara anyị ihe mere ha ji eme. [Gụọ ya.] Ma, amaokwu nke iri na abụọ ya kwuru ihe ga-eme ka anyị nwee nchekwube. [Gụọ Mkpughe 12:12.] Ebe a gosiri na ihe ọjọọ Setan na-eme ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Isiokwu a kwuru ihe anyị ga-eme ka Ekwensu ghara inweta anyị nakwa ihe Chineke ga-eme ya n’oge na-adịghị anya.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 6, nyezie ya Ụlọ Nche ahụ.
Teta! Nọvemba–Disemba
“Anyị bịara ka anyị na unu kparịta azịza ajụjụ a. [Gosi ya ajụjụ dị n’ihu Teta! ahụ.] Ị̀ chere na mmadụ ga-enwerịrị ego tupu ihe agawara ya nke ọma? [Ọ zachaa, sị ya:] Baịbụl kwuru otú anyị kwesịrị isi na-ele akụnụba anya. [Gụọ Luk 12:15.] Baịbụl gosiri na e nweghị onye ihe na-enweghị ike ịgara nke ọma. Teta! a ga-enyere gị aka ịghọta ihe ihe ịgara mmadụ nke ọma pụtara.”