Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 10
IZU NA-AMALITE NA MACH 10
Abụ nke 1 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 4 ¶1-9 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 40-42 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 41:1-16 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?—td 11A (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa—lr isi nke 9 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Otú Ofufe Ezinụlọ Ga-esi Baara Anyị Uru. Gbaa otu ezinụlọ ajụjụ ọnụ gbasara otú ha si enwe ofufe ezinụlọ. Gịnị ka ha na-adị amụ? Olee otú ha si ekpebi ihe ha ga-amụ? Olee ihe dị na jw.org ha jirila nwee ofufe ezinụlọ? Olee otú ofufe ezinụlọ si enyere ha aka ikwusa ozi ọma? Gịnị ka ha na-eme ka ihe ọzọ ghara igbochi ha inwe ya? Olee uru ha riterela?
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-agwa Ndị Na-achọghị Ịnụ Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuo ihe abụọ ma ọ bụ ihe atọ ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma nwere ike ikwu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo otú ha ga-esi aza onye kwuru ihe ahụ n’ozi ọma. Chetara ụmụnna na ná Nzukọ Ije Ozi anyị ga-enwe n’izu ga-amalite n’Eprel 7, ha ga-akọ otú ha si jiri aro ndị a tụụrụ anyị n’isiokwu a zie ozi ọma.
Abụ nke 97 na Ekpere