Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-agwa Ndị Na-achọghị Ịnụ Ozi Ọma
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Ka e were ya na ị nụrụ na ala ọma jijiji chọrọ ime. Ọ ga-egbu ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ha agbapụghị. Gị agaa ịgwa onye agbata obi gị, ya asị na ya enweghị efe ịnụ ihe ị chọrọ ikwu. Ị̀ ga-ahapụ ya ozugbo, pụwa? Mbanụ. Ị ga-agbalị mee ka ọ gee gị ntị. Ọtụtụ ndị anaghị achọ ige anyị ntị n’ihi na ha amaghị na ozi ọma anyị na-ekwusa ga-eme ka ha dị ndụ. O nwere ike ịbụ na ha ji ihe n’aka mgbe anyị bịara na nke ha. (Mat. 24:37-39) O nwekwara ike ịbụ na e nwere ihe a gwara ha banyere anyị. (Mat. 11:18, 19) Ha nwere ike ịna-eche na anyị na ndị chọọchị ndị ọzọ bụ otu ihe. (2 Pita 2:1, 2) N’ihi ya, ọ bụrụ na onye anyị gara na nke ya achọghị ige anyị ntị, anyị ekwesịghị ịpụwa ozugbo.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Ọ bụrụ na unu si na nke onye na-achọghị ige ntị pụta, gị na onye gị na ya so gaa ozi ọma kwuo ihe unu gaara agwa ya ka o gee ntị.