Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Ọktoba p. 6-11
  • Ị̀ ‘Na-eji Obi Gị Niile Erube Isi’?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ ‘Na-eji Obi Gị Niile Erube Isi’?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NA-ERUBERE NNE NA NNA GỊ ISI
  • NA-ERUBERE “NDỊ ỌCHỊCHỊ” ISI
  • NA-ERUBERE NZUKỌ JEHOVA ISI
  • “Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jizọs Na-erube Isi Mgbe Niile
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Nrubeisi Na-echebe Gị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Ọktoba p. 6-11

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 42

Ị̀ ‘Na-eji Obi Gị Niile Erube Isi’?

“Amamihe nke si n’eluigwe . . . na-eji obi ya niile erube isi.”​—JEMS 3:17.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Olee ihe mere o nwere ike iji na-esiri anyị ike irube isi?

È NWERE mgbe ọ na-esiri gị ike irube isi? E nwere mgbe o siiri Eze Devid ike. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Chineke, sị: “Mee ka irubere gị isi na-agụ m agụụ.” (Ọma 51:12) Devid hụrụ Jehova n’anya. Ma, mgbe ụfọdụ, o siiri ya ike irube isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. N’ihi gịnị? Nke mbụ bụ na mmehie anyị bu pụta ụwa na-eme ka anyị na-achọkarị inupụ isi. Nke abụọ bụ na Ekwensu na-agbalị mgbe niile ka anyị na-enupụ isi otú ahụ yanwa mere. (2 Kọr. 11:3) Nke atọ, ndị gbara anyị gburugburu n’ụwa a bụ ndi na-enupụ isi, ya bụ, ndị nwere “ụdị echiche nke na-akpa ike ugbu a n’ime ndị nnupụisi.” (Efe. 2:2) Ihe anyị kwesịrị ịna-alụso ọgụ abụghị naanị mmehie anyị bu pụta ụwa, anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike ka anyị ghara ịna-enupụ isi, bụ́ ihe Setan na ụwa ya chọrọ ka anyị na-eme. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị na-erubere Jehova na ndị o nyere ikike isi.

2. Gịnị ka mmadụ iji “obi ya niile erube isi” pụtara? (Jems 3:17)

2 Gụọ Jems 3:17. Jems si n’ike mmụọ nsọ kwuo na ndị ma ihe ‘na-eji obi ha niile erube isi.’ Chegodị ihe nke ahụ pụtara. O kwesịrị ịna-agụ anyị agụụ irubere ndị Jehova nyere ikike isi. N’eziokwu, Jehova anaghị atụ anya ka anyị rubere mmadụ isi ma onye ahụ gwa anyị ka anyị nupụrụ iwu Chineke isi.​—Ọrụ 4:18-20.

3. Olee ihe mere Jehova ji achọ ka anyị na-erubere ndị o nyere ikike isi?

3 O nwere ike ịdịrị anyị mfe irubere Jehova isi karịa mmadụ. A sị ka e kwuwe, ihe ọ bụla Jehova gwara anyị mee na-abụ ihe ziri ezi. (Ọma 19:7) Mana, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ụmụ mmadụ ndị nwere ikike. N’agbanyeghị ya, e nwere ikike Jehova nyere ndị nne na nna, ndị ọchịchị, na ndị okenye. (Ilu 6:20; 1 Tesa. 5:12; 1 Pita 2:13, 14) Ọ bụrụ na anyị erubere ha isi, anyị na-erubere Jehova isi. Ka anyị lee otú anyị nwere ike isi rubere ụmụ mmadụ Jehova nyere ikike isi, ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịnabata ihe ha kwuru nakwa ime ya eme.

NA-ERUBERE NNE NA NNA GỊ ISI

4. Gịnị mere ọtụtụ ụmụaka ji enupụrụ ndị mụrụ ha isi?

4 Ndị gbara ndị na-eto eto gburugburu bụ “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi.” (2 Tim. 3:1, 2) Gịnị mere ọtụtụ n’ime ha ji enupụ isi? Ụfọdụ nwere ike ịna-eche na nne na nna ha bụ ndị ihu abụọ, ya bụ, na ha anaghị eme ihe ha na-agwa hanwa bụ́ ụmụ ha ka ha mee. Ụfọdụ na-ewere ndụmọdụ nne na nna ha ka ihe oge ya gaferela, ihe na-agaghị ekwe omume, ma ọ bụkwanụ ihe na-anaghị ekwe ha megharịa ahụ́. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ò nwere mgbe ọ na-adị gị otú ahụ? Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ime ihe Jehova kwuru, nke bụ́: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi otú dị Onyenwe anyị mma, n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ.” (Efe. 6:1) Olee ihe ga-enyere gị aka irube isi n’iwu a?

5. Gịnị mere otú Jizọs si rubere nne na nna ya isi ji pụọ iche dị ka e dere na Luk 2:46-52?

5 I nwere ike ịmụta irube isi n’aka onye kacha erube isi, ya bụ, Jizọs. (1 Pita 2:21-24) Jizọs bụ mmadụ zuru okè nne na nna ya na-ezughị okè. Ma, ọ sọpụụrụ nne na nna ya, ma mgbe ha mejọrọ ihe ma mgbe ha ghọtahiere ya n’oge ụfọdụ. (Ọpụ. 20:12) Ka anyị legodị ihe mere mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ. (Gụọ Luk 2:46-52.) Nne na nna ya hapụrụ ya na Jeruselem. O doro anya na ọ bụ ọrụ Josef na Meri ịhụ na ụmụ ha niile so ha laghachi mgbe e mechara ememme ahụ. Mgbe Josef na Meri mechara hụ Jizọs, Meri tara Jizọs ụta maka nsogbu ọ kpataara ha. Jizọs gaara ekwu na ihe a ha mere adịghị mma. Kama ime otú ahụ, ọ zaghachiri nne na nna ya otú gosiri na ọ na-asọpụrụ ha. Ma, Josef na Meri “aghọtaghị ihe ahụ ọ gwara ha.” N’agbanyeghị ya, Jizọs “nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.”

6-7. Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka irubere nne na nna ha isi?

6 Ndị na-eto eto, è nwere mgbe ọ na-esiri unu ike irubere nne na nna unu isi ma ha mejọọ ihe ma ọ bụkwanụ ma ha ghọtahie unu? Gịnị ga-enyere unu aka? Nke mbụ, chee otú obi na-adị Jehova. Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na i rubere nne na nna gị isi, “ọ na-amasị Onyenwe anyị.” (Kọl. 3:20) Jehova ma mgbe ndị nne na nna unu na-aghọtachaghị unu ma ọ bụkwanụ mgbe ha mere iwu ga-esiri unu ike idebe. Ma, ọ bụrụ na unu erubere ha isi n’agbanyeghị ya, unu na-eme Jehova obi ụtọ.

7 Nke abụọ, chee gbasara otú obi ga-adị nne na nna gị. Ọ bụrụ na i rubere ha isi, obi ga-adị ha ụtọ, ha atụkwasịkwuo gị obi. (Ilu 23:22-25) O nwekwara ike ime ka gị na ha dịkwuo ná mma. Otu nwanna si Beljọm aha ya bụ Alexandre sịrị: “Mgbe m malitere irubere nne na nna m isi karịa otú m na-emebu, mụ na ha dịwakwuru ná mma, anyị ana-enwekwu obi ụtọ.”b Nke atọ, chee otú irubere nne na nna gị isi ga-esi abara gị uru n’ọdịnihu. Otu nwanna bi na Brazil aha ya bụ Paulo sịrị: “Ịmụta irubere nne na nna m isi enyerela m aka irubere Jehova na ndị ọzọ nwere ikike isi.” Okwu Chineke gwara anyị otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji na-erubere nne na nna anyị isi. Ọ sịrị: “Ka ihe wee gaziere gị, gị adịkwa ogologo ndụ n’ụwa.”​—Efe. 6:2, 3.

8. Gịnị mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji kpebie irubere nne na nna ha isi?

8 Ọtụtụ ndị na-eto eto ahụla uru ọ na-abara ha ma ha rube isi. E nwere otu nwanna nwaanyị sikwa Brazil aha ya bụ Luiza. O sibuuru ya ike ịghọta ihe mere nne na nna ya ekweghị ya nwee ekwentị n’oge ahụ. A sị ka e kwuwe, ọtụtụ ndị ọgbọ ya nwere ekwentị. Ma, o mechara ghọta na nne na nna ya na-echebe ya. Ugbu a, o kwuru na ọ bụrụ na ya erubere nne na nna ya isi, ọ bụghị agbụ ka ha na-eke ya n’ihi na ndụmọdụ ha na-enye ya bụ ihe dị ya mkpa. Ọ ka na-esiri otu nwa agbọghọ si Amerịka aha ya bụ Elizabeth ike mgbe ụfọdụ irubere nne na nna ya isi. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ aghọtachaghị ihe mere nne na nna m ji tie otu iwu, m na-echeta oge iwu ndị ha nyere n’oge ndị gara aga chebere m.” Monica, onye bi n’Amerịka, kwuru na ihe na-aka agara ya nke ọma mgbe o rubeere nne na nna ya isi karịa mgbe o nupụụrụ ha isi.

NA-ERUBERE “NDỊ ỌCHỊCHỊ” ISI

9. Olee otú idebe iwu na-adị ọtụtụ ndị?

9 Ọtụtụ ndị kwetara na e kwesịrị inwe ndị ọchịchị, nakwa na e kwesịrị ịna-erubere ụfọdụ n’ime iwu “ndị ọchịchị” nyere isi. (Rom 13:1) Ma, ọ na-esikwara otu ndị ahụ ike irubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụrụ na iwu ahụ adịghị ha mma ma ọ bụ na ha chere na o zighị ezi. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ịtụ ụtụ isi. Ọtụtụ ndị nọ n’otu obodo dị na Yurop kwetara na “ọ dị mma ka mmadụ ghara ịtụ ụtụ isi ma o chee na ụtụ isi ahụ adịghị mma.” Ọ bụ ya mere na ụmụ amaala obodo ahụ anaghị akwụ ụtụ isi niile ndị ọchịchị kwuru ka ha kwụọ.

Ebe Meri nọ ọdụ n’elu jakị, Josef eduru ha na-abanye Betlehem. Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna na-ele ihe na-egosi otú ụgbọala ya na-agbaru n’ọsọ mgbe o rutere n’ebe e kwuru otú mmadụ na-agaghị agbafe. 2. Ebe otu nwanna na-edejupụta akwụkwọ ụtụ isi. 3. Ebe otu nwanna nwaanyị yi ihe e ji ekpuchi imi, gharakwa ịnọ nọọsụ ya na ya na-ekwurịta okwu nso n’ụlọ ọgwụ.

Gịnị ka anyị na-amụta gbasara irube isi n’aka Josef na Meri? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12)c

10. Olee ihe mere anyị ji erube isi n’iwu ọ bụrụgodị na ọ dịghị anyị mma?

10 Baịbụl kwuru na ọchịchị ụmụ mmadụ na-akpata ahụhụ, na ọ dị n’aka Ekwensu, nakwa na a ga-ebibi ya n’oge na-adịghị anya. (Ọma 110:5, 6; Ekli. 8:9; Luk 4:5, 6) Ọ gwakwara anyị na “onye ọ bụla na-emegide ndị ọchịchị na-agba ihe Chineke haziri ụkwụ.” Ka ọ dị ugbu a, Jehova kwere ka ndị ọchịchị na-achị ka ihe ụfọdụ nwee ike ịna-aga otú o kwesịrị. Ọ na-atụkwa anya ka anyị na-erubere ha isi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ịna-enye mmadụ niile ihe ruuru ha,’ ya bụ, ma ịtụ ụtụ isi, ma ịsọpụrụ ha, ma irubere ha isi. (Rom 13:1-7) Anyị nwere ike iwere iwu ụfọdụ ha nyere ka ihe na-akpata nsogbu, ihe na-adịghị mma, ma ọ bụ ihe siri ike ndebe. Ma, anyị na-erubere Jehova isi. Jehova gwakwara anyị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi ma ọ bụrụ na ihe ha gwara anyị mee abụghị imebi iwu Chineke.​—Ọrụ 5:29.

11-12. Dị ka e kwuru na Luk 2:1-6, olee ihe Josef na Meri mere iji rubere iwu na-adịrịghị ha mfe isi, oleekwa uru ọ baara ha? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

11 Anyị ga-amụta ihe n’aka Josef na Meri. Ha rubeere ndị ọchịchị isi, ma mgbe o siiri ha ike. (Gụọ Luk 2:1-6.) Mgbe ọ fọrọ obere ka Meri mụọ nwa, ndị ọchịchị gwara ya na Josef ka ha mee ihe siri ike. Eze Ukwu Ọgọstọs nyere iwu na ndị niile nọ n’ebe ndị Rom na-achị ga-aga n’obodo ha ka e deba aha ha n’akwụkwọ. Josef na Meri gara Betlehem, bụ́ ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise (150). Ebe ahụ bụkwa ugwu ugwu. Njem ahụ agaghị adịrị ha mfe. Ọ ga-akacha esiri Meri ike. O nwere ike ịbụ na Meri na Josef nọ na-echegbu onwe ha gbasara ihe njem ahụ nwere ike ime Meri na nwa o bu n’afọ. Gịnị ka ha ga-eme ma ime mewe Meri n’ụzọ? Onye o bu n’afọ bụ onye ga-emecha bụrụ Mezaya. Ihe ndị a hà kwesịrị ime ka ha ghara irubere ndị ọchịchị isi?

12 Josef na Meri ekweghị ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ mee ka ha ghara irubere ndị ọchịchị isi. Jehova gọziri ha maka na ha rubere isi. Meri rutere na Betlehem n’udo, mụọ nwa nwoke gbasiri ike. Ihe a o mere nyekwara aka mezuo otu amụma dị na Baịbụl.​—Maị. 5:2.

13. Olee uru nrube isi anyị nwere ike ịbara ụmụnna anyị?

13 Ọ bụrụ na anyị erubere ndị ọchịchị isi, ọ na-abara anyị na ndị ọzọ uru. Olee otú ọ bụ? Otu ihe bụ na a naghị ata anyị ahụhụ a na-ata ndị na-ekweghị erubere iwu ahụ isi. (Rom 13:4) Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị ana-erubere ndị ọchịchị isi, o nwere ike ime ka ndị ọchịchị na-ele Ndịàmà Jehova anya ọma. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ afọ gara aga na Naịjirịa, ndị amị batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge a na-enwe ọmụmụ ihe, na-achọ ndị na-eme ngagharị iwe n’ihi na ha achọghị ịkwụ ụtụ isi. Ma, onyeisi ha gwara ha ka ha hapụ Ndịàmà Jehova. Ọ sịrị ha: “Ndịàmà Jehova na-akwụ ụtụ isi ha.” N’oge ọ bụla i rubere isi n’iwu ndị ọchịchị, i nwere ike iso mee ka a na-ele Ndịàmà Jehova anya ọma. Ihe a nwere ike ichebe Ndịàmà Jehova ibe gị n’ọdịnihu.​—Mat. 5:16.

14. Olee ihe nyeere otu nwanna nwaanyị aka ‘iji obi ya niile na-erubere’ ndị ọchịchị isi?

14 Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adịrị anyị mfe irubere ndị ọchịchị isi. Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Joanna sịrị: “O siiri m ezigbo ike irubere ndị ọchịchị isi n’ihi na ha mesiri ụfọdụ ndị ezinụlọ m ike.” Ma Joanna gbalịsiri ike ka ọ gbanwee otú o si eche echiche. Ihe mbụ o mere bụ na ọ kwụsịrị ịgụ akụkọ a na-akọsa n’Ịntanet nke na-ekwutọ ndị ọchịchị. (Ilu 20:3) Ihe nke abụọ o mere bụ ikpe ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka ịtụkwasị ya obi kama iche na ihe ga-eme ka ihe ka mma bụ ma a gbanwee ọchịchị. (Ọma 9:9, 10) Ihe nke atọ o mere bụ ịgụ akwụkwọ anyị na-ekwu gbasara ịdị iche n’ụwa. (Jọn 17:16) Ugbu a, Joanna kwuru na irubere ndị ọchịchị isi na ịkwanyere ha ùgwù emeela ka obi na-eru ya ala, meekwa ka ihe o nwere na-eju ya afọ.

NA-ERUBERE NZUKỌ JEHOVA ISI

15. Gịnị mere o nwere ike iji esiri anyị ike irube isi ná ntụziaka nzukọ Jehova nyere anyị?

15 Jehova gwara anyị ka anyị ‘na-erubere ndị na-eduzi’ anyị n’ọgbakọ isi. (Hib. 13:17) Ọ bụ eziokwu na Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs zuru okè, ndị ọ na-eji eduzi anyị n’ụwa ebe a ezughị okè. O nwere ike ịna-esiri anyị ike irubere ha isi, karịchaa ma ọ bụrụ na ha agwa anyị mee ihe anyị na-achọghị ime. O nwere mgbe o siiri Pita onyeozi ike irube isi. Mgbe otu mmụọ ozi gwara ya ka o rie ụmụ anụmanụ Iwu Mosis kwuru na ha adịghị ọcha, ọ jụrụ iri ha, ọ bụghị naanị otu ugboro, kama ugboro atọ. (Ọrụ 10:9-16) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ahụ a gwara ya mee yichara ihe na-enweghị isi. Ihe a mmụọ ozi a gwara ya mee dị iche n’ihe ọ mabu. Ọ bụrụ na o siiri Pita ike irubere mmụọ ozi zuru okè isi, o doro anya na ọ gaghị adịrị anyị mfe mgbe niile irubere ụmụ mmadụ na-ezughị okè isi.

16. Ọ bụ eziokwu na Pọl nwere ike ile ntụziaka e nyere ya anya ka ihe na-enweghị isi, gịnị ka o mere? (Ọrụ Ndịozi 21:23, 24, 26)

16 Pọl onyeozi “na-eji obi ya niile erube isi,” ma mgbe a gwara ya mee ihe nwere ike ịdị ya ka ihe na-enweghị isi. Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu nụrụ asịrị a gbara gbasara Pọl. A na-ekwu na ọ na-ekwusara ndị mmadụ “ka ha ghara ime ihe Iwu Mosis kwuru,” na-eledakwa Iwu Mosis anya. (Ọrụ 21:21) Ndị okenye nọ na Jeruselem gwara Pọl ka ọ kpọrọ ụmụ nwoke anọ gaa n’ụlọ nsọ mee onwe ya ka ọ dị ọcha iji gosi na ọ na-edebe Iwu Mosis. Ma, Pọl ma na Ndị Kraịst anaghị edebe Iwu Mosis. E nweghịkwa ihe ọjọọ o mere. N’agbanyeghị ya, Pọl rubere isi ozugbo. “N’echi ya, Pọl kpọọrọ ụmụ nwoke ndị ahụ gawa, ya na ha asachaa onwe ha otú iwu kwuru.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 21:23, 24, 26.) Ihe a Pọl mere mere ka ụmụnna dịrị n’otu.​—Rom 14:19, 21.

17. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Stephanie kọrọ?

17 E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Stephanie. O siiri ya ike irube isi ná ntụziaka alaka ụlọ ọrụ nyere n’obodo ya. Obi dị ya na di ya ụtọ na ha na-eje ozi n’ìgwè na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe. Ma, alaka ụlọ ọrụ mechiri ìgwè ahụ, e zigazie ya na di ya n’ọgbakọ na-eji asụsụ obodo ha amụ ihe. Nwanna Nwaanyị Stephanie sịrị: “Ezigbo iwe were m. Ekwetaghị m na mkpa karịrị n’ọgbakọ na-eji asụsụ obodo anyị amụ ihe.” N’agbanyeghị ya, ọ nabatara ntụziaka ọhụrụ a. Ọ sịrị: “Ka oge na-aga, m bịara hụ na mkpebi a ha mere dabara adaba. Anyị aghọọrọla ụfọdụ ụmụaka naanị ha bụ Ndịàmà Jehova n’ezinụlọ ha nne na nna. Nwanna nwaanyị m na-amụrụ ihe ugbu a bụ onye kwụsịburu ịga ozi ọma. Ugbu a, m na-enwekwu oge m na-eji amụ ihe n’onwe m.” Ọ sịkwara: “Akọnuche m anaghị enye m nsogbu n’ihi na m ma na m gbalịrị ike m niile irube isi.”

18. Olee otú irube isi si abara anyị uru?

18 Anyị nwere ike ịmụta irube isi. Jizọs “si n’ahụhụ ọ tara mụta irube isi.” (Hib. 5:8) Dịkwa ka Jizọs, anyị na-amụta irube isi ma ihe sie ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, n’oge ọrịa koronavaịrọs malitere ọhụrụ, a gwara anyị ka anyị kwụsị ịna-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị amụ ihe nakwa ka anyị kwụsị ịga ozi ụlọ n’ụlọ. Ò siiri gị ike irube isi? Ma, otú i si rube isi chebere gị, mee ka gị na ụmụnna gị dịrị n’otu, meekwa Jehova obi ụtọ. Anyị niile ejikerela ugbu a irube isi ná ntụziaka ọ bụla a ga-enye anyị n’oge oké mkpagbu. O nwere ike ime ka anyị dị ndụ.​—Job 36:11.

19. Olee ihe mere i ji chọọ ịna-erube isi?

19 Anyị amụtala na irube isi na-eweta ọtụtụ ngọzi. Ma ihe mere anyị ji ekpebi irubere Jehova isi bụ na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa ime ihe dị ya mma. (1 Jọn 5:3) Anyị agaghị akwụli Jehova ụgwọ ihe niile o meere anyị. (Ọma 116:12) Ma, anyị nwere ike irubere ya na ndị o nyere ikike isi. Ọ bụrụ na anyị erube isi, ọ na-egosi na anyị ma ihe. Ndị ma ihe na-eme Jehova obi ụtọ.​—Ilu 27:11.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee ihe mere ụmụaka kwesịrị iji na-erubere ndị mụrụ ha isi?

  • Olee ihe mere Ndị Kraịst kwesịrị iji na-erubere “ndị ọchịchị” isi?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erube isi ná ntụziaka si ná nzukọ Jehova?

ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

a Ebe anyị na-ezughị okè, ọ na-esiri anyị ike irube isi mgbe ụfọdụ, ma mgbe onye na-enye anyị ntụziaka nwere ikike ime otú ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-erubere ndị mụrụ anyị, “ndị ọchịchị,” nakwa ndị na-eduzi anyị n’ọgbakọ isi.

b Ị chọọ ịmata ihe ndị ga-enyere gị aka ịgwa nne na nna gị gbasara iwu ndị ha tiri n’ụlọ na-esiri gị ike ndebe, gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Agwa Ndị Mụrụ M Okwu Gbasara Iwu Ndị Ha Nyere M?”

c NKỌWA FOTO: Josef na Meri rubeere iwu Siza nyere isi, gaa Betlehem deba aha ha n’akwụkwọ. Ndị Kraịst taa na-edebe iwu okporo ụzọ, na-atụ ụtụ isi, na-esokwa ntụziaka “ndị ọchịchị” nyere maka ahụ́ ike.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya