Okwu Mmalite
Ụwa anyị bi n’ime ya taa jupụtara n’ọrịa ọjọọ dị iche iche. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ibute ha?
Otu Akwụkwọ mgbe ochie okwu amamihe juru n’ime ya, sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.”—Ilu 22:3.
“Teta!” a kọwara ihe dị iche iche anyị nwere ike ime iji zoo onwe anyị ka anyị ghara ịna-ebutekarị ọrịa.