Obi Ụtọ Anyị Na-enweta Ma Anyị Nye Ndị Ọzọ Onyinye
“A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—ỌRỤ NDỊOZI 20:35.
Ihe mere ụfọdụ ndị ji agba Krismas.
Jizọs kwuru na ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya onyinye, obi na-atọ ma yanwa ma onye o nyere onyinye ahụ ụtọ. N’oge Krismas, ọtụtụ ndị na-enye ndị ọzọ ihe maka na ha chọrọ ka ha nweta obi ụtọ mmadụ na-enweta ma o nye onye ọzọ onyinye. Dị ka ihe atụ, otu nchọpụta e mere gosiri na n’agbanyeghị otú ihe si sie ezigbo ike ná mba Ayaland n’afọ gara aga, ezinụlọ ọ bụla zụtara onyinye karịrị otu narị puku naịra ha ga-enye ndị ọzọ.
Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike inweta obi ụtọ ma ha nye ndị ọzọ onyinye n’oge Krismas?
Ọtụtụ onyinye ndị mmadụ na-enye n’oge Krismas anaghị eme ka ha nwee obi ụtọ, kama ọ na-ekowe ha obi n’elu. Gịnị mere o ji ekowe ha obi n’elu? N’oge ahụ, ọtụtụ ndị na-eji ihere azụ ihe aka ha na-erughị ka ha nwee ike inye ndị ọzọ onyinye. Ihe ọzọ bụ na mmadụ niile na-aga azụ ihe n’otu oge ahụ, ya emee ka ndị mmadụ na-akwụ n’ahịrị ruo ogologo oge tupu ha azụta ihe ha chọrọ. Nke a na-akpasukwa ọtụtụ ndị bịara ịzụ ihe iwe.
Otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere gị aka.
Jizọs kwuru, sị: “Na-enyenụ ihe.”a (Luk 6:38) Ihe ọ na-ekwu abụghị na e nwere oge a kpọrọ aha a ga na-enye ndị mmadụ onyinye n’afọ, ya bụ, oge ndị mmadụ na-atụ anya ka e nye ha onyinye. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-enye ndị ọzọ ihe mgbe ọ bụla o metụrụ ha n’obi.
“Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na ihe Pọl na-ekwu ebe a bụ na mmadụ ekwesịghị inye ihe ka à ga-asị na a manyere ya amanye. Ihe mmadụ ‘iji obi ụtọ enye ihe’ pụtara bụ na onye ahụ na-eji obi ya niile enye ndị ọzọ onyinye. O nwekwanụghị onye a kpọrọ aha ọ ga-enye onyinye, ma ọ bụ ihe ọ ga-enye onye ahụ, na mgbe ọ ga-enye ya onye ahụ. Ma otú e si enyekarị onyinye n’oge Krismas dị iche n’otú ahụ Pọl kwuru.
“Ọ bụrụ na unu bu ụzọ dịrị njikere, ọ bụ ihe a na-anabata karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.” (2 Ndị Kọrịnt 8:12) Chineke agwaghị Ndị Kraịst ka ha gaa gbazite ego ka ha nwee ike ịzụta ihe dị oké ọnụ ha ga-enye ndị mmadụ. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na mmadụ enye ‘dị ka ihe o nwere si dị,’ onyinye ya ga-abụ nke ‘a na-anabata nke ọma,’ ọ bụghị nke e nyere ka a sịkwa na o nyere onyinye. Ihe a Baịbụl kwuru dị nnọọ iche n’ihe ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agwa ndị mmadụ n’oge Krismas. Ha na-agwa ndị mmadụ “bịa zụrụ, echi gị akwụọ ụgwọ.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Otú e si sụgharịa ebe a na Baịbụl ụfọdụ bụ “Gbasapụ aka nye.” Ma, okwu Grik e dere n’amaokwu a gosiri na ọ bụ ihe e kwesịrị ime mgbe niile. Ọ bụ ya mere e ji sụgharịa ya “na-enyenụ ihe” na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.