Kwadebe Maka Nzukọ Ọgbakọ Nile ma Nụ Ụtọ Ha
1 Dị ka òtù ndị bụ ụmụnna, anyị na-eji amamihe na-ezukọta mgbe nile maka nzukọ kwa izu anyị. (1 Tim. 4:15, 16) Olee otú anyị pụrụ isi nụ ụtọ ma rite uru kasị ukwuu site na ha?
2 E kwesịrị isetịpụ oge mgbe mgbe iji kwadebe maka nzukọ. Ụfọdụ pụrụ inwe ike iji oge ka ukwuu mee nkwadebe karịa ndị ọzọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú anyị si jiri ọrụ n’aka, ọ bụ ihe amamihe iwepụta oge ụfọdụ iji kwedebe maka nzukọ. Ịkwadokọ nzukọ dị ka otu ezinụlọ bara uru karịsịa.—Efe. 5:15, 16.
3 Maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke: Gbalịa ịdị na-agbasochi usoro ọgụgụ Bible kwa izu anya. (Josh. 1:8) Tụlee ihe ndị a ga-eji mee ihe, wetakwa akwụkwọ ndị kwesịrị ekwesị ka i wee nwee ike ịgbaso ndị ọkà okwu. Chee echiche banyere ụzọ ị pụrụ isi jiri ihe ọmụma a mee ihe n’ozi gị.
4 Maka Nzukọ Ije Ozi: Nyochaa usoro ihe omume e depụtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gụọ isiokwu ndị a ga-atụle. Ọ bụrụ na a ga-atụle ihe mmụta sitere n’isiokwu dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ n’akwụkwọ ndị ọzọ, chọpụta nke ahụ ma gụọkwa ya. Ọ bụrụ na a ga-eme ihe ngosi ozi ubi, tụlee ndị a tupu oge eruo ka i wee dị njikere iji ha mee ihe n’ozi gị.
5 Maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche: Gụọ ihe ọmụmụ ahụ tupu oge eruo, na-arịba ama azịza nye ajụjụ nile. Ịsapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha ga-enyere gị aka inweta nghọta ka mma. Ịtụgharị uche n’ụzọ ihe mmụta ahụ si kwenyekọọ n’ihe ị matawororịị ga-eme ka ihe ọmụma gị saa mbara. Mee atụmatụ ikere òkè n’oge ọmụmụ ihe ahụ site n’ịkwadebe okwu ndị dị mkpirikpi na ma ọ dịkarịa ala n’otu paragraf ma ọ bụ abụọ. Nke a bụ ụzọ dị mkpa isi mee “nkwupụta nke olileanya anyị.”—Hib. 10:23.
6 Maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ: Nke mbụ, nyochazuo ihe ọmụmụ ahụ; tụlee isiokwu isiakwụkwọ ahụ na isiokwu nta dị iche iche. Mgbe ahụ, ka ị na-agụ ya, rịba ama echiche ndị bụ isi. Tụlee amaokwu Bible ndị na-akwado ha. Gbalịa ịza ajụjụ ndị ahụ n’okwu nke aka gị. Mgbe ị kwadebesịworo ihe ọmụmụ ahụ, tụleghachi ya n’uche gị. Gbalịa icheta ihe ndị bụ isi na ebe echiche ndị ahụ lekwasịrị anya.—2 Tim. 2:15.
7 Nụ Ụtọ Nzukọ Nile: Iji nụ ụtọ nzukọ nile n’ụzọ zuru ezu, ọ dị mkpa ịbịa nnọọ n’oge iji wee kere òkè n’ekpere mmeghe, na-arịọ maka mmụọ Jehova. Ị na-eritekwa uru site n’abụ Alaeze ndị na-enye ume ọhụrụ. Ọ bụrụ na i nweghị obere ụmụaka ma ọ bụ nwee ihe ọzọ mere ị ga-eji nọrọ n’azụ n’ụlọ nzukọ, eleghị anya ị ga-achọpụta na ọ bụrụ na ị nọrọ n’ebe ihu, a ga-enwe ndọpụ uche ole na ole karị, ị ga-eritekwa uru ka ukwuu site n’usoro ihe omume ahụ. Ndị nne na nna nwere obere ụmụaka ndị a pụrụ inwe mkpa ịkpọpụ èzí n’oge nzukọ ahụ pụrụ ibelata ndọpụ uche site n’ịnọdụ n’ebe dị nso n’ụzọ e si apụ apụ na n’ebe azụ.
8 Gbalịa ịsapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na-agụ. Nke a ga-enyere gị aka icheta ihe ị na-anụ. Ịgwa ezinụlọ gị na ndị enyi gị banyere ihe ị na-amụta ga-eme ka ihe ọmụma ahụ dịgide n’uche gị. Itinye aro ndị a n’ọrụ ga-eme ka nzukọ dị iche iche nwee ihe ha pụtara karị, dịkwa ụtọ karị, ha ‘ga-akpasukwa ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche n’ime anyị’ n’ezie.—Hib. 10:24, 25.