Chọpụta Ndị Nwere Ọnọdụ Uche Ziri Ezi
1 Otu nzube nke ọrụ nkwusa ahụ bụ ịchọta ndị “nwere ọnọdụ uche ziri ezi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48, NW) Nkesa nke magazin Ụlọ Nche na Teta! abụwo ụzọ magburu onwe ya isi mezuo nke a, ebe ọ bụ na akwụkwọ anyị ndị ahụ na-eme ka ndị mmadụ mara olileanya Alaeze ahụ. Anyị ga-enyefe ụtụ Ụlọ Nche n’April. N’ebe a na-anataghị ụtụ, a pụrụ inyefe mkpụrụ ole na ole nke magazin ndị ahụ. E nwere olileanya na n’ebe a chọtara mmasị, anyị pụrụ ịmalite ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ndị a bụ aro ụfọdụ pụrụ ịdịrị gị irè:
2 Mgbe i ji “Ụlọ Nche” April 1 eme ihe, ị pụrụ iche n’ihu mmadụ isiokwu bụ́ “Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!,” nke lekwasịrị anya n’okwu ihu ọha nke mgbakọ distrikti anyị gara aga, ma sị:
◼ “Ọtụtụ ndị anyị na-agwa okwu nwere okwukwe na Chineke. Ọ na-esiri ndị ọzọ ike ikwenye na ya. Gịnị bụ echiche gị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ gbara anyị gburugburu na-anwapụta na a ghaghị inwe Chineke. [Gụọ Abụ Ọma 104:24.] Mgbe anyị hụrụ kamera ma ọ bụ kọmputa, anyị na-amata ozugbo na ọ ghaghị ịbụ onye nhazi nwere ọgụgụ isi mepụtara ya. Ezi uche ọ̀ ga-adị na ya ikwu na ihe ndị ka dị mgbagwoju anya, dị ka ụwa na anyị bụ́ ụmụ mmadụ, malitere na mberede?” Jiri otu paragraf sitere n’isiokwu ahụ gosi ezi ihe mere a ga-eji kwere na Chineke. Mgbe ahụ nyefee ụtụ.
3 “Ụlọ Nche” April 15 nwere isiokwu bụ́ “Ihe Mere Ezi Okpukpe Ji Na-enweta Ngọzi Chineke.” Ị pụrụ ịjụ:
◼ “Ebe ọtụtụ narị okpukpe dị n’ụwa, ì chere na Chineke pụrụ ịdị na-anakwere ha nile? [Nye ohere maka nzaghachi.] Jisọs buru amụma na n’agbanyeghị nzọrọ nke ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe, a ga-ajụ ndị na-adịghị eme uche Chineke. [Gụọ Matiu 7:21-23.] Ọ dị mkpa na anyị matara ezi okpukpe ahụ Jisọs kụziri.” Sapeta isiokwu bụ́ “Mkpụrụ Dị Aṅaa Ka Ezi Okpukpe Na-aghaghị Ịmịpụta?” nke dị na peji nke 16, ma tụlee otu ihe atụ iji kọwaa isi ihe ahụ. Mgbe ahụ nyefee ụtụ.
4 Mgbe i ji isiokwu dị na “Teta!” May 8, “Mgbe Agha Na-agaghị Adịkwa,” eme ihe, ị pụrụ ịtụle ikwu, sị:
◼ “Na narị afọ a e nwewo ọtụtụ narị agha, gụnyere agha ụwa abụọ. Ma ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ndú nile nke ụwa na-ekwu na ha chọrọ udo. Onye ọ bụla m maara na-ekwu otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ udo, n’ihi gịnị ka ha na-enweghị ike inweta ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Gịnị ka i chere dị mkpa ka anyị wee hụ ezi udo n’elu ụwa?” Mgbe onye nwe ụlọ zaghachisịrị, sapeta peji nke 8 na 9 ma gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 46:8, 9. N’iji foto na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara eme ihe, gosi ụzọ Alaeze Chineke ga-esi weta udo zuru ụwa ọnụ nke ga-adịru ebighị ebi. N’oge a kwuo okwu banyere ụtụ maka Ụlọ Nche. Ma ọ bụrụ na a naraghị ụtụ, a pụrụ inyefe mkpụrụ magazin ole na ole, ị pụkwara idokwa maka ịgaghachi.
5 Ọ bụrụ na ị hụ ọtụtụ ndị na-asị na ha ji ọrụ n’aka, ị pụrụ ịnwale nke a:
◼ “Anyị nwere mmasị n’inyere ndị ndụ ha jupụtara n’ihe omume na ndị na-enwe oge dị nta aka ịtụgharị uche n’akụkụ ime mmụọ nke ndụ. A haziri magazin anyị, Ụlọ Nche na Teta!, inye ihe ọmụma dị mkpirikpi banyere isiokwu ndị dị mkpa na-emetụta gị na ezinụlọ gị. M ga-achọ ịhapụrụ gị ndị a ka ị gụọ.”
6 Na-achọpụtazu ndị nwere ọnọdụ uche ziri ezi. Ha ga-erite uru n’ezie site n’ịgụ Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ ndị na-eweta “ozi ọma nke ezi ihe.”—Aịsa. 52:7.