Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/96 p. 8
  • Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chọpụta Ndị Nwere Ọnọdụ Uche Ziri Ezi
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ụlọ Nche na Teta!—Akwụkwọ Eziokwu Ndị Na-abịa n’Oge Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 5/96 p. 8

Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu

1 Otu n’ime ihe abụọ kasị ukwuu e nyere n’iwu bụ: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mat. 22:39) Ịhụnanya dị otú ahụ ga-akpali anyị isoro ndị agbata obi anyị kerịta ihe kasị mma anyị nwere—eziokwu nke anyị chọtaworo n’Okwu Chineke. Ebe ọ bụ na magazin Ụlọ Nche na Teta! na-eme ka ozi nke eziokwu Bible dapụta ụda, ikesa magazin ndị a n’ọnwa May bụ otu ụzọ anyị isi ‘na-ekwu eziokwu n’ebe ndị agbata obi anyị nọ.’—Efe. 4:25.

2 E kwesịrị inyefe “Teta!” May 8 ruo mgbe nke unu nwere gwụrụ. Ị pụrụ ịmalite okwu gị site n’ịjụ, sị:

◼ “Gịnị bụ mmeghachi omume gị n’ebe ụwa agha na-adịghị dị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ị̀ maara na okpukpe dị iche iche nke ụwa na-akwado agha na ogbugbu? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’ụzọ dị nnọọ iche, rịba ama ihe Bible na-ekwu na ndị na-efe Chineke ezi ofufe ga-eme.” Gụpụta Aịsaịa 2:2-4 site n’elu elu peji nke 12 magazin ahụ, mgbe ahụkwa gụpụta paragraf nke mbụ na peji nke 18 n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Òkù A Na-akpọ Ndị Hụrụ Udo n’Anya.” Ọzọ, jụọ, sị: “Ị̀ maara otú Chineke ga-esi mee nke ahụ? A na-achọta azịza ya na magazin a, nke a bụkwa nke gị ịgụ. Ọ bụ n’ụtụ ₦20 nanị.”

3 Mgbe ị na-enyefe “Ụlọ Nche” May 15, gbalịa izo aka n’ihe akụkọ mere n’oge na-adịbeghị anya nke kpatawooro ndị mmadụ inwe mmetụta nke anọghị ná ntụkwasị obi, mgbe ahụ jụọ, sị:

◼ “Gịnị ka i chere ọ ga-ewe iji mee ka anyị nwee mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi n’ezie ná ndụ a? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’eziokwu nile, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi idozi nsogbu ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu? [Nye ohere maka nzaghachi; mgbe ahụ gụọ Abụ Ọma 146:3.] Onye ọbụ abụ ahụ gara n’ihu inye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee nchekwube banyere ọdịnihu. [Gụọ Abụ Ọma 146:5, 6.] Isiokwu a, ‘Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Ugbu A na Mgbe Ebighị Ebi,’ na-akọwa ihe mere anyị pụrụ iji tụkwasị Jehova Chineke obi iweta ọnọdụ ndị ka mma n’ụwa.” Nyefee magazin ụfọdụ, meekwa ndokwa ịlọghachi iji tụlee otú o si kwe omume ịnụ ụtọ ndụ dị ntụkwasị obi ugbu a.

4 N’ihi enweghị mmasị n’ihe banyere okpukpe nke zuru ụwa ọnụ, ikekwe a ga-anabata isiokwu ndị dị na “Teta!” nke April 8, 1996, nke ọma. Ị pụrụ iwebata magazin ahụ site n’ịsị:

◼ “Ma ọ́ bụghị na ọtụtụ ndị taa agbahapụwo okpukpe ha ya abụrụ na ha adịkwaghị egosipụta ịnụ ọkụ n’obi nke okpukpe. Gịnị ka i chere na ọ bụ ihe kpatara ya?” Nye ohere maka nzaghachi ma jaa onye nwe ụlọ mma. Ị pụrụ ịga n’ihu site n’ikwu, sị: “N’ihi ihu abụọ dị n’etiti ndị ndú okpukpe, ọtụtụ ndị adịkwaghị enwe mmasị n’okpukpe ọ bụla a haziri ahazi. Ma ì chere na ọ dị ihe okpukpe pụtara n’ezie?” Nye ohere maka nzaghachi. Gosi onye nwe ụlọ ihu peji nke magazin ahụ, gụpụtakwa nhota ahụ dị na peji nke 9 n’okpuru isiokwu bụ́ “À Gụwo Ụbọchị Okpukpe Ọnụ?” Zoo aka n’Aịsaịa 11:9, bụ́ akụkụ akwụkwọ nsọ ebe e si weta nhota ahụ. Mgbe ahụ nyefee magazin ahụ, na-ekwu, sị: “Mgbe ọzọ m ga-abịa, m ga-achọ isoro gị tụlee ụzọ e si achọta okpukpe nke Chineke na-anakwere.”

5 Ọ bụrụ na ị họọrọ okwu dị nkenke, ị pụrụ ịnwale nke a:

◼ “Ọtụtụ ndị na-eche na ihe ka ukwuu na magazin ndị a ma ama nke taa na-ebu oké azụmahịa, mmekọahụ, ma ọ bụ ime ihe ike. [Gosi Ụlọ Nche na Teta!] Anyị na-ekesa magazin ndị na-ewuli elu bụ́ ndị dabeere na Bible. Ha na-akụzi ihe nke ukwuu, na-ezikwa anyị ife Chineke ofufe, ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya, na inwe àgwà ziri ezi. Ọ bụrụ na i nwere mmasị n’ihe ọgụgụ ndị dị ka nke a, amaara m na ị ga-anụ ụtọ ihe ị ga-achọta ná mbipụta ndị a.”

6 Ọ bụrụ na anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ịgwa ndị agbata obi anyị eziokwu, anyị ga-enwe ike iwetara ọtụtụ ndị ọṅụ dị ukwuu.—Ọrụ 8:4, 8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya