Nọgide Na-ekwu Eziokwu
1 Ndị ozi kwuru, sị: “Anyị onwe anyị apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa.” (Ọrụ 4:20) Taa, anyị aghaghị ịnọgide na-ekwu eziokwu. Ọ bụ ezie na nkesa nke Ụlọ Nche na Teta! bụ ụzọ isi chọta ndị ga-ege ntị, anyị aghaghị ịlaghachi ma ọ bụrụ na anyị ga-akụzikwuru ndị nwere mmasị eziokwu ahụ.
2 Mgbe ị na-esochi ntinye nke “Teta!” pụrụ iche nke May, n’isiokwu bụ́ “Mgbe Agha Na-agaghị Adịkwa,” ị pụrụ ịmalite ọmụmụ Bible site n’ịjụ, sị:
◼ “N’oge gara aga, anyị kwuru banyere agha nke mba dị iche iche na òkè okpukpe na-ekere na ha. Ị̀ ghọtawo na ihe omume ndị dị otú ahụ na-anwapụta n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi n’ihe Bible na-akpọ mgbe ikpeazụ? [Gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma. Gụọ paragraf nke mbụ n’isi nke 11, kọwapụtakwa igbe dị na peji nke 102.] Akwụkwọ a na-akọwa isiokwu a, ya na 18 ndị ọzọ e depụtara n’ihe ndị dị n’ime ya. [Gosi peji nke 3.] Ọ bụrụ na ị chọọ, m ga-achọ igosi otú akwụkwọ a pụrụ isi nyere gị aka ịghọta okwu Bible ndị a dị mkpa.” Ọ bụrụ e nye gị ohere, malite ọmụmụ ihe na peji nke 6.
3 Ọ bụrụ na i kwere nkwa ịlọghachi wee kọwaa otú o si kwe omume ịnụ ụtọ ndụ dị ntụkwasị obi ugbu a, ị pụrụ ikwu ihe yiri nke a:
◼ “Mgbe anyị zutere na mbụ, esooro m gị kwurịta otu akụkụ Bible nke na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee nchekwube banyere ọdịnihu mmadụ. Taa m ga-achọ ịdọrọ uche gị gaa n’ihe na-egosi onye ọ bụ ya pụrụ inye anyị mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi ugbu a.” Gụọ Abụ Ọma 4:8. Sapeta akwụkwọ Ihe Ọmụma na peji nke 168 ma gụpụta paragraf nke 19. Mgbe ahụ jụọ, sị: “Ọ̀ ga-amasị gị inwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, nke na-egosi n’ụzọ doro anya otú gị onwe gị pụrụ isi nweta ụdị ịnọ ná ntụkwasị obi dị otú a ná ndụ gị?” Ọ bụrụ na azịza ya bụ ee, sapeta isi nke 1.
4 Ọ bụrụ na unu kwurịtara enweghị mmasị n’okpukpe n’ọbịbịa gị nke gara aga, ná nletaghachi ị pụrụ ịnwale ụzọ nke a:
◼ “Ị pụrụ icheta na anyị kwurịtara banyere enweghị mmasị n’okpukpe n’ọbịbịa m nke gara aga, ekwekwara m nkwa na anyị ga-atụle n’oge a otú e si achọta okpukpe nke Chineke na-anakwere. Okwu Jisọs nke e dekọrọ na Matiu 7:21-23 pụrụ imetụta àgwà mmadụ n’ebe okpukpe dị. [Gụọ ma kọwaa akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ.] N’oge gara aga anyị gụrụ Aịsaịa 11:9 banyere ịba ụba nke ihe ọmụma Chineke n’elu ụwa. [Kọwaa ná mkpirikpi.] Iji nweta ihe ọmụma dị otú ahụ ọ dị mkpa ịmụchi Bible anya. Bible nwere ọtụtụ ntụziaka ndị ga-enyere anyị aka ịchọta okpukpe nke Chineke na-anakwere.” Zoo aka n’isi nke 5 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma, “Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?,” gụpụtakwa paragraf abụọ mbụ. Mgbe ahụ nyefee akwụkwọ ahụ n’ọnụ ego a na-enyefe ya ma dokwaa ịlọghachi iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ.
5 Ị pụrụ ikwu kpọmkwem ka e nwee ọmụmụ ihe ná nletaghachi site n’ikwu, sị:
◼ “Anyị na-ekesa magazin anyị n’ụwa nile iji gwa ndị mmadụ n’ebe nile ihe Bible na-akụzi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwee mmasị n’ihe ha mụtara, anyị na-eduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. [Zoo aka n’igbe bụ́ ‘Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?’ nke dị n’azụ Ụlọ Nche.] Anyị na-eji akwụkwọ a, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, eme ihe dị ka ihe nduzi. Ka m gosi gị ná mkpirikpi otú e si eduzi ọmụmụ ihe.”
6 Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwu eziokwu, anyị pụrụ ijide n’aka na a ga-enwe ndị ga-aṅa ntị ma zaghachi n’ụzọ dị mma.—Mak 4:20.