Laghachi Iji Zọpụta Ụfọdụ
1 Ọ bụ uche Chineke “ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nye aka? Buru ịkụzi eziokwu ahụ n’uche na-eme nletaghachi. Gịnị ka ị ga-ekwu? Aro ndị na-esonụ pụrụ inyere gị aka.
2 Mgbe ị na-akpọtụrụ onye naara akwụkwọ “Ka Alaeze Gị Bịa,” ị pụrụ izo aka ọzọ n’ihe osise dị na peji nke 4 na 5 ma jụọ onye nwe ụlọ sị:
◼ “Mgbe ị tụlekwuru akwụkwọ m hapụụrụ gị ma chee echiche banyere nkwa Chineke maka ụwa paradaịs, olee ihe bụ mmetụta gị banyere nkwa ndị dị ebube Chineke kweworo ihe a kpọrọ mmadụ?” Mgbe i gosisịrị na ị nụrụ azịza onye nwe ụlọ ma kwuo okwu dị mkpirikpi banyere ya, ị pụrụ ịdọrọ uche gaa n’isi nke 6 ma tụlee ụzọ anyị kwesịrị isi zaghachi n’ohere nke ndụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchị zuru okè. Tụlee paragraf nke 1-3 na akụkụ akwụkwọ nsọ nile e zoro aka na ha na paragraf ndị ahụ.
3 Ọ bụrụ na i jiri okwu mmeghe dị na peji nke 12, paragraf nke 5, nke akwụkwọ “Reasoning” nyefee akwụkwọ ‘Alaeze Bịa,’ ị pụrụ ịmaliteghachị nkwurịta okwu gị site n’ịsị:
◼ “Mgbe m bịaburu ebe a, anyị kparịtara banyere ịdị adị n’ezie nke Alaeze Chineke. Anyị tụlere ihe Alaeze Chineke ga-arụzu, dị ka iwepụ ọnwụ na iru újú, na ime ka ụwa ghọọ paradaịs. Ajụjụ dị ya ugbu a bụ: Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji ruo eru maka ngọzi ndị a? Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.]” Sapeta peji nke 174 na 175 ma tụlee echiche ndị dị na paragraf nke 1-4, na-emesi ike mkpa nke ime mkpebi dị ka nke ndị Kraịst oge mbụ mere ijere Jehova ozi. Kọwaa ụzọ ọmụmụ Bible oge nile ga-esi nyere ya aka ijere Jehova ozi.
4 Ị pụrụ iji ụzọ nke a sochie ntinye nke akwụkwọ “Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma”:
◼ “N’oge mbụ m dọọrọ uche gị gaa ná nkwa Chineke nke ga-eme ka ndụ anyị nwee nzube. M kpọtụkwara uche na anyị pụrụ inwe ụzọ ndụ nke kachasị mma ugbu a site n’itinye ụkpụrụ Jehova n’ọrụ ná ndụ anyị. Olee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu? M ga-achọ iwere nanị minit ole na ole iji soro gị tụlee isi ihe ụfọdụ dị na peji nke 9, paragraf nke 11, banyere ihe mere ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ji bụrụ ụzọ ndụ nke kachasị mma.” Gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e depụtara ma kọwaa ha.
5 Ị pụrụ isochi ntinye nke akwụkwọ “Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya” site n’ịsị:
◼ “M chọrọ ịlọghachi iji gosi gị ihe mere anyị pụrụ iji lepụ anya n’ọdịnihu n’obi ike.” Soro ya tụlee isi nke 2, paragraf nke 24-28. Nwapụta na Onye Mere anyị nwere mmasị n’ọdịnihu ya. Ịtụlekwu akwụkwọ ahụ ga-enye ntụle nke ndụmọdụ ezi omume nke Jehova maka ọdịmma ya. Kwuo ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
6 Cheta na ihe mgbaru ọsọ dị n’ime nletaghachi bụ ịmalite ọmụmụ Bible. A haziri akwụkwọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, n’ụzọ pụrụ iche maka iduzi ọmụmụ ihe. Mgbe anyị sochiri ntinye nke akwụkwọ ndị ochie ma malite ọmụmụ ihe n’ezie, ọ ga-adị mma ịdọrọ uche gaa n’akwụkwọ ọhụrụ a. Anyị ga-enweta ọṅụ dị ukwuu ka ndị na-amụ ihe na-amụta ịkpọku Jehova maka nzọpụta.—Ọrụ 2:21.