Ịkpọsa Eziokwu ahụ Kwa Ụbọchị n’Iṅomi Jisọs
1 Jisọs nwere kpọmkwem ọrụ ọ ga-arụzu mgbe ọ bịara n’ụwa. Ọ dị nnọọ mfe: ‘Ịgbara eziokwu ahụ àmà.’ (Jọn 18:37) Ọ kpọsara eziokwu banyere àgwà na nzube ndị dị ebube nke Nna ya. Ọrụ nke a dị ka nri nye ya; ndụ ya nile dabeere na ya. (Jọn 4:34) Luk kọrọ na Jisọs nọgidere “na-ezi ihe kwa ụbọchị n’ụlọ ukwu Chineke.” (Luk 19:47, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Jisọs jiri oge dịnụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu. (Jọn 9:4) N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, o nwere ike ịgwa Nna ya, sị: “Mụ onwe m nyere Gị otuto n’elu ụwa, ebe M rụzuru ọrụ I nyeworo m ka M rụọ.”—Jọn 17:4.
2 Mgbe obi anyị jupụtara n’ekele maka ihe nile Jehova meworo, anyị na-enwekwa mkpali n’otu aka ahụ ikwu banyere ya kwa ụbọchị. Anyị na-eyi nnọọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị ji obi ike kwuo, sị: “Anyị onwe anyị apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa.” (Ọrụ 4:20) Ha ikwu okwu banyere Jehova bụ ihe na-aga n’ihu, n’ihi na ihe ndekọ ahụ na-ekwu na “kwa ụbọchị . . . ha adịghị ahapụ.” (Ọrụ 5:42, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị sị, ‘Àbụ m onye na-eṅomi Onye Ozizi m, bụ́ Jisọs?’
3 Iji Ịdị Ngwa Na-ekwusa: Jisọs buru amụma na mgbe e kwusaworo ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile, “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Mat. 24:14) Nke a kwesịrị ime ka anyị nwee mmetụta miri emi n’ịdị mkpa na ịdị ngwa nke ọrụ anyị. Ebe ọ bụ na ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ihe ize ndụ, anyị apụghị ịchọta ihe ọ bụla ka mkpa ma ọ bụ ka baa uru ime. Ebe ọ bụ na usoro ihe nke a na-eru ọgwụgwụ ya, oge fọrọ iji rụzuo ọrụ a dị nta!
4 Akụkọ na-egosi na Jehova na-eme ka nchịkọbata nke ndị yiri atụrụ na-aga ngwa ngwa. (Aịsa. 60:22) N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ndị mmadụ na-enubata n’ìgwè n’eziokwu ahụ, na-eji ọṅụ na-asị, dị ka a pụrụ ikwu ya: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu”! (Zek. 8:23) Karịsịa oge ọ bụla ọzọ gara aga, okwu Jisọs bụ eziokwu: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. . . . Na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Mat. 9:37, 38) Nke ahụ ọ́ dịghị akpali anyị ịnụ ọkụ n’obi dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs mere bụ́ ndị “na-anọ n’ụlọ ukwu Chineke mgbe nile, na-agọzi Chineke”? (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Luk 24:53.
5 Mee Ka A Mara Eziokwu ahụ Kwa Ụbọchị: Kwa ụbọchị, anyị kwesịrị ịdị na-achọ ụzọ dị iche iche iji gwa ndị ọzọ eziokwu ahụ. E nwere ohere dị iche iche mgbe nile. Ebe o kwere omume, ị̀ pụrụ ịgbara onye nọ gị nso n’ụgbọ njem ọha àmà? Ma ọ bụ gịnị banyere idere onye ị na-enweghị ike inweta n’ụlọ akwụkwọ ozi? Ì chewo echiche inyefe onye na-ere ihe n’obere ụlọ ahịa ma ọ bụ ndị i zutere n’ọma ahịa otu traktị ma ọ bụ magazin mgbe ị na-aga ịzụrụ ihe? Ma eleghị anya, ị pụrụ icheta ọtụtụ ohere ndị ọzọ i nwere kwa ụbọchị iji soro ndị ọzọ kerịta olileanya gị. Ọ bụrụ na i mee mgbalị ma gosipụta nwa obere obi ike, Jehova ga-enyere gị aka.—1 Tesa. 2:2.
6 Ya mere, ka anyị na-amalite ọrụ dịịrị ụbọchị nke ọ bụla, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị sị, ‘M̀ ga-ebute ụzọ n’isoro onye ọzọ kerịta olileanya m ma ọ bụrụ na ohere adapụta taa?’ Ṅomie omume Jisọs, onye kọwara ihe mere e ji zite ya n’ụwa, sị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 4:43, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ka Onye Ozizi anyị, anyị ga-eme otu ihe ahụ.—Luk 6:40.