Rite Uru Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996—Akụkụ nke 2
1 Oge na-adịghị anya mgbe e guzobesịrị Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na 1943, otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Society kọrọ, sị: “Ndokwa ọma nke a enwewo ike ná mkpirikpi oge inyere ọtụtụ ụmụnna aka, ndị chere na ọ dịghị mgbe ha gaara abụ ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha, ịghọ ndị dị nkọ n’ikpo okwu na ndị dị irè karị n’ubi.” Ụlọ akwụkwọ ahụ nọgidere na-enye ọzụzụ magburu onwe ya, nke dị anyị nile mkpa.
2 Ọgụgụ Bible: Ọ bụghị nanị ndị a na-ekenye ihe omume bụ ndị na-erite uru site n’ụlọ akwụkwọ ahụ. N’eziokwu, anyị nile nwere ihe omume e kenyere anyị—ọgụgụ Bible kwa izu. Usoro ihe omume nke ụlọ akwụkwọ ahụ na-egosi isi Bible ndị a ga-agụ kwa izu. E nwere ọtụtụ ihe ncheta Akwụkwọ Nsọ ndị na-emesi ike mkpa nke ịgụ Bible kwa ụbọchị. (Josh. 1:8; Abụ Ọma 1:2; Ọrụ 17:11) Ọgụgụ Bible dị mkpa maka ezi ahụ ike ime mmụọ; ọ na-edozi uche na obi. Ọ bụrụ na anyị agụọ Bible minit ise ma ọ dịkarịsịa ala kwa ụbọchị, anyị ga-enwe ike ịgbasochi ya anya. Ná ngwụsị afọ, anyị ga-agụworị ihe karịrị 150 isiakwụkwọ nke Okwu Chineke. Ọ bụrụ na anyị edebe Bible anyị n’ebe aka anyị ga-eru ya ngwa ngwa, anyị kwesịrị inwe ike ịgụ ụfọdụ ya kwa ụbọchị.
3 Okwu Izi Ihe: Iji kpalie ụmụnna iji ịnọgidesi ike n’ihe na-eje ozi n’ịnụ ọkụ n’obi, ọ dị onye ọkà okwu na-ekwu okwu izi ihe mkpa iji ụzọ izi ihe ndị dị mma mee ihe, iji nye nghọta, na iji wulite ekele maka Jehova, Okwu ya, na nzukọ ya. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ ịrụzu nke a site n’ịkwado nke ọma, na-ewulite okwu ha n’elu isiokwu ahụ, na-eji nkwenyesi ike n’ihe na-ekwu okwu, ma na-eme ka ihe omume ha doo anya. (Hib. 4:12) Ọ dị mkpa ka onye ọkà okwu ghara ịgabiga oge e kenyere ya. Akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe na isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche jupụtara n’ọtụtụ akụkụ Bible, na-enyekwa ọtụtụ ihe ndị na-akpali akpali sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke pụrụ ịbara anyị uru n’ụzọ ime mmụọ.
4 Isi Ihe Ndị Sitere na Bible: Ụmụnna nwoke ndị e kenyere ihe omume a kwesịrị ịhọrọ kpọmkwem amaokwu ụfọdụ ndị a pụrụ ịkọwa n’ụzọ dị irè maka abamuru nke ọgbakọ. Nke a na-achọ ịgụ isi ndị e kenyere, ịtụgharị uche na ha, na ime nnyocha nke amaokwu ndị a họọrọ iji chọta isi ihe ndị ga-eme ka ihe akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ pụtara doo anya. N’azụ Watch Tower Publications Index, e nwere “Scripture Index” (Ndepụta Ntụaka Akwụkwọ Nsọ), nke pụrụ inye aka n’ịchọta ihe ọmụma banyere kpọmkwem amaokwu dị iche iche nke Bible. Ụmụnna nwoke na-eme ihe omume a kwesịrị iji ezi uche mee ihe ma na-ezere iwebata ihe ndị na-adịghị mkpa. Ha ekwesịghị ịkwado ihe karịrị ihe a pụrụ ikwuzu n’ụzọ dị nnọọ mma na minit isii.
5 Anyị nile pụrụ irite uru site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ pụrụ inyere anyị aka imeziwanye ihe n’ikike ikwu okwu na izi ihe anyị. Iji ndokwa nke a eme ihe n’ụzọ zuru ezu ga-enyere anyị aka n’ezie ime ka ‘ịga n’ihu anyị pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.’—1 Tim. 4:15.