Nzukọ Ije Ozi Maka February
Izu Na-amalite February 5
Abụ 96 (24)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị. Akụkọ Ọchịchị Chineke.
15 min: “Ịkpọsa Eziokwu ahụ Kwa Ụbọchị n’Iṅomi Jisọs.” Ajụjụ na azịza. Gụọ paragraf nke 5.
20 min: “Mkpughe—Mkpịsị Ugodi nke Ezi Obi Ụtọ.” Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha, meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ.
Abụ 14 (6) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 12
Abụ 191 (18)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.” Ọ bụrụ na a matara ya, maa ọkwa ụbọchị mgbakọ na-abịanụ. Gbaa mmadụ nile ume ịga.
15 min: “Kwadebe Maka Ọrụ Magazin n’April.” Mee ka abamuru nke Ụlọ Nche na Teta! pụta ìhè n’ime ka a nụ ozi ọma ahụ. Gụọ isiokwu ahụ nwere paragraf abụọ, kọwapụtakwa ihe ọgbakọ unu ga-eme iji mee ka April bụrụ ọnwa pụrụ iche maka nkesa magazin.
20 min: “Jehova Na-echeta Ndị Ọrịa na Ndị Agadi.” Okwu okenye ga-ekwu n’isiokwu dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke August 1, 1993, peji nke 26-30.
Abụ 133 (68) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 19
Abụ 72 (58)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Rite Uru Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996—Akụkụ nke 2.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Mesie ike mkpa ọ dị ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị.
20 min: “Nyere Ha Aka Ịghọta.” Tụleghachi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha maka ime nletaghachi. Okenye esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ tụlee akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ Mmezu Mkpughe na ụzọ a pụrụ isi mee ka ndị a pụta ìhè. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. Tụọ aro dị iche iche n’ụzọ e si azụlite mmasị ruo n’ókè nke a pụrụ ịmalite ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.
Abụ 53 (27) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 26
Abụ 28 (5)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: Ịkwadebe Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ Ndị Na-akpali Mmasị. Onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ tụlee abamuru ndị dị n’iche ihe na-akpali mmasị ndị nọ n’ókèala unu n’ihu ha site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, akụkọ mba na-ekwu banyere mgbalị ndị a na-eme ugbu a imeziwanye ọnọdụ ibi ndụ; ọnọdụ na-arị elu nke nsogbu alụmdi na nwunye, ụmụaka na-enupụ isi, ma ọ bụ nsogbu ndị e nwere n’ịchọta ọrụ; ma ọ bụ akụkọ ndị na-egosi ihe mere ndị mmadụ ji na-enwewanye obi abụọ banyere ngwọta ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ụkọchukwu na-enye. Kwuo ụfọdụ akụkọ ndị a kpụ n’ọnụ n’ógbè unu, ma tụlee otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ịmalite mkparịta ụka.
20 min: Inyefe Akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na March. Gosipụta akụkụ ndị na-akpali mmasị n’akwụkwọ ahụ bụ́ ndị a pụrụ iji mee ihe ịmalite mkparịta ụka. (1) Dọrọ mmasị gaa n’ihe osise ndị mara mma, dị ka ndị e gosiri na peji nke 4-5, 86, 124-125, 188-189. (2) Gosi otú isi nke ọ bụla si jiri ihe ndepụta nke ajụjụ ntụleghachi mechie, kọwaakwa otú a pụrụ isi jiri ndị a mee ihe dị ka ihe ndabere maka iche ihe n’ihu mmadụ. A pụrụ ịjụ onye nwe ụlọ ma ọ̀ ga-achọ ịmata azịza ha. Họrọ ajụjụ ụfọdụ site ná ndị ahụ e depụtara na peji nke 11, 22, 61, 149. (3) Zoo aka n’igbe dị na peji nke 102, tụọkwa aro dị iche iche na-egosi otú a pụrụ isi jiri “Akụkụ Ụfọdụ nke Mgbe Ikpeazụ Ahụ” mee ihe iji kpalie mmasị. (4) Kwusie okwu ike n’otú e siri mee akwụkwọ ahụ karịsịa maka iduzi ọmụmụ ihe ndị na-aga nke ọma. Isiakwụkwọ ha dịcha nkenke, ihe e dere dị mfe nghọta, e zoro aka n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ike, ajụjụ ndị na-akpali iche echiche na-elekwasị anya n’isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ. Gbaa mmadụ nile ume inyefe akwụkwọ ahụ na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe.
Abụ 151 (25) na ekpere mmechi.