Kwadebe Maka Ọrụ Magazin n’April
Dị ka a rịbara ama na Calendar 1996 anyị, a ga-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’afọ a n’April 2. N’ịbụ ndị ememe nke a dị ebube gbara ume, ka mmadụ nile kere òkè n’ikesa magazin n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’April dum. Lee magazin ndị bịara n’oge ha anyị ga na-eji eme ihe! Ụlọ Nche nke April 1 ga-elekwasị anya n’okwu ihu ọha nke mgbakọ distrikti afọ gara aga, “Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!” Ụlọ Nche nke April 15 ga-agbaso isiokwu nke okwu ihu ọha pụrụ iche nke April gara aga, “Ọgwụgwụ nke Okpukpe Ụgha Dị Nso.” Okwu ihu ọha pụrụ iche nke afọ a n’April 21, “Ịnọgide n’Enweghị Ntụpọ n’Etiti Ọgbọ Gbagọrọ Agbagọ,” kwesịrị inye mkpali ka ukwuu. Anyị ga na-enyefe Teta! nke May 8 n’isiokwu bụ “Mgbe Agha Na-agaghị Adịkwa.”
Dị ka ihe iji sochie mkpọsa nke Akụkọ Alaeze nke October gara aga, April nke a kwesịrị ịbụ ọnwa pụrụ iche maka nkesa magazin. Ugbu a bụ oge ime atụmatụ. Ọtụtụ ga-achọ idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Dị ka mkpa si dị, e kwesịrị ịtụkwu ọda maka magazin April ndị a. A pụrụ ime atụmatụ maka Ụbọchị Magazin, nke onye ọ bụla ga-ekere òkè na ya dị ka o kwere mee—n’ụtụtụ, ehihie, na/ma ọ bụ n’uhuruchi. Ka anyị nile ‘ghọọ ndị na-eme okwu ahụ.’ Dị ka e buru n’amụma banyere Mesaịa ahụ n’Abụ Ọma 69:9, ka anyị nweekwa ike ikwu, sị: “Ekworo ụlọ Gị eripịawo m.”—Jes. 1:22; Jọn 2:17.