Usoro Ihe Omume Ọhụrụ nke Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
1 N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-ekwusa ozi ọma ahụ n’alaghị azụ? Gịnị bụgasị iru eru maka ịbụ onye nkwusa nke ozi ọma ahụ? Olee otú ọbụna ndị na-asọ ihere pụrụ isi bute ụzọ n’isoro ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma ahụ? A ga-aza ndị a na ajụjụ ndị ọzọ na-akpali iche echiche n’usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche malite na March, n’isiokwu bụ́ “Ndị Ruru Eru Dị Ka Ndị Ozi nke Ozi Ọma Ahụ.”—Tụlee 2 Ndị Kọrint 3:5.
2 Dị ka ndị Jehova, anyị aghaghị ilezi anya banyere akparamàgwà anyị. Ndị na-eto eto ga-akọ ahụmahụ ndị na-agba ume bụ́ ndị ga-akọ otú ha siworo nagide nrụgide ndị ọgbọ. A ga-enye ndị mụrụ ụmụ agbamume ịhụnanya banyere mkpa ọ dị ịzụ ụmụ ha dị ka ndị ozi Chineke. A ga-enyere anyị nile aka ịghọta mkpa ọ dị ime nkwusa na ngọzi ndị ga-abịara ma anyị ma ndị na-anụ olu anyị.—1 Tim. 4:16.
3 N’ezie baptism ga-abụ ihe dị oké mkpa nke ụbọchị ahụ. Tupu ihe omume a, a ga-ebu kpọmkwem ndị raara onwe ha nye ọhụrụ n’obi kwuo otu okwu dabeere na Bible. Otú ọ dị, ndị nile bịara kwesịrị ịṅa ntị nke ọma ka a na-atụle isiokwu baptism ahụ, na-emekwa ka ihe ọ pụtara doo anya. Onye ọ bụla chọrọ ka e mee ya baptism n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ahụ kwesịrị ime ka onye isi oche ndị nlekọta mara tupu oge eruo ka o wee nwee oge zuru ezu iji mee ndokwa maka ndị okenye isoro ndị a gaje ime baptism tụleghachi ajụjụ ndị ahụ a họpụtara.
4 Ihe ọzọ dị oké mkpa ga-abụ okwu bụ isi nke ọkà okwu si esi bịa ga-ekwu. Isiokwu ya bụ “Ndị Ruru Eru na Ndị A Kwadebere Dị Ka Ndị Ozi Chineke.” A ga-atụle ndokwa anọ bụ isi ndị na-akwadebe anyị dị ka ndị ozi, okwu ahụ ga-agụnyekwa ahụmahụ ndị na-ewuli okwukwe.
5 Mee ndokwa ugbu a iji nọrọ ya maka usoro ihe omume ahụ dum. Jiri n’aka ịkpọ ndị nwere mmasị na ndị a na-amụrụ Bible òkù ka ha wee nweekwa ike irite uru site n’ụbọchị a nke nkụzi ọchịchị Chineke. N’ụzọ dị otú a anyị pụrụ ijide n’aka na anyị “ruru eru nke ọma” (NW) dị ka ndị ozi nke ozi ọma ahụ.