Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/97 p. 1
  • ‘Wulite Ụlọ Gị’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Wulite Ụlọ Gị’
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isoro Ndị Ọzọ Kerịta Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Inyere Ezinụlọ Dị Iche Iche Aka Inweta Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 3/97 p. 1

‘Wulite Ụlọ Gị’

1 N’ụzọ doro anya, n’ọdịbendị nile gburugburu ụwa, ndụ ezinụlọ na-adakpọ. Ụwa Setan na-atụrụgharị n’aghụghọ na omume rụrụ arụ. (1 Jọn 5:19) Nke a na-emesi ike ngwa ọ dị anyị ‘iwuli ụlọ anyị’ na izi ndị ọzọ otú ha pụrụ isi mee otu ihe ahụ maka nke ha.—Ilu 24:3, 27.

2 Ụkpụrụ Bible Bụ Ihe Nchebe: A na-achọta isi ihe na-akpata ezi obi ụtọ ezinụlọ n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Eziokwu ndị a dị ike na-abara onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ uru n’akụkụ nile nke ndụ. Ezinụlọ nke na-etinye ha n’ọrụ ga-enwe obi ụtọ ma nwee udo Chineke.—Tụlee Aịsaịa 32:17, 18.

3 E depụtara ụkpụrụ ndị pụrụ inyere anyị aka iwulite ezinụlọ anyị n’ụzọ a chịkọtara ọnụ n’ime akwụkwọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Isiakwụkwọ nke ọ bụla ji igbe izi ihe na-enye aka nke na-emesi ike ụkpụrụ ndị dị ndị òtù ezinụlọ mkpa icheta wee mechie. Ihe ka ukwuu n’igbe ndị a malitere site n’ajụjụ bụ́, “Olee otú ụkpụrụ Bible ndị a pụrụ isi nyere . . . ?” Nke a na-adọrọ uche gaa n’echiche Chineke ka anyị wee nwee ike inweta echiche ya n’isiokwu a na-atụle.—Aịsa. 48:17.

4 Mụọ akwụkwọ ahụ nke ọma. Mụta ịchọta ụkpụrụ ndị pụrụ inye aka mgbe nsogbu dị iche iche bilitere. Akwụkwọ ahụ na-atụle okwu ndị dị ka ndị a: ihe mmadụ kwesịrị ile anya ya mgbe ọ na-atụle onye ọ na-atụ anya ịlụ (isi nke 2), isi ihe ndị na-eme ka e nwee obi ụtọ na-adịgide adịgide n’alụmdi na nwunye (isi nke 3), otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi zụlite ụmụ ha ndị nọ n’afọ iri na ụma ịghọ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị toworo eto na-atụ egwu Chineke (isi nke 6), ụzọ isi chebe ezinụlọ pụọ ná mmetụta ndị na-ebibi ihe (isi nke 8), ụkpụrụ iji nyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna aka inwe ihe ịga nke ọma (isi nke 9), enyemaka ime mmụọ maka ezinụlọ ndị aṅụrụma na ime ihe ike na-enye nsogbu (isi nke 12), ihe a ga-eme mgbe ihe nkekọ alụmdi na nwunye na-achọ itisa (isi nke 13), ihe a pụrụ ime iji sọpụrụ ndị nne na nna meworo agadi (isi nke 15), na ụzọ mmadụ ga-esi nwetara ezinụlọ ya ọdịnihu na-adịgide adịgide (isi nke 16).

5 Jiri Akwụkwọ Ọhụrụ ahụ Mee Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu: Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, gịnị ma unu mụkọọ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ ahụ ọnụ dị ka ezinụlọ? Ọzọkwa, mgbe ọ bụla nsogbu ma ọ bụ ihe ịma aka ndị ọhụrụ na-echere ezinụlọ gị aka mgba, tụleghachi isiakwụkwọ dị n’akwụkwọ ahụ ndị na-ekwu banyere ndị a ma jiri ekpere tụlee otú a pụrụ isi tinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ. Tụkwasị na nke a, na March, mee ndokwa oge buru ibu maka ozi ubi ka i wee nwee ike gbalịa tinye Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ n’aka ọtụtụ mmadụ ruo n’ókè o kwere mee.

6 A ga-ewusi ezinụlọ ndị na-egosi nsọpụrụ Chineke ike ma mee ka ha dị n’otu n’ụzọ ime mmụọ, a ga-akwadebekwa ha nke ọma ịnagide mwakpo nile nke Setan. (1 Tim. 4:7, 8; 1 Pita 5:8, 9) Lee ka anyị si nwee ekele na anyị nwere ntụziaka Chineke site n’aka Onye Malitere ezinụlọ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya