Kụziere Ndị Ọzọ Ihe Chineke Na-achọ
1 A ka pụrụ ịchọta ọtụtụ ndị e gbochiworo “ịnụ okwu nile nke Jehova” n’ụzọ ime mmụọ. (Emọs 8:11) Ọ bụ ezie na ụfọdụ kwere na Chineke dị, ha amaghị nzube ya na ihe ndị ọ na-achọ. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị kụziere ha eziokwu Alaeze na-azọpụta ndụ. Site n’ịbụ ndị jikeere ma kwadebe nke ọma ịgba àmà n’ohere ọ bụla, anyị pụrụ irute ndị ahụ chọrọ ịmụta ihe Jehova na-achọ.
2 N’April na May, anyị ga-enwe nnọọ mbipụta Ụlọ Nche na Teta! ndị bịara n’oge ha ikesa. Ọzọkwa, na nke mbụ ya, anyị ga-enyefe broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ihe osise ya na-adọrọ adọrọ na ajụjụ ndị na-akpali iche echiche na-eme ka ọtụtụ nwee mmasị na broshuọ a. A tụrụ aro ndị na-esonụ inyere anyị aka iji mbipụta anyị ndị magburu onwe ha mee ihe bara ezi uru.
3 Ịchọta Ndị Mmadụ: N’ógbè ndị mmadụ na-adịghị anọ n’ụlọ mgbe anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ bụ ihe na-aba uru ịchọta ma gwa ndị mmadụ okwu ebe ọ bụla a na-ahụ ha—n’okporo ámá, n’ụgbọ njem ọha, na n’ọdụ ụgbọala na ebe achụmnta ego. Ọ dị anyị mkpa iwepụta ohere iji mee nkwusa mberede. Dị ka ihe atụ banyere nke a, otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ gara n’ogige a na-edebe anụ ọhịa, jirikwa Teta! August 8, 1996, nke nwere usoro isiokwu bụ́ “Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Gịnị Mere A Ga-eji Nwee Nchegbu?” N’ime otu hour, o tinyere mkpụrụ 40 n’aka ụfọdụ ndị hụrụ ụmụ anụ n’anya nwere ekele! Ihe ịga nke ọma dị aṅaa ka i nweworo rute ugbu a n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ebe nile? Ụlọ Nche na Teta! tinyekwara broshuọ Na-achọ kwesịrị ekwesị karịsịa maka ụdị nile nke ịgba àmà, n’ihi na ha nwere ihe ọmụma nke na-emetụta ndụ ndị mmadụ ma na-akpali ikike iche echiche.
4 Ịmalite Mkparịta Ụka: Azụ peji Ozi Alaeze Anyị nke October 1996 kọwara n’ụzọ sara mbara ụzọ isi kwadebe iche ihe n’ihu nke gị maka magazin Ụlọ Nche na Teta! Aro ndị ahụkwa ga-arụ ọrụ nke ọma mgbe ị na-akwadebe iche ihe n’ihu nke gị maka broshuọ Na-achọ. Ihe anyị na-ekwu pụrụ ịdị nkenke dị ka ahịrịokwu ole na ole ma ọ bụ too nnọọ ogologo ịgụnye echiche Akwụkwọ Nsọ. Ọ dị mkpa iji nlezianya họrọ okwu mmeghe, ebe ọ bụ na ha pụrụ ikpebi ma onye ahụ i jekwuuru ọ̀ ga-anọgide na-ege ntị. Ụfọdụ enwewo ihe ịga nke ọma site n’iji okwu mmeghe nke a eme ihe: “Agụrụ m otu isiokwu nke gbara m ume, achọkwara m iso gị kerịta ya.” Ma ọ bụ a pụrụ iwelite otu ajụjụ na-akpali mmasị iji dọta onye nke ọzọ ịbanye ná mkparịta ụka.
5 Ọ bụrụ na o kwesị ekwesị n’ógbè unu, ị pụrụ ịgbalị ịjụ ajụjụ ndị dị ka ndị na-esonụ n’iche ihe n’ihu gị n’ọnwa a:
◼ “Taa anyị na-ahụ ọtụtụ unyi na mmetọ. Gịnị ka ọ ga-ewe iji hichaa ụwa ma mee ya ebe ka mma obibi?” Nye ohere maka nzaghachi, mgbe ahụkwa kọwaa na i nwere ihe ọmụma nke na-emesi anyị obi ike banyere ụzọ na mgbe ụwa ga-aghọ ubi zuru ụwa ọnụ. Soro ya kwurịta otu okwu kpọmkwem, akụkụ akwụkwo nsọ dị nkenke, na ihe osise mara mma sitere na magazin ọhụrụ, mgbe ahụ nyefee onye ahụ ụtụ magazin n’ụtụ ego a na-enye ya. Tupu i mechie mkparịta ụka ahụ, gbalịa idokwa ịga n’ihu n’oge ọzọ.
◼ “Ì chere na Chineke zubere ka anyị dịrị ndụ ma bụrụ ndị nsogbu ndị dị ka ndị na-eche anyị ihu taa gbara gburugburu?” Mgbe onye ahụ zasịrị, ị pụrụ ikwu, sị: “Eleghị anya ị maara ekpere ahụ Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe, na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa. Ì chewo nnọọ echiche banyere ihe Alaeze Chineke bụ n’ezie?” Sapeta n’ihe ọmụmụ nke 6 na broshuọ Na-achọ, gụpụtakwa ajụjụ ndị a jụrụ ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ. Mgbe ahụ, ka ị na-agụpụta paragraf nke 1, kọwapụta azịza nye ajụjụ nke mbụ. Kọwaa na a zara ajụjụ ndị fọdụrụnụ n’ụzọ dị nkenke otú ahụ. Nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ ₦25, kwuokwa na unu ga-ezute ọzọ ikerịtakwu ihe ọmụma banyere Alaeze ahụ.
◼ “Ọtụtụ ndị na-eche echiche amalitewo ile okpukpe nke ụwa anya dị ka ihe kpatara nsogbu nke mmadụ kama ịbụ ngwọta. Gịnị ka i chere banyere nke ahụ?” Mgbe ị ṅasịrị ntị n’echiche onye ahụ, gosi otu ihe site n’otu n’ime magazin ndị ọhụrụ nke pụrụ ịdọrọ mmasị ya banyere enweghị ike ime ihe nke okpukpe ụgha ma ọ bụ ọdịda ya na-abịanụ, nyefeekwa ụtụ. Gwa ya aha gị, mara nke ya, kwuokwa na ị ga-akpọtụrụ ya ọzọ ka i wee kọwaa otú o si bụrụ na ezi okpukpe emechubeghị ihe a kpọrọ mmadụ ihu.
◼ “N’inwe ọtụtụ nsogbu ná ndụ ezinụlọ taa, ọ̀ dịwo mgbe i chere banyere isi ihe dị n’inweta obi ụtọ ezinụlọ?” Chere maka nzaghachi, ma kọwaa na n’ime Bible, Chineke kpughere ihe bụ isi ihe nke na-eweta obi ụtọ ezinụlọ n’ezie. Ikekwe ị pụrụ ịgụ Aịsaịa 48:17. Mgbe ahụ sapeta n’ihe ọmụmụ nke 8 na broshuọ Na-achọ, ma rụtụ aka n’ụfọdụ amaokwu Bible e zoro aka na ha nke na-enye nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi maka onye òtù ọ bụla n’ime ezinụlọ. Gụpụta ndepụta nke ajụjụ ndị dị ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ. Jụọ ma onye ahụ ọ̀ ga-achọ ịgụpụta azịza ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, nyefee ya broshuọ ahụ n’ụtụ a na-enye ya. Mee ndokwa ịlaghachi n’oge ọzọ ikerịtakwu nduzi dị irè nke dị n’ime Bible maka ndụ ezinụlọ obi ụtọ.
6 Ihe ntinye dị n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1997 gbara anyị ume inweta obi ike iji mee nletaghachi. Ọ tụrụ aro iji broshuọ Na-achọ malite ọmụmụ Bible, ọ bụrụ na ọ bụghị n’ọbịbịa mbụ, mgbe ahụ ná nletaghachi. Ihe kasị dịrị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa bụ ịmụta ihe Chineke na-achọ na imezi ya eme. (Kọl. 1:9, 10) Anyị ga-abara ndị ọzọ uru n’ụzọ dị ukwuu n’April na May ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịmalite ịkụziri ha ihe anyị maara banyere ihe Jehova na-achọ maka ndụ.—1 Kọr. 9:23.