Iduzi Ọmụmụ Bible Ebe Obibi Ndị Na-aga n’Ihu
1 Olee ihe nọọsụ nọ na Tanzania, onye na-eto eto nọ n’Argentina, na nne nọ na Latvia nwekọrọ? Akwụkwọ 1997 Yearbook (peji nke 8, 46, na 56) na-akọ na ha atọ nwechara ọganihu dị ngwa n’ọmụmụ Bible ebe obibi ha n’ihi ịdị njikere ha inwe ihe karịrị otu nnọkọ kwa izu n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. A tụwo aro na mgbe ọ bụla o kwere mee, ndị nkwusa kwesịrị ịgbalị ịtụle otu isiokwu nke akwụkwọ ahụ ná nnọkọ ọmụmụ ihe ọ bụla. Otú ọ dị, ụfọdụ na-achọpụta na ọ bụ ihe ịma aka ime otú ahụ. Ọ bụ ezie na ihe dị ukwuu ga-adabere n’ọnọdụ na ikike nghọta ihe nke onye ọ bụla a na-amụrụ ihe, ndị nkụzi nwere ahụmahụ achọtawo ihe ịga nke ọma site n’itinye aro ndị na-esonụ n’ọrụ.
2 Dị ka a tụlere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, ọ dị mkpa ịzụ ndị ị na-amụrụ ihe ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. Malite ná mbido, ọ ga-adị mma ịkọwa na igosi otú e si eme nke a. Gosi ha akwụkwọ Ihe Ọmụma i ji amụ ihe. Kwadokọọnụ ihe ọmụmụ nke mbụ ọnụ. Nyere ndị ahụ a na-amụrụ ihe aka ịchọta okwu ma ọ bụ nkebi ahịrị okwu ndị bụ isi ndị zara ajụjụ ahụ e biri ebi kpọmkwem, mgbe ahụ kanye ha akara. Ndị nkwusa ụfọdụ ọbụna enyewo ndị ha na-amụrụ ihe pen ma ọ bụ pensịl iji mee ihe. Gbaa ha ume ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ nile ka ha na-akwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. Site n’ime nke a, ị ga na-azụkwa ha ịkwadebe maka ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.—Luk 6:40.
3 Ezigbo onye nkụzi ga-eme ka onye ahụ a na-amụrụ ihe kwuo okwu, ọ bụghịkwa ikwubiga okwu ókè nanị ya. Ọ na-ezere ịbụ onye isi ihe ndị na-erijughị afọ dọpụrụ uche ya. Ọ dịghị ewebatakebe ihe ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ọ na-emesi isi ihe ndị dị n’ihe ọmụmụ ahụ ike. Ụfọdụ enyewo ndị a na-amụrụ ihe akwụkwọ ndị ọzọ iji nyere ha aka ịchọta azịza nye ajụjụ dị iche iche. Ọzọkwa, ndị nwere mmasị ga-enwetakwu ihe ọmụma sara mbara site n’ịga nzukọ ọgbakọ.
4 O nwere ike ọ gaghị adị mkpa ịgụcha akụkụ akwụkwọ nsọ nile e zoro aka na ha n’ihe ọmụmụ ahụ. A pụrụ ịkọwa isi ihe ụfọdụ site n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara na paragraf ahụ. N’oge ntụleghachi, mee ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị bụ isi ndị a tụlere pụta ìhè, gbaakwa onye ahụ a na-amụrụ ihe ume icheta ndị a.
5 Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Nnọkọ Ọ Bụla Ga-adịru?: Ọ dịghị mkpa na a ga-akpara ọmụmụ ihe ahụ ókè ịbụ otu hour. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-enwe oge ma chọọ ịmụtekwu ihe aka. Ma ọ bụ onye ahụ a na-amụrụ ihe pụrụ ịchọ ịmụ ihe ihe karịrị otu ugboro n’izu. Nke a ga-abara ndị pụrụ ime otú ahụ uru.
6 Dị ka Aịsaịa 60:8 na-egosi, taa, ọtụtụ narị puku ndị ọhụrụ na-eto Jehova “na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si eferuo window ha” abata n’ọgbakọ dị iche iche nke ndị ya. Ka anyị nile mee òkè anyị n’iso Jehova na-arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya ka ọ na-eme ka nchịkọbata nke ndị yiri atụrụ gaa ọsọ ọsọ.—Aịsa. 60:22.