Ịgbara “Mmadụ Nile” Àmà
1 Mgbe anyị zutere ndị sitere n’ọdịbendị ma ọ bụ n’okpukpe dị iche iche, anyị na-echeta na uche Jehova bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Tinyere ọtụtụ traktị na broshuọ pụrụ iche a kwadebere, anyị nwere mbipụta abụọ magburu onwe ha a pụrụ iji mee ihe n’oge ọ bụla iji nyere ndị okpukpe ha na-akụzighịrị ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke na Kraịst aka.
2 Akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi pụrụ inyere ndị mmadụ nọ ebe nile aka iji ihe ha kwere na ha tụnyere ihe Bible na-akụzi banyere nanị ezi Chineke ahụ. N’aka nke ọzọ, site n’ime ka ndụ Jisọs Kraịst pụta ìhè, Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ pụrụ inyere mmadụ aka ịmatakwu Ọkpara Chineke ma bụrụ onye a dọtara n’ebe ọ nọ, dị ka a dọtara ọtụtụ ndị na narị afọ mbụ. (Jọn 12:32) Mgbe ọ bụla o kwesịrị ekwesị, ị pụrụ ịchọ ịnwale aro ndị na-esonụ maka inyefe akwụkwọ ndị a.
3 Ọ bụrụ na i chere na ọ ga-adị mma inyefe mmadụ akwụkwọ “Nwoke Kasị Ukwuu,” ị pụrụ ịjụ, sị:
◼ “Gịnị na-agbata gị n’uche mgbe i chere echiche banyere Jisọs Kraịst? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara na Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. [Hota otu ihe atụ site n’okwu mmeghe nke akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu.] Bible na-egosi na ndụ Jisọs bụ ihe nlereanya anyị ga-eṅomi.” Gụọ 1 Pita 2:21 na paragraf mbụ dị na peji ikpeazụ nke okwu mmeghe dị n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị ịmụta banyere Jisọs, nyefee akwụkwọ ahụ. Tupu ị lawa, gụọ Jọn 17:3 ma jụọ, sị: “Olee otú anyị pụrụ isi nweta ihe ọmụma a na-eduga ná ndụ ebighị ebi?” Mee ndokwa doro anya iji azịza ya gaghachi.
4 Mgbe ị gaghachiri ịkọwa otú e si enweta ihe ọmụma ahụ na-enye ndụ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ekwere m nkwa ịlaghachi igosi gị otú anyị pụrụ isi nweta ihe ọmụma ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.” Gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma, sitekwa n’iji isiakwụkwọ nke mbụ eme ihe, gosi otú e si amụ ya.
5 Ọ bụrụ na ị chọrọ inyefe akwụkwọ “Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi,” ị pụrụ ịjụ, sị:
◼ “Ebe e nwere ọtụtụ okpukpe dị iche iche taa, ọ̀ dịtụwo mgbe i chere otú anyị pụrụ isi mata nke Chineke kwadoro?” Mgbe ọ zasịrị, sapeta akwụkwọ Ihe Ọmụma na peji nke 46. Gụọ paragraf nke 6 na 7, jụọkwa ma onye nwe ụlọ ò kwetara na ọ bụghị okpukpe nile taa “na-eme ihe Nna [Jisọs] . . . na-achọ.” Kwuo na ezi okpukpe taa na-emezu ihe ahụ a chọrọ nke e kwuru n’elu. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-eji enyefe ya. Mgbe ị na-ala, ị pụrụ ịjụ, sị, “Olee otú ezi okpukpe kwesịrị isi emetụta àgwà mmadụ?” Mee ndokwa maka nletaghachi iji zaa ajụjụ ahụ.
6 Mgbe ị gaghachiri ịkọwa otú ezi okpukpe si emetụta ndụ mmadụ, ị pụrụ ịjụ, sị:
◼ “Olee otú i chere okpukpe kwesịrị isi emetụta àgwà ndị mmadụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Kraịst nyere anyị ụkpụrụ a pụrụ iji tụọ okpukpe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” Gụọ Matiu 7:17-20. Mgbe ahụ gwa onye nwe ụlọ ka ọ gụpụta paragraf nke 18 dị na peji nke 50-51. Ọ bụrụ na oge dị, tụlee paragraf nke 20 dị na peji nke 51. Kwuo na ị ga-alaghachi iji gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ.
7 Ihe Ndị E Ji Amalite Mkparịta Ụka: E nwere ọtụtụ ihe ndị na-enye aka iji zie ihe dị n’ime akwụkwọ Ihe Ọmụma, bụ́ ndị a pụrụ iji malite mkparịta ụka ná nleta mbụ ma ọ bụ ná nletaghachi. Ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka nanị site n’ịjụ ajụjụ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, rịba ajụjụ na isiokwu ndị a ama na peji ebe ndị a tụlere ha:
“Ihe Dị n’Ime Bible” (13)
“Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?” (15)
“Ezi Chineke ahụ Nwere Aha” (24)
“Lezie Anya Maka Ụzọ Aghụghọ Setan!” (59)
“Akụkụ Dị Iche Iche nke Mgbe Ikpeazụ Ahụ” (99)
“Ihe Ndị A Chọrọ Maka Ịbịaru Chineke Nso” (152)
“Nzọụkwụ Ndị Na-eduba ná Ndụ Agwụghị Agwụ” (173)
8 Ị pụrụ ịsapeta peji (ndị) a họtara n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma kọwaa isi ihe a na-atụle. Mgbe ahụ mee ndokwa maka nletaghachi site n’ịjụ ajụjụ metụtara ihe a na-ekwu bụ́ nke a pụrụ ịza site na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Jide n’aka ịkpọ onye nwe ụlọ òkù ịbịa Nzukọ Ihu Ọha, hapụkwa otu mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù.
9 Ụdị mmadụ nile obi ha ziri ezi na-achọ eziokwu banyere Chineke na Kraịst. Anyị pụrụ inyere ha aka n’ọrụ ịgba àmà anyị. Ya mere, ka anyị nọgide “na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike, n’ihi na anyị elewo anya Chineke dị ndụ, Onye bụ́ Onye nzọpụta mmadụ nile.”—1 Tim. 4:10.