Ụzọ Ndị Òtù Ezinụlọ Si Emekọ Ihe Ọnụ Iji Kere Òkè Zuru Ezu—Ná Nzukọ Ọgbakọ
1 Ezinụlọ ndị Kraịst aghaghị ịṅa ntị n’iwu ahụ bụ ka e zukọta ọnụ ná nzukọ ọgbakọ. (Hib. 10:24, 25) Site n’imekọ ihe ọnụ nke ọma, mmadụ nile ga-enwe ike ịkwadebe, ịga, na ikere òkè ná nzukọ. Ọnọdụ ezinụlọ na-adị iche iche, ma ọ dị ihe di bụ́ onye Kraịst, nwunye kwere ekwe, ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ pụrụ ime iji kwalite ịdị n’otu ezinụlọ n’ihe ime mmụọ n’agbanyeghị ụmụ ole e nwere n’ụlọ na afọ ndụ ha.—Ilu 1:8.
2 Wepụta Oge Iji Kwadebe: Ndị òtù ezinụlọ na-emekọ ihe ọnụ iji hụ na onye ọ bụla kwadebere nzukọ ọgbakọ nke ọma. Ọtụtụ na-amụkọ isiokwu a ga-amụ n’izu n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ọnụ. Ụfọdụ na-akwadebe maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ma ọ bụ na-agụ ọgụgụ Bible dịịrị izu dị ka ezinụlọ. Ebumnobi ya bụ ime ka ihe ndị bụ́ isi bamie n’uche tupu a gawa nzukọ. N’ụzọ dị otú ahụ, mmadụ nile ga-erite uru karị site n’ihe a nụrụ, ha ga-abụkwa ndị a kwadebere ikere òkè mgbe e nwere ohere.—1 Tim. 4:15.
3 Mee Atụmatụ Ikere Òkè: Onye ọ bụla nọ n’ime ezinụlọ kwesịrị inwe ihe mgbaru ọsọ nke ikwupụta olileanya ya n’ihu ndị ọzọ site n’ịza ajụjụ ná nzukọ. (Hib. 10:23) Enyemaka ma ọ bụ agbamume ọ̀ dị otu onye òtù ezinụlọ mkpa? Enyemaka dị aṅaa dị onye ọ bụla mkpa n’ịkwadebe ihe omume maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ọ na-amasị ndị bụ nwunye mgbe di ha gosiri mmasị na ikekwe tụọ aro maka ihe atụ kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ọnọdụ okwu kwesịrị ekwesị. Ndị nne na nna ekwesịghị iche na ha kwesịrị ịkwadebere ụmụ ha ihe omume ha. Ime otú ahụ ga-egbochi ụmụaka ahụ iji echiche ha na-eme ihe. Ma ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka ma gee ntị ka ha na-amụgharị ya n’olu dara ụda.—Efe. 6:4.
4 Mee Ndokwa Ịga: A pụrụ ịkụziri ụmụaka site na nwata iyiri uwe na ijikere maka ịgawa nzukọ n’oge a kara aka. Ndị òtù ezinụlọ kwesịrị imekọ ihe ọnụ n’ịrụ ọrụ ụlọ ka e wee ghara igbu oge.—Lee aro ndị dị n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, peji nke 112.
5 Ndị nne na nna nakwa ụmụaka pụrụ ịtụgharị uche n’okwu Joshua oge ochie, bụ́ onye sịrị: “Ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.” Mgbe ahụ kpebisienụ ike imekọ ihe ọnụ iji kere òkè zuru ezu ná nzukọ ọgbakọ.—Josh. 24:15.