Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/01 p. 8
  • Ọ Kasị Mma Ime Ka Ọ Dị Mfe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Kasị Mma Ime Ka Ọ Dị Mfe
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụrụ na Ọ Na-arụpụta Ihe, Jiri Ya Mee Ihe!
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ụzọ A Ga-esi Na-eji Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Na-ezi Ozi Ọma Eme Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ime Nkwadebe
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Otú E Si Akwadebe Ihe A Ga-ekwu Mgbe A Chọrọ Inyefe Magazin
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 4/01 p. 8

Ọ Kasị Mma Ime Ka Ọ Dị Mfe

1 N’ihi gịnị ka ndị ndị nkwusa na-eto eto na-ekwusara ozi Alaeze ahụ na-eji etinyekarị uche ha n’ihe ha na-ekwu? Otu ihe kpatara ya bụ na ha na-ekwu ihe ndị dị mfe. Ụfọdụ ndị nkwusa pụrụ iche na ịgba àmà n’ụzọ dị irè chọrọ iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ n’ụzọ dị were were. Otú ọ dị, ahụmahụ na-egosi na ụzọ iche ihe n’ihu nke dị mfe ma doo anya kasị mma.

2 Jisọs kwusara Alaeze Chineke n’ụzọ dị mfe, ma doo anya, ọ zụkwara ndị na-eso ụzọ ya ime otu ihe ahụ. (Mat. 4:17; 10:5-7; Luk 10:1, 9) O ji okwu mmeghe, ajụjụ, na ihe atụ ndị dị mfe dọta mmasị nke ndị na-ege ya ntị ma ruo ha n’obi. (Jọn 4:7-14) Anyị ga-eme nke ọma iṅomi ihe nlereanya ya ma chee ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ n’ụzọ a pụrụ ịghọta ya ngwa ngwa.

3 ‘Ozi ọma nke alaeze’ bụ ozi anyị na-ezisa. (Mat. 24:14) Iji Alaeze ahụ eme isiokwu bụ́ isi i ji eme ihe ga-enye aka mee ka ụzọ i si eche ozi ọma n’ihu mmadụ dị mfe. Kwuo banyere ihe ndị na-emetụta ndị na-ege gị ntị. Ndị inyom na-enwekarị mmasị n’ezinụlọ ha karịa n’isiokwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe kasị echegbu onye bụ́ nna bụ ọrụ ya na nchebe nke ezinụlọ ya. Ndị na-eto eto nwere mmasị n’ọdịnihu ha; ebe ndị agadi nwere mmasị n’ahụ ike na nchebe ha. Ndị mmadụ na-enwekarị nchegbu banyere ihe ndị na-eme n’ógbè ha karịa n’ihe ndị na-eme n’ala ndị dị anya. Mgbe unu kparịtasịrị banyere ihe ndị na-amasị mmadụ nile, dọrọ uche gaa ná ngọzi dị iche iche ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta n’ọchịchị Alaeze Chineke. Okwu ole na ole dị mfe a họọrọ nke ọma bụ́ ndị e jikọtara ha na otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịbụ ụzọ kasị mma isi kpalie mmasị nke onye na-ege gị ntị.

4 Ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka site n’ịsị:

◼ “Obi abụọ adịghị ya na i kwetara na ọtụtụ ọrịa na-enweghị ngwọta na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. Ma ị̀ maara na Chineke ekwewo nkwa na ya ga-ewepụ ụdị ọrịa nile na ọnwụ n’isi nso?” Nye ohere maka nzaghachi, mgbe ahụ gụọ Mkpughe 21:3, 4.

5 Jiri ụzọ iche ihe n’ihu doro anya ma dị mfe ruo n’uche na n’obi nke ọtụtụ ndị nọ n’ókèala unu, na-enyere ha aka ịmụta banyere Jehova na olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya