Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Feb. 15
“Ì chetụwo echiche banyere ụzọ kasị mma isi bie ndụ ma mee mkpebi ndị bụ́ isi? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ụfọdụ n’ime nduzi ndị kasị mma, dị ka Ụkpụrụ Ọma ahụ, dị n’ime Bible. [Gụọ Matiu 7:12.] Olee ụkpụrụ ndị ọzọ nke Chineke ndị pụrụ ịbara anyị uru kpọmkwem? Ị ga-achọta azịza ya na magazin a.”
Teta! Mar. 8
“Ị pụrụ ịrịbawo ama na ọtụtụ ebe ọrụ aghọwo ndị dị ize ndụ karị. Magazin a nwere aro ndị dị mma banyere otú a pụrụ isi mee ka ha dị nchebe karị. Ọ na-egosikwa na ọdịmma anyị dabeere na ma ànyị na-ele ọrụ ego anya n’ụzọ ziri ezi. Biko gụọ ya.”
Ụlọ Nche Mar. 1
“N’ihi ihe nile na-eme taa, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime anyị na-eche ihe ọdịnihu ga-abụ. N’otu ekpere a ma ama, Jizọs kraịst kpughere ihe mere anyị pụrụ iji jiri obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu. [Gụọ Matiu 6:9, 10.] Ihe a kpọrọ mmadụ na-emeghachi otu mmehie ihe ndị ahụ e meworo ogologo oge gara aga. Ma n’oge ndị ahụ, ndị na-ejere Chineke ozi nwere ọdịnihu obi ụtọ. Magazin a na-egosi otú anyị onwe anyị kwa pụrụ isi nwee obi ụtọ.”
Teta! Mar. 8
“Bible na-emesi ike mkpa agụmakwụkwọ dị mma dị. [Gụọ Ilu 2:10, 11.] Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime anyị na-aghọta mkpa ọ dị ụmụaka inwe ndị nkụzi maara nke a na-akọ. Teta! na-eme ka ọrụ dị oké mkpa ndị nkụzi na-arụ, ụzọ anyị kwesịrị isi na-egosi ekele maka àjà ha na-achụ, na ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji nyere ha aka n’ọrụ ha tara akpụ, pụta ìhè.”