Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/03 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikwusara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ndị Nlekọta A Họpụtara Ka Ha Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Mee Ka Okwukwe Gị Na-esi Ike Mgbe Ị Nọ n’Ọgbakọ Na-eji Asụsụ Mba Ọzọ Amụ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 1/03 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Olee mgbe o kwesịrị ekwesị iguzobe ìgwè na-asụ asụsụ mba ọzọ?

Mgbe e nwere ọnụ ọgụgụ butụrụ ibu nke ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ n’ókèala ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị ime ihe ha nwere ike ime iji mee ndokwa maka ịrụ ọrụ ime nkwusa n’asụsụ ahụ. (km-IB 7/02 p. 1; km-IB 2/98 p. 3-4) Ọ pụrụ ịbụ na ndị ahụ na-asụ asụsụ mba ọzọ bisasịrị n’ókèala nke ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karị ndị dịdewere onwe ha. Mgbe ọ dị otú ahụ, onye nlekọta sekit ga-enye nduzi dị mkpa, si otú a na-enyere ọgbakọ ndị o metụtara aka imekọ ihe n’ọrụ ime nkwusa. Site n’oge ruo n’oge, a pụrụ ime ndokwa ka e nwee okwu ihu ọha ma ọ bụ Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche iji chọpụta mmadụ ole ga-abịa nzukọ ndị ahụ a ga-eduzi n’asụsụ mba ọzọ.

A pụrụ iguzobe ìgwè na-asụ asụsụ mba ọzọ mgbe e mezuru ihe ndị na-esonụ a chọrọ: (1) E nwere ndị nkwusa ma ọ bụ ndị nwere mmasị bụ́ ndị na-aghọta ozi ọma ahụ nke ọma karịsịa n’asụsụ mba ọzọ ahụ. (2) E nwere onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ga-ebute ụzọ ma na-eduzi otu nzukọ kwa izu ma ọ dịkarịa ala. (3) Òtù ndị okenye dị njikere ịkwado ìgwè ahụ. Mgbe e mezuru ihe ndị a a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ịgwa alaka ụlọ ọrụ ka e wee nwee ike ịmara kpọmkwem banyere ìgwè ahụ, ka e wee nweekwa ike inyekwu ntụziaka.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ìgwè dị iche iche na-amalite site n’inwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwa izu. Ka oge na-aga, ndị okenye pụrụ ịkwado ka a na-enwekwu nzukọ ndị ọzọ, dị ka Nzukọ Ihu Ọha na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. A pụrụ ime Ihe Omume nke 2, nke 3, na nke 4 n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na klas ọzọ ma ọ bụrụ na e nwere onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru nke maara asụsụ ahụ nke ọma, bụ́ onye pụrụ ije ozi dị ka onye ndụmọdụ. Otú ọ dị, ìgwè ahụ ga-esonyere ọgbakọ mgbe a na-atụle nkà okwu, mgbe a na-ekwu okwu izi ihe, mgbe a na-eme nchịkọta nke isi ihe sitere na Bible, na maka Nzukọ Ije Ozi. A pụkwara ime ndokwa iduzi nzukọ ije ozi ubi maka ìgwè ahụ.

Ndị nile so n’ìgwè ahụ ga na-arụkọ ọrụ ọnụ n’okpuru nlekọta nke òtù ndị okenye. Ndị okenye kwesịrị ịdị na-enye nduzi ezi uche dị na ya ma na-egosi ezi mmasị n’igbo mkpa ìgwè ahụ. Mgbe onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ nke na-ahụ maka ìgwè ahụ, ọ ga-emekwa ndokwa iso ìgwè ahụ rụọ ọrụ iji wulie ha elu n’ụzọ ime mmụọ. Site ná ngọzi Jehova, ka oge na-aga ìgwè ahụ na-asụ asụsụ mba ọzọ pụrụ ịghọ ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya