Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Mar. 15
“Ì chere na ihe ndị Jizọs kụziri bara uru n’oge anyị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta n’iwu a Jizọs nyere n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya. [Gụọ Jọn 15:12.] Jizọs kụzikwara ihe ndị ọzọ bara uru n’ụbọchị ahụ. Mbipụta Ụlọ Nche a na-egosi otú anyị pụrụ isi rite uru na ha.”
Ụlọ Nche Apr. 1
“E gosiri n’ebe a nri a na-akpọkarị Nri Anyasị Ikpeazụ. [Gosi ya ihu magazin a nakwa azụ ya.] Ị̀ maara na ọ bụ nanị ya bụ ememe e nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-eme ememe ncheta ya? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Luk 22:19.] Magazin a na-akọwa ihe mere ememe a ji dị oké mkpa nakwa otú o si metụta gị.”
Teta! Apr. 8
“Ị̀ chọpụtawo na ọ na-esiri ọtụtụ mmadụ ike ihi ụra nke ọma n’ụbọchị ndị a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Oké echiche pụrụ iso na-akpata nke a. [Gụọ Eklisiastis 5:12.] Magazin a na-atụle ụfọdụ ihe ndị na-akpata ehighị ụra nke ọma, ọ na-atụkwa aro ndị bara uru banyere otú anyị pụrụ isi meziwanye otú anyị si na-ehi ụra.”
“Ọ́ bụghị ihe mwute na ọgwụ ọjọọ alawo ndụ nke ọtụtụ ndị na-eto eto n’iyi? [Nye ohere maka nzaghachi.] Nsogbu na-amalitekarị mgbe ndị ntorobịa so ndị na-ekwesịghị ekwesị na-akpakọrịta. [Gụọ 1 Ndị Kọrint 15:33.] Mbipụta Teta! a na-akọwa ihe na-eduba ndị na-eto eto n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji chebe ha.”