Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Mar. 15
“Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị enweela ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha, o wutekwara anyị mgbe nke a mere. Ị̀ ma banyere nkwa a na-akasi obi? [Gụọ Ọrụ 24:15. Ị gụsịa ya, i chere ka ọ zaa.] Ma, ọtụtụ ndị na-eche, sị, Òlee ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ? Olee mgbe a ga-akpọlite ha? Olee ebe a ga-akpọlite ha? Magazin a tụlere otú Bible si zaa ajụjụ ndị ahụ.”
Ụlọ Nche Apr. 1
“Okwu a a maara nke ọma na-eme ka mkpa ọ dị inweta ihe ọmụma banyere Chineke pụta ìhè. [Gụọ Matiu 4:4.] Ma, ọ na-esiri ọtụtụ mmadụ ike ịghọta Okwu Chineke. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-ekwu ihe ndị pụrụ inyere gị aka ịghọta Bible.”
Teta! Jan.–Mar.
“Ndị mmadụ na-anọgide na-akọ nkọ banyere ihe ọdịnihu ga-abụ. Ma, mgbe ụfọdụ, ihe ha na-ekwu banyere ọdịnihu bụ ihe ha chọrọ ka o mee, ọ naghị abụcha ihe ha ji n’aka na ọ ga-emerịrị. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Dị ka a kọwara na magazin a, Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke agaghị ekwe ka ọnọdụ ọjọọ ndị e nwere n’ụwa taa dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nzube mbụ ya maka ụmụ mmadụ ga-emezu.” Gụọ Aịsaịa 55:10, 11.
“Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ taa weere Bible dị ka ihe na-adịchaghị mkpa. Ma, legodị ihe Okwu Chineke kwuru n’ebe a. [Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.] N’ezie, Bible bụ ebe magburu onwe ya, nke a pụkwara ịdabere na ya, e si enweta ezi amamihe. N’ime ya, e nwere ọtụtụ ndụmọdụ ndị bụ́ ọkpọka n’ihe ndị metụtara ndụ ezinụlọ, ahụ́ ike, achụmnta ego, na ihe ndị ọzọ a na-eme kwa ụbọchị.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 22.