Mkpọsa Pụrụ Iche Iji Kesaa Broshuọ Ọhụrụ
1 Ọnọdụ ụwa na-enye ọtụtụ ndị nsogbu taa, ma, ọ bụ mmadụ ole na ole ghọtara ihe mere ụwa ji dị otú a, ihe ọdịnihu ga-abụ, na ihe ha na-aghaghị ime iji bụrụ ndị e chebere ndụ gabiga ikpe na-abịanụ. (Ezik. 9:4) Iji nyere ha aka ịghọta oge anyị nọ na ya, a ga-eme mkpọsa pụrụ iche iji kesaa broshuọ ọhụrụ bụ́ Nọrọ na Nche! site na Monday, March 21, ruo Sunday, April 17.
2 A pụrụ inyefe broshuọ ahụ mgbe a na-ezi ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, mgbe a na-eme nletaghachi, mgbe a na-agba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi, ma ọ bụ mgbe a nọ n’ebe ọha na eze na-anọkarị. Otú ọ dị, e kwesịghị inyefe Nọrọ na Nche! aghara aghara. Kama, nanị ndị e kwesịrị inye broshuọ ahụ bụ ndị gosipụtara mmasị n’ihe Bible na-ekwu banyere ihe ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi. A pụrụ inye ndị na-egosichaghị mmasị n’ozi ahụ traktị kama inye ha broshuọ ahụ.
3 Ị pụrụ ịdọta mmasị mmadụ site n’ikwu, sị:
◼ “Ọtụtụ mmadụ na-enwe nchegbu banyere nsogbu ndị siri ike na ihe ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ a na-ahụkarị taa. [Nye ihe atụ nke a maara n’ógbè unu.] Ị̀ ma na e buru ihe ndị dị otú ahụ n’amụma n’ime Bible? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwekọrọ n’ihe atụ i nyere, dị ka Matiu 24:3, 7, 8; Luk 21:7, 10, 11; ma ọ bụ 2 Timoti 3:1-5.] Bible na-ekpughe ihe ihe ndị na-eme n’oge anyị na-egosi na ihe ọdịnihu ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere ya? [Chere ka ọ zaa. Nye ya broshuọ ahụ ma ọ bụrụ na o gosipụtara ezi mmasị.] A na-enye broshuọ a n’ekwughị ego ole a ga-akwụ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inye onyinye maka ọrụ a anyị na-arụ n’ụwa nile, obi ga-adị anyị ụtọ ịnara ya.”
4 Ma ọ bụkwanụ, ị pụrụ ịhụta nke a dị ka ihe dị irè:
◼ “Ọtụtụ ndị na-ahụsi anya n’ihi ihe ndị na-awụ akpata oyi na-eme n’ụwa ma ọ bụ n’ihi ihe ndị funahụrụ ha. Ụfọdụ na-eche ihe mere na Chineke adịghị eme ihe iji gbochie ihe ndị dị otú ahụ. Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-eme ihe n’isi nso iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ. Ka m gosi gị ụfọdụ ihe ọma Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ. [Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11.] Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere ya?” Mechie otú ahụ e kwuru ka e siri mechie n’ihe atụ nke mbụ.
5 Gbalịa inweta aha na adres nke onye ọ bụla i nyefere broshuọ ahụ, meekwa ndokwa ịgaghachi na nke ya iji wulite mmasị ahụ o gosiri. A ga-atụ aro otú ị pụrụ isi mee nke a n’Ozi Alaeze Anyị nke April 2005. Ọ bụrụ na mmadụ egosi ezi mmasị n’oge mbụ ị gaghachiri, ị pụrụ ịmalite iduziri ya ọmụmụ Bible ozugbo ahụ, na-eji Nọrọ na Nche! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ, dị ka broshuọ Na-achọ.
6 A ga-enweta broshuọ a mgbe e mechisịrị Nzukọ Ije Ozi a ga-anọ na ya tụlee isiokwu a. N’oge mbụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ gara iwere broshuọ a, a na-atụ aro ka ha nweta nanị ole ha tụrụ anya inyefe n’ime ụbọchị ole na ole mbụ a malitere ime mkpọsa ahụ. Ka Jehova gọzie ihe omume a pụrụ iche n’ụzọ ga-ewetara Ya otuto ma baara ndị nile nwere obi eziokwu n’ebe nile uru.—Ọma 90:17.