Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Feb. 15
“Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ ebe ndị mmadụ na-akọ banyere ọrụ ebube a rụrụ. [Nye otu ihe atụ.] Ụfọdụ mmadụ na-ekwere n’akụkọ ndị a. Ndị ọzọ na-enwe obi abụọ banyere ha. Magazin a na-ekwu ma ọrụ ebube ndị e dekọrọ na Bible hà mere eme n’ezie nakwa ma à ka na-arụ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ taa.” Gụọ Jeremaịa 32:21.
Ụlọ Nche Mar. 1
“Ọ̀ dị gị ka ụwa ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na onye ọ bụla agbasoo ndụmọdụ a? [Gụọ Ndị Rom 12:17, 18. Ị gụsịa ya, i chere ka ọ zaa.] N’ụzọ dị mwute, esemokwu na-adapụta mgbe ụfọdụ n’etiti mmadụ na ibe ya. Magazin a na-egosi otú itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ pụrụ isi nyere anyị aka idozi esemokwu ma mee ka udo dịghachi.”
Teta! Mar. 8
“N’oge ochie, Chineke nyere ụmụaka iwu ka ha sọpụrụ nna ha na nne ha. [Gụọ Ọpụpụ 20:12.] Ọ̀ dị gị ka a na-enye ndị nne nsọpụrụ ruuru ha taa? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-ekwu banyere ihe isi ike ndị nne nọ ná mba dị iche iche na-enwe na otú ha si na-emeri ihe isi ike ndị ahụ.”