Jiri Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe, Nwetakwa Ọtụtụ Ngọzi
1. Olee ihe mere o ji dị mma ka i na-enyocha ma ị̀ ka na-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ?
1 Mgbe ị ghọrọ Onye Kraịst ọhụrụ, o yiri nnọọ ka ị gbalịsiri ike iwepụta oge maka ihe ime mmụọ ndị dị ka ịmụ Bible, ịga nzukọ Ndị Kraịst, ịga ozi ubi, na ikpe ekpere. N’ihi otú Jehova si gọzie mgbalị gị mgbe ahụ, ị bịara mewekwuo nke ọma n’ọgbakọ. Ma eleghị anya, ọtụtụ afọ agafeela kemgbe e mere gị baptizim. Ị̀ ka ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe otú i si jiri ya kpọrọ mgbe ị nọ na-aghọ Onye Kraịst?
2. Olee uru anyị na-erite n’ịgụ Bible kwa ụbọchị?
2 Nyochaa Otú I Si Eme Ya: Ọ̀ marala gị ahụ́ ịdị na-agụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị? Anyị ga-enwetarịrị ọtụtụ ngọzi ma anyị na-eme otú ahụ! (Josh. 1:8; Ọma 1:2, 3) N’Izrel oge ochie, a chọrọ ka eze ọ bụla na-agụ Iwu ahụ “ụbọchị nile nke ndụ ya.” Olee uru ọ ga-abara eze ahụ? Ọ ga-amụta ịdị umeala n’obi, mụtakwa ịtụ egwu Jehova ka o wee ghara ịhapụ ihe O nyere n’iwu. (Deut. 17:18-20) N’otu aka ahụ taa, ịgụ Bible kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ịnọgide bụrụ ndị na-enweghị ụta na ndị aka ha dị ọcha n’ime ụwa a jọgburu onwe ya. Ọ na-enyekwara anyị aka ịbụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu izi ozi ọma ahụ.—Fil. 2:15; 2 Tim. 3:17.
3. Olee ngọzi ndị anyị na-enweta site n’ịgachi ọmụmụ ihe anya?
3 Jizọs mere ka ịga n’ụlọ nzukọ, bụ́ ebe a na-amụ Akwụkwọ Nsọ, bụrụ ihe e ji mara ya. (Luk 4:16) O doro anya na nke a nyere ya ike iguzogide ọnwụnwa ndị bịaara ya. Ntụziaka ime mmụọ ndị anyị na-enweta ná nzukọ ọgbakọ na ‘ume anyị na-agbarịta onwe anyị’ na-emekwa ka anyị onwe anyị gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ. (Rom 1:12) Iso ụmụnna anyị na-ezukọ na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ihe isi ike ndị anyị na-enweta n’ụbọchị ikpeazụ a. (Hib. 10:24, 25) Ịgazu nzukọ dum ọ̀ ka bụ ihe e ji mara gị?
4. Olee otú ikere òkè n’ozi ubi kwa izu si abara anyị uru?
4 Bible na-agwa anyị na ndị ozi keere òkè n’ịkpọsa ozi ọma ahụ ‘kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’ (Ọrụ 5:42) Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị enwe ike ime nkwusa kwa ụbọchị, ànyị pụrụ ime ka ọ mara anyị ahụ́ ịdị na-ekere òkè kwa izu n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ e si ezisa ozi ọma? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, o doro anya na anyị ga na-etinyekwu nkà n’ụzọ anyị si eji Okwu Chineke eme ihe, o yikwara nnọọ ka ànyị ga-enweta ahụmahụ ndị na-agba ume mgbe anyị na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible.
5. Olee ihe mere o ji dị oké mkpa ikpegara Jehova ekpere mgbe nile?
5 Daniel nwetara ọtụtụ ngọzi n’ihi ife Jehova “mgbe nile” ná ndụ ya. Otu ụzọ o si fee Jehova ná ndụ ya nile bụ site n’ikpegara Ya ekpere mgbe nile. (Dan. 6:10, 16, 20) N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị ana-eji obi anyị ekpegara Jehova ekpere mgbe nile, ọ ga-eji mmụọ nsọ ya gọzie anyị. (Luk 11:9-13) Ọzọkwa, Jehova ga-abịaru anyị nso, kwekwa ka anyị bụrụ ezigbo ndị enyi ya. (Ọma 25:14; Jems 4:8) Lee ka nke ahụ si bụrụ ngọzi magburu onwe ya! N’ihi ya, ka anyị na-agbalịsi ike ịnọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe ma nweta ọtụtụ ngọzi n’aka Jehova.