Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe
Ụlọ Nche Jun 1
“Ọtụtụ ndị na-ebu ụzọ agụ ihe ndị na-agụ kpakpando kọrọ banyere ihe bụ́ akara aka ndị mmadụ tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. Ì chere na kpakpando na-emetụta ndụ anyị? [Chere ka ọ zaa.] Ọ dị mma ịmara na Baịbụl kwuru banyere ìgwè kpakpando nke zodịak. [Gụọ 2 Ndị Eze 23:5.] Isiokwu a kọwara ihe Baịbụl kwuru n’okwu a.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 18.
Teta! Julaị–Septemba
“Gụọ Abụ Ọma 37:9-11. Jụzie onye ahụ, sị: “Olee otú i chere ụwa a ga-adị mgbe ihe a e kwuru ebe a ga-emezu? [Chere ka ọ zaa.] E kwuru okwu banyere amụma a na-agba ume n’isiokwu a, kwuokwa ihe mere ihe ọjọọ ji jupụta n’ụwa taa.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 19.
Ụlọ Nche Julaị 1
“Ọtụtụ ndị chere na Chineke bụ aha Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ma, ị̀ maara na Baịbụl gwara anyị ihe bụ aha Chineke? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Aịzaya 42:8a.] Magazin a kọwara ihe mere e ji wepụ aha Chineke na Baịbụl ụfọdụ, nakwa ihe mmadụ ịma aha Chineke pụtara.”
Teta! Julaị–Septemba
“Ọtụtụ ndị na-aṅụ sịga ga-achọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ma ọ na-esiri ha ike ịkwụsị ya. Ò nwere onye ị maara ga-achọ ịkwụsị ịṅụ sịga? [Chere ka ọ zaa.] Ụfọdụ ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga chọpụtara na ihe so nyere ha aka bụ na ha gwara ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha ka ha nyere ha aka. [Gụọ Ekliziastis 4:12a.] Magazin a kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere onye na-aṅụ sịga aka ịkwụsị ya.”