Ì Jitụla Ihe E Dere n’Azụ Ụlọ Nche Zie Ozi Ọma?
Ndị mmadụ welite magazin ha chọrọ ịgụ, ha lehaala anya n’ihu ya, ihe ọzọ ha na-emezi bụ ịtụgharị azụ ya lee ihe e dere ebe ahụ. N’azụ Ụlọ Nche anyị nke ọhaneze, a na-ajụ ajụjụ ndị nwere ike ịkpali mmasị onye chọrọ ịgụ ya, a na-edepụtakwa peeji ebe a zara ajụjụ ndị ahụ n’ime magazin ahụ.
Anyị nwere ike iji ajụjụ ndị a jụrụ n’azụ magazin a malite mkparịta ụka. Ọ bụrụ na ókèala anyị ehighị nne, nke na anyị na-arụkarị ya ugboro ugboro, anyị nwere ike isi n’ajụjụ ndị ahụ nweta ajụjụ ndị anyị ga-eji na-amalite mkparịta ụka n’ọnwa ahụ niile. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ji ọrụ n’aka, anyị nwere ike igbu okwu anyị nkenke, gosi onye ahụ otu n’ime ajụjụ ndị dị n’azụ magazin ahụ ma sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịma azịza ya, aga m ahapụrụ gị magazin ndị a, m ga-abịakwa oge ị ga-enwe ohere ka anyị kwurịta ya.” Ụfọdụ ndị nkwusa nwere ike gosi onye nwe ụlọ azụ magazin ahụ ma gwa ya ka ọ họrọ ajụjụ nke masịrị ya. Ya họrọ nke masịrị ya, onye nkwusa ahụ nwere ike gosi ya peeji ebe a zara ajụjụ ahụ, gụziere ya amaokwu Baịbụl o bu n’obi ịgụrụ ya. I nwedịrị ike icheta ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi jiri ihe ndị e dere n’azụ Ụlọ Nche mee ka mmadụ nwee mmasị ịgụ ya.