Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Disemba
“Ama m na i kwetara na o nweghị onye nọ n’ụwa a na-agaghị achọ inwe enyi. Olee àgwà ọ ga-abụ enyi gị nwee, ya atọọ gị ezigbo ụtọ? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe magazin a kwuru na ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịsa anya ná mmiri họrọ ndị ga-abụ ndị enyi anyị.” Nye onye nwe ụlọ Ụlọ Nche Disemba 1, gị na ya tụleekwa ihe e dere n’okpuru ajụjụ mbụ dị na peeji nke 16. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. Unu mechazie, nyekwuo ya otu Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ ndị nke ọzọ.
Ụlọ Nche Disemba 1
“Ì chetụla echiche ihe mere ọdachi ji na-ezoro ụmụ mmadụ ka mmiri taa? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na n’oge anyị a, ọdachi ga na-ezu ụmụ mmadụ ahụ́. [Gụọ Matiu 24:7, 8.] Magazin a zara ajụjụ ndị a: Gịnị mere ọdachi ji ju ebe niile n’ụwa taa? Chineke ò ji ọdachi ndị a na-ata ụmụ mmadụ ahụhụ? Olee ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka a ghara ịna-enwezi ọdachi?”
Teta! Ọktoba–Disemba
“O nweghị nne ma ọ bụ nna na-agaghị achọ ka ụmụ ya nwee obi ụtọ ná ndụ. Ma, olee ihe i chere ndị nne na nna kwesịrị ime ka ụmụ ha nwee ike ịghọ ndị dimkpa ma ihe? [Chere ka ọ zaa.] Ka ụmụaka nwee ike ịna-erube isi ma na-akpa ezigbo àgwà, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na-akụziri ha ihe mgbe niile. [Gụọ Diuterọnọmi 6:6, 7.] Magazin a kọwara otú ndụmọdụ a dị na Baịbụl nwere ike isi nyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha nke ọma malite n’oge e ku ha n’aka ruokwa mgbe ha ghọrọ ndị na-eto eto.”