Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Disemba
I kelechaa onye nwe ụlọ, kwuo, sị: “Ọnwa Disemba ruhaala, ọtụtụ ndị na-eche banyere Jizọs. A sị gị kwuo, olee ihe i chere kacha mkpa Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Ụlọ Nche a kwuru na peeji nke 16.” Nye ya Ụlọ Nche Disemba 1, gị na ya tụleekwa otu n’ime ajụjụ ndị dị na peeji nke 16, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ ọzọ dị n’Ụlọ Nche ahụ.
Ụlọ Nche Disemba 1
I kelechaa onye nwe ụlọ, gị asị ya: “N’oge a, ihe ndị mmadụ na-eche bụ otú ha ga-esi gbaa Krismas. [Gosi ya ihe ise ahụ dị na peeji nke 3] Jụzie ya, sị “Olee nke n’ime ihe ndị a i chere kacha ndị mmadụ mkpa n’oge Krismas? [Chere ka ọ zaa. Sapeta peeji a tụlere ihe ahụ o kwuru, gụọkwa amaokwu Baịbụl dị ná mbido isiokwu ahụ.]” Ị gụchaa, gị ekwuzie, sị: “Ụlọ Nche a kwuru ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-echeta Jizọs mgbe niile, ọ bụghị naanị n’oge Krismas.”
Teta! Ọktoba–Disemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya gị asị ya: “Nsogbu juru n’ụwa taa. Ma, a sị gị kwuo, olee ndị nke ị ga-achọ ka ha kwụsị? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru ihe kpatara anyị ji enwe nsogbu taa. [Gụọ Ndị Rom 5:12.] Ụlọ Nche a kwuru ihe mere anyị ga-eji nwee okwukwe na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-akwụsị agụụ, agha, ọrịa, na ọnwụ.”