Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Disemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị na-atụ anya na Jizọs ga-abịa ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bịa, gịnị ka ị ga-achọ ka o meere gị?” Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gosi ya ihe dị n’azụ Ụlọ Nche Disemba 1. Gị na ya tụlee ajụjụ nke mbụ dị na peeji ahụ, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Disemba 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị anaghịzi enwe ohere nke na o nwere ike ịna-esiri ha ike icheta Chineke. Ì chere na anyị kwesịrị ịna-echeta Chineke n’ihe ọ bụla anyị na-eme? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gị asị ya:] Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu zie ndị mmadụ ihe, o kwuru na otu n’ime ihe ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ bụ ife Chineke. [Gụọ Matiu 5:3.] Ụlọ Nche a kwuru ihe atọ mere anyị ji kwesị ịna-efe Chineke.”
Teta! Nọvemba–Disemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “N’ụwa taa, ọtụtụ ndị na-ada mbà, obi ana-ajọkwa ha njọ. Olee otú i chere obi na-adị Chineke mgbe anyị dara mbà? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gụọ Abụ Ọma 34:18.] Teta! a kọwara na ọ bụrụgodị na onye obi na-ajọ njọ kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ, e nwere amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere ya aka. O kwukwara na ịkọrọ mmadụ otú obi dị anyị nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị dara mbà.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.”