Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/14 p. 4
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
  • Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2014
km 11/14 p. 4

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Disemba

“Anyị bịara ka anyị na unu kparịta ihe ụfọdụ ga-enyere ezinụlọ ọ bụla aka. Ọtụtụ ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha hụ Chineke n’anya. Ì chere na ọ bụ ha ga-akụziri ụmụ ha otú ha ga-esi hụ ya n’anya ka ọ̀ bụ ụmụ ha ga-eji aka ha mara otú ha ga-esi ahụ ya n’anya?” Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gosi ya ihe dị n’azụ Ụlọ Nche Disemba 1, tụleenụ ihe dị n’okpuru ajụjụ nke mbụ. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Nye ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, yiekwanụ mgbe ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.

Ụlọ Nche Disemba 1

I kelechaa onye ị bịara na nke ya, sị ya: “Ihe mere anyị ji bịa bụ ka anyị na gị kwuo banyere Chineke. Anyị ma na onye ọ bụla nwere ụdị onye o chere na Chineke bụ. Ì chere na ọtụtụ ndị na-eche na Chineke adịghị adị ka hà na-eche na ọ bụ enyi ha? [Chere ka ọ zaa.] Amaokwu Baịbụl a gwara anyị otú Chineke chọrọ ka anyị na ya dịrị. [Gụọ Jems 4:8a.] Ụlọ Nche a kwuru ihe atọ anyị nwere ike ime ka anyị na Chineke dị ná mma.”

Teta! Nọvemba–Disemba

“Anyị bịara ka anyị na unu tụlee ụfọdụ ajụjụ dị mkpa a zara n’otu isiokwu dị na magazin a. [Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 8.] È nwere onye na-anụ ekpere anyị? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl gwara anyị ihe anyị kwesịrị ịma banyere Chineke na ekpere. [Gụọ Aịzaya 55:6.] Anyị nwere ike ikpeku Chineke ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ n’ihi na ọ nọ anyị nso. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ nụ ekpere anyị, olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ya? Isiokwu a kwuru ihe ole na ole anyị kwesịrị ịma banyere ụdị ekpere Chineke na-anụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya