Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/12 p. 2-3
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Gwa Ha Okwu A”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “M Ga-eme Ka Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 5/12 p. 2-3

Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị

1. Olee akwụkwọ e wepụtara ná mgbakọ distrikti anyị gara n’afọ 2010? Oleekwa ihe anyị ga-eji ya eme?

1 Ná mgbakọ distrikti anyị gara n’afọ 2010, obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe e wepụtara akwụkwọ bụ́ Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị. Akwụkwọ a kọwara otú akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá nwere ike isi nyere anyị aka ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. (Rom 15:4) E biri ya otú ọ ga-adị mfe ịmụ ya n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Anyị ga-ebidokwa ịmụ ya n’izu na-amalite na Nọvemba 5, 2012.

2. Gịnị mere akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá ga-eji abara anyị uru?

2 Amụma Jeremaya Baara Anyị Uru Taa: Ọ bụ Jeremaya onye amụma dere akwụkwọ Jeremaya. O bukwara amụma n’oge Juda nọ n’ezigbo nsogbu. Mgbe Jehova gwara ya na ọ ga-abụ onye amụma, o kwuru na ya etorubeghị. (Jere. 1:6) Ndị mmadụ kpagbukwara ya. Ọ ga-abụkwa na ndị obodo ya, bụ́ ndị Anatọt, so kpagbuo ya. (Jere. 11:21, 22) Ọ bụ ihe a niile mere Jeremaya ji daa mbà mgbe ụfọdụ. (Jere. 20:14) Ka anyị na-eme “ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” Jizọs, a na-akpagbu anyị. E nwekwara ihe ndị nwere ike ime ka anyị daa mbà mgbe ụfọdụ otú ahụ Jeremaya dara. (Mat. 28:19) Ọ bụrụ na anyị amụọ ihe Jeremaya dere n’akwụkwọ ya, ọ ga-eme ka anyị jiri obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

3. Olee otú e si hazie akwụkwọ a anyị na-aga ịmụ?

3 Otú E Si Hazie Akwụkwọ A: E dere “gụọ” n’amaokwu Baịbụl ndị a chọrọ ka anyị gụọ ma anyị na-amụ akwụkwọ a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ebe ọ bụla a ga-akwụsị n’izu ọ bụla, ị ga-ahụ otu ajụjụ ma ọ bụ ajụjụ abụọ e ji aka akwụkwọ gbara okpotokpo dee. Ajụjụ ahụ ga-enyere anyị aka ịchịkọta ihe anyị mụrụ n’izu ahụ. Onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ kwesịrị ịjụ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị ahụ, ka ha nwee ike ịkọwa isi ihe anyị mụrụ n’ụbọchị ahụ. E sere ọtụtụ ọmarịcha foto n’akwụkwọ a, e kwesịkwara ịkọwa ha mgbe anyị na-amụ ihe.

4. Olee otú anyị ga-esi rite ezigbo uru ma anyị mụwa akwụkwọ a?

4 Anyị chọọ irite ezigbo uru ma a na-amụ akwụkwọ a, anyị ga-amụ ya n’ụlọ tupu anyị abịa ọmụmụ ihe. A mụwa ya, gee ntị nke ọma ka ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka ná ndụ gị nakwa n’ozi gị. Gbalịa na-etinye ọnụ. Jehova nyeere Jeremaya aka, ya arụọ ọrụ o nyere ya nke ọma. Nke a mekwara ka Jeremaya nwee obi ụtọ. (Jere. 15:16) Ekpere anyị bụ ka akwụkwọ a nyere anyị aka inwe ụdị obi ụtọ ahụ n’ozi anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya