Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/13 p. 2
  • Olee Onye Magazin A Ga-akacha Abara Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Onye Magazin A Ga-akacha Abara Uru?
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Họrọ Isiokwu Dị Iche Iche Iji Nweta Mmasị Pụrụ Iche nke Ndị Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 5/13 p. 2

Olee Onye Magazin A Ga-akacha Abara Uru?

1. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ọ bụla anyị gụrụ Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!? Oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji eme otú ahụ?

1 Ihe mere anyị ji ede Ụlọ Nche na Teta! bụ ka mmadụ niile na-agụ ha. N’ihi ya, isiokwu ndị na-agba na ha na-akọ gbasara ihe dị iche iche. Mgbe ọ bụla anyị gụrụ isiokwu n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta!, anyị kwesịrị iche echiche mara onye ọ ga-akacha abara uru. Anyị kwesịkwara inye ya onye ahụ ka ọ gụọ.

2. Olee isiokwu ndị na-agba n’akwụkwọ anyị ndị i chere na ndị mmadụ nwere ike ịchọ ịgụ?

2 Ọ bụrụ na ị na-agụ Ụlọ Nche gụta ihe gị na onye ọrụ unu kwurịtarala, i nwere ike inye ya Ụlọ Nche ahụ ka ọ gụọ. E nweekwa isiokwu kwuru gbasara ezinụlọ nke i chere na ọ ga-abara onye ikwu gị uru, i nwekwara ike inye ya onye ahụ ka ọ gụọ. Ọ bụrụkwa na o nwere Teta! kọrọ gbasara ebe onye ọrụ unu chọrọ ịga, ọ ga-abara ya uru ma ọ gụọ ya. Akwụkwọ anyị nwekwara ike ịbara ndị ahịa ma ọ bụ ndị ọrụ gọọmenti uru. Dị ka ihe atụ, i nwere ike inye ndị agadị ma ọ bụkwanụ ndị na-elekọta ha magazin kwuru gbasara nsogbu ndị agadị na-enwe. Ndị uwe ojii ga-achọkwa ịgụ akwụkwọ anyị ọ bụla kwuru gbasara ndị uwe ojii ma ọ bụ ime mpụ.

3. Olee ihe gosiri na mgbe ọ bụla anyị nwetara Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!, anyị kwesịrị inye ya ndị anyị chere na ọ ga-akacha abara uru?

3 Uru Ọ Na-aba: O nwere nwanna ya na nwunye ya bi na Saụt Afrịka. Mgbe ha nwetara Teta! Ọktoba–Disemba 2011, nke isiokwu ya bụ “Otú A Ga-esi Zụọ Ụmụaka Ha Abaa Uru,” ha kpọrọ ụlọ akwụkwọ iri abụọ na ise n’ókèala ha na fon gwa ha gbasara ya. Ụlọ akwụkwọ iri abụọ na abụọ naara ha Teta! ahụ kee ụmụ akwụkwọ ha. O nwekwara di na nwunye ọzọ na Saụt Afrịka mere ụdị ihe ahụ. Ha gakwara n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ókèala ha nye ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ Teta! ahụ. Ndị nkụzi nọ n’otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị ahụ kpebiri na ha ga na-agụ Teta! ahụ n’izu ọ bụla. Di na nwunye ahụ gara kọọrọ onye nlekọta sekit ha ihe a merenụ, ya agwa ọgbakọ niile dị na sekit ya ka ha gaa nye ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ókèala ha Teta! ahụ. Ọtụtụ ndị detaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Saụt Afrịka akwụkwọ ozi ka ha zitere ha Teta! ahụ. N’ihi ya, alaka ụlọ ọrụ ahụ bipụtakwuru ya.

4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji enye ọtụtụ ndị magazin anyị?

4 Ụlọ Nche na Teta! na-akọ gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa taa na ihe ndị ha na-egosi. Ha na-ekwukwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị ahụ na ihe Alaeze Chineke ga-eme. A bịa n’akwụkwọ niile a na-ebi n’ụwa, ọ bụ naanị ha ka a na-ede ihe mmadụ ga-eme ka a zọpụta ya. (Aịza. 52:7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka ha rute ọtụtụ ndị aka. Ọ bụrụ na anyị enweta Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta!, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee onye magazin a ga-akacha abara uru?’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya