“Agaghị M Ewe Akwụkwọ Unu ma Ọ Bụrụ na I Weghị nke Anyị”
Ụfọdụ ndị na-agwa anyị ihe a ma anyị chọọ inye ha akwụkwọ anyị. Ị manụ na akwụkwọ anyị na-enye ndị mmadụ bụ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Ma, ihe juru n’akwụkwọ ndị chọọchị bụ ụgha. Ebe ọ bụ na anyị anaghị eme onye anyị nyere akwụkwọ anyị, anyị anara ya nke ha, olee ihe anyị nwere ike ịgwa ha ma ha kwuo ụdị ihe a? (Rom 1:25) Anyị nwere ike kelee onye ahụ maka na ọ chọrọ inye anyị akwụkwọ ha. Anyị ajụzie ya, sị: “Olee ihe o kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị? [Chere ka ọ zaa. Ọ bụrụ na ọ sị gị gụọ ya ka ị mata ihe o kwuru, gị agwa ya na ị gwara ya ihe dị n’akwụkwọ anyị tupu gị enyewe ya ya. Gụzie Matiu 6:9, 10 ma ọ bụ ị gwa ya ihe dị n’ebe ahụ. Ị gụchaa, gị asị ya:] Jizọs kwuru na Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mewe n’ụwa. N’ihi ya, akwụkwọ ọ bụla m na-agụ gbasara Chineke bụ naanị nke na-ekwu banyere Alaeze ya. Ka m gosinụ gị ihe Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-eme.”