A Ga-enye Ndị Mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38 n’Ọnwa Jenụwarị
1. Olee ihe ọtụtụ ndị na-amaghị gbasara ndị nwụrụ anwụ? Oleekwa ihe a ga-enye ha n’ọnwa Jenụwarị nke ga-enyere ha aka?
1 N’agbanyeghị okpukpe anyị na-ekpe, ọnwụ bụ onye iro anyị niile. (1 Kọr. 15:26) Ọtụtụ ndị amaghị ebe ndị nwụrụ anwụ nọ. Ha amaghịkwa ma hà ga-ahụ ha ọzọ. N’ihi ya, ndị nkwusa niile ga-enye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38. Isiokwu ya bụ: Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ? Anyị ga-enye ya ndị mmadụ otu ọnwa. Anyị ga-amalite inye ha ya n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị. Ọnwa Jenụwarị gachaa, anyị ga-ejizi Akụkọ Alaeze a na-eje ozi ọma otú anyị si eji traktị ndị ọzọ.
2. Olee otú e si dee Akụkọ Alaeze nke 38?
2 Otú E Si Dee Ya: E dere Akụkọ Alaeze nke 38 otú ọ ga-abụ a pịa ya, mmadụ ana-ahụ ajụjụ ahụ dị n’ihu ya nke ọma, hụkwa ebe e dere “Gịnị ka i chere?” Onye ahụ mepezie ime ya, ya ahụ otú Baịbụl si zaa ajụjụ ahụ bụ́ “Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ? Ọ ga-ahụkwa otú nkwa Baịbụl kwere gbasara ndị nwụrụ anwụ ga-esi baara ya uru. Ihe ọzọ ọ ga-ahụ n’akwụkwọ ahụ bụ ihe mere ọ ga-eji kwere n’ihe Baịbụl kwuru. Mgbe ọ gụruru n’azụ akwụkwọ ahụ ọ ga-ahụ ajụjụ a jụrụ ebe ahụ nke ọ ga-echebara echiche. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka e kwuru ihe ọ ga-eme ka o nwee ike ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru.
3. Olee otú anyị ga-esi enye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38?
3 Otú A Ga-esi Nye Ya Ndị Mmadụ: Otú anyị ga-esi enye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38 ga-adị ka otú ahụ anyị si enye ha akwụkwọ ịkpọ òkù ma anyị chọọ icheta ọnwụ Jizọs ma ọ bụkwanụ anyị chọọ ịga mgbakọ distrikti. Ndị okenye ga-ekwu ihe a ga-eme iji hụ na ndị nkwusa gazuru ókèala niile ọgbakọ ha nwere. N’akwụkwọ ozi Eprel 1, 2013 e ziteere ndị okenye, alaka ụlọ ọrụ gwara ha otú ha ga-esi hazie ya. Ọ bụrụ na unu arụchaa ókèala ọgbakọ unu tupu ọnwa Jenụwarị agwụ, unu nwere ike gaa soro ọgbakọ ọzọ dị unu nso nke ókèala ya hiri nne nye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze a. Ị gaa iwere Akụkọ Alaeze nke ị ga-enye ndị mmadụ, cheta na ọ bụ naanị ole ị ga-eji gaa ozi ọma n’izu ahụ ka ị ga-ewere. Ọ bụrụ na Akụkọ Alaeze nke 38 ka fọrọ unu n’aka mgbe unu gazurula ebe unu na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ, unu nwere ike inye ha ndị unu hụrụ n’ụzọ, n’ahịa, ma ọ bụ n’ọdụ ụgbọala. Ọ bụrụ na Akụkọ Alaeze unu na-enye ndị mmadụ afọghịzi tupu ọnwa Jenụwarị agwụ, nyewenụ ha akwụkwọ e kwesịrị inye ha n’ọnwa Febụwarị. Kama ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jenụwarị, ihe anyị ga-enye ha bụ Akụkọ Alaeze nke 38. Anyị gaa inye ndị mmadụ akwụkwọ ahụ ná ngwụcha izu, anyị nwere ike inyekwu ha Ụlọ Nche na Teta! Ị̀ na-ahazikwa otú ihe ga-esi dịrị gị ka i nwee ike iso nye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze a?