Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Nọvemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya “Olee otú obi ga-adị gị ma ị chọpụta na ihe ndị a gwara gị banyere Chineke abụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gị asị ya:] Ụlọ Nche a kwuru banyere ụgha ụfọdụ ndị mmadụ na-aghagide Chineke.” Nye ya Ụlọ Nche Nọvemba 1. Gị na ya tụleekwa otu isiokwu n’ime isiokwu ndị dị na peeji nke 4, 5, ma ọ bụ nke 6. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl, kọwaakwa ya. Nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịa. Tupu ị lawa, jụọ ya otu ajụjụ, gwa ya na ị ga-aza ajụjụ ahụ ma ị bịa mgbe ọzọ.
Ụlọ Nche Nọvemba 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “È nwere ụgha ọ bụla ị ma ndị mmadụ na-aghagide Chineke? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gị asị:] Baịbụl kwuru na Chineke chọrọ ka anyị hụ ya n’anya, tụkwasịkwa ya obi. [Gụọ Aịzaya 41:13.] Ụlọ Nche a kwuru banyere ụgha atọ ndị mmadụ na-aghagide Chineke nke mere ka o siere ụfọdụ ndị ike ịbịaru ya nso.”
Teta! Nọvemba–Disemba
I kelechaa onye ị bịara izi ozi ọma, gị asị ya: “Ì chere na mmadụ nwere ike inwe afọ ojuju ọ bụrụgodị na o nweghị akụnụba? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gị asị ya:] Legodị ihe Baịbụl kwuru na 1 Timoti 6:8. [Gụọ ya. Ị gụchaa ya, sị ya:] Teta! a kwuru otú anyị kwesịrị isi na-ele akụnụba anya, kwuokwa ihe atọ ego na-agaghị azụtali.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 12.