Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Ọktoba 1
“O nwere Ụlọ Nche anyị ga-achọ ka ị gụọ. Legodị ihe isiokwu ya kwuru. [Gosi ya ihu ya.] Ụfọdụ ndị na-ekwu na e nweghị uru ikpe ekpere bara n’ihi na ha chere na o nweghị onye na-aza ekpere. Ma, e nwere ndị na-ekwu na Chineke na-aza ha ekpere. Gịnị ka gịnwa chere? [Chere ka ọ zaa.] Ka anyị gụọ Baịbụl mara ma ò nwere onye na-aza ekpere anyị. [Gụọ Aịzaya 30:19.] Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịmata na Chineke na-aza ekpere anyị ma anyị kpee ya otú ọ chọrọ.”
Teta! Septemba–Ọktoba
“E nwere isiokwu dị́ na Teta! a nke ga-enyere anyị aka ka anyị na-anabata mmadụ ibe anyị. [Gosi ya isiokwu dị́ na peeji nke 14.] Olee otú ịhụnanya ga-esi na-enyere anyị aka ịnabata ndị ọzọ? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ọmarịcha ihe Baịbụl kwuru gbasara ịhụnanya. [Gụọ 1 Pita 4:8.] Ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ eme ihe a Baịbụl kwuru, anyị ga-enwe ike ịna-anabata ndị ọzọ n’agbanyeghị na ha ezughị okè.”