AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 25-28
Nwee Obi Ike Dị Ka Jeremaya
Jeremaya kwuru na Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu dị ka Shaịlo
O nwere mgbe igbe ọgbụgba ndụ Jehova dị na Shaịlo, nke na-egosi na Jehova nọ n’etiti ndị ya
Jehova kwere ka ndị Filistia buru igbe ọgbụgba ndụ ahụ laa, e bughachighịkwa ya ọzọ na Shaịlo
Ndị nchụàjà, ndị amụma na ndị niile bi na Juda nọ na-achọ igbu Jeremaya
Ha jidere Jeremaya n’ihi amụma o buru megide Jeruselem na ụlọ nsọ ya
Ụjọ emeghị ka Jeremaya gbalaga
Jehova chebere Jeremaya
Jeremaya nọgidere na-enwe obi ike, Jehova agbahapụghịkwa ya
Chineke ji nwoke nwere obi ike bụ́ Ahaịkam chebe Jeremaya
Enyemaka na agbamume Jehova nyere Jeremaya mere ka o nwee ike ịdọ ndị Juda aka ná ntị ruo afọ 40