Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kr isi 17 p. 182-191
  • Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke
  • Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “M Na-ekwu Ihe Ndị A Dị Nnọọ Ka Nna M Kụziiri M”
  • A Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-ezi Ozi Ọma
  • Otú E Si Azụ Ụmụnna Nwoke Ka Ha Nwee Ike Ịrụ Ọrụ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova
  • Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Chineke—Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Olee Otú E Si Azụ Ndịàmà Jehova Maka Ozi Ọma Ha Na-ekwusa?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ị̀ Na-erite Uru n’Ihe Jehova Na-akụziri Anyị?
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
kr isi 17 p. 182-191

ISI NKE 17

Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú e si jiri ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova na-azụ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ka ha na-eje ozi ha nke ọma

1-3. Olee otú Jizọs si hazie ka e kwusaa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ? Oleekwa ajụjụ ụfọdụ nwere ike ịgbata anyị n’obi?

JIZỌS ji afọ abụọ zie ozi ọma n’ebe niile na Galili. (Gụọ Matiu 9:35-38.) Ọ gara n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ kụzikwaara ndị mmadụ ihe n’ụlọ nzukọ ndị dị ebe ahụ. N’ebe ọ bụla Jizọs gara izi ozi ọma, ìgwè mmadụ na-agbakọta gee ya ntị. Ọ bụ ya mere o ji kwuo na “ihe ubi hiri nne,” nakwa na a chọkwuru ndị ọrụ.

2 Jizọs haziri ka e kwusaa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ. Olee otú o si mee ya? O zipụrụ ndịozi ya iri na abụọ “ka ha gaa kwusaa alaeze Chineke.” (Luk 9:1, 2) Ọ ga-abụ na ndịozi Jizọs nọ na-eche otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma a Jizọs sị ha kwusawa. Ma, tupu Jizọs ezipụ ha, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi mee ya. Otú a Jizọs si kụziere ha ihe ka Jehova sikwa kụziere Jizọs.

3 E nwere ajụjụ ụfọdụ nwere ike ịgbata anyị n’obi ugbu a. Ha bụ: Olee ihe Jehova kụziiri Jizọs? Oleekwa ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya? Eze anyị bụ́ Mesaya, ọ̀ na-akụziri anyịnwa ihe taa ka anyị nwee ike ịna-eje ozi anyị nke ọma? Ọ bụrụ na ọ na-akụziri anyị ihe, olee otú o si eme ya?

“M Na-ekwu Ihe Ndị A Dị Nnọọ Ka Nna M Kụziiri M”

4. Olee mgbe Jehova kụziiri Jizọs ihe? Oleekwa ebe Jizọs nọ Jehova akụziere ya ihe ahụ?

4 Jizọs kwuru hoo haa na Nna ya kụziiri ya ihe. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ sịrị: “M na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” (Jọn 8:28) Olee mgbe Jehova kụziiri Jizọs ihe? Oleekwa ebe Jizọs nọ Jehova akụziere ya ihe ahụ? Ọ dị ka ọ̀ bụ ozugbo Chineke kere Jizọs bụ́ Ọkpara ya, ka o bidoro kụziwere ya ihe. (Kọl. 1:15) Ọkpara Chineke na Nna ya nọrọ n’eluigwe ọtụtụ afọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ. O ji oge ahụ na-ege Nna ya, bụ́ “Onye Ozizi Ukwu,” ntị ma na-ahụ otú o si eme ihe. (Aịza. 30:20) Jizọs si otú ahụ mụta àgwà nna ya, ihe ndị nna ya na-eme, na ihe ndị bụ́ nzube nna ya. Ihe ndị a ọ mụtara enweghị atụ.

5. Gịnị ka Jehova kụziiri Ọkpara ya nke ga-enyere ya aka n’ozi ọ ga-eje n’ụwa?

5 Jehova mechakwara kụziere Ọkpara ya otú ọ ga-esi jee ozi ya n’ụwa. Lebagodị anya n’ihe Aịzaya kwuru banyere otú Onye Ozizi Ukwu ahụ na Ọkpara ya si emekọ ihe. (Gụọ Aịzaya 50:4, 5.) Aịzaya kwuru na Jehova ‘na-akpọte Ọkpara ya kwa ụtụtụ.’ Ihe atụ a dị ka ebe onye nkụzi na-akpọte nwa akwụkwọ ya n’isi ụtụtụ ka ọ kụziere ya ihe. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru, sị: ‘E nwere ike ịsị na Jehova na-akpọrọ Jizọs kụziere ya ihe, otú ahụ onye nkụzi si akụziri nwa akwụkwọ ya ihe n’ụlọ akwụkwọ. Jehova kụziiri Jizọs ihe ọ ga-akụziri ndị mmadụ na otú ọ ga-esi akụziri ha ihe ndị ahụ.’ Mgbe Jehova na-akụziri Jizọs ihe n’eluigwe, ọ kụziiri ya ‘ihe ọ ga-akọ na ihe ọ ga-ekwu.’ (Jọn 12:49) Jehova gwara Ọkpara ya otú ọ ga-esi akụziri ndị mmadụ ihe.a N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ihe ndị ahụ Nna ya kụziiri ya nyeere ya aka ije ozi ya nke ọma. O nyekwaara ya aka ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-eje ozi ha nke ọma.

6, 7. (a) Olee ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya? Oleekwa otú ihe a ọ kụziiri ha si nyere ha aka? (b) Olee ihe Jizọs na-akụziri anyị taa?

6 Ka anyị leba anya ugbu a n’ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya. Na Matiu isi iri, Jizọs gwara ha otú ha ga-esi eje ozi ha. Ihe ụfọdụ ọ gwara ha bụ: ebe ha ga-ezi ozi ọma (amaokwu nke 5 na nke 6), ihe ha ga-ezi ndị mmadụ (amaokwu nke 7). Ọ gwakwara ha ka ha tụkwasị Jehova obi (amaokwu nke 9 na nke 10), ihe mbụ ha ga-agwa ndị ha chọrọ izi ozi ọma (amaokwu nke 11 ruo na nke 13), ihe ha ga-eme ma a jụ ige ha ntị (amaokwu nke 14 na nke 15), nakwa ihe ha ga-eme ma a kpagbuwe ha (amaokwu nke 16 ruo na nke 23).b Ihe ndị a Jizọs kụziiri ndịozi ya nyeere ha aka n’oge ahụ ịhazi otú e si ekwusa ozi ọma.

7 N’oge anyị a kwa, Jizọs, bụ́ Eze nke Alaeze Chineke, gwara anyị kwusaa “ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” Ozi ọma a ọ gwara anyị na-ekwusa kacha ihe ọ bụla ọzọ mkpa. (Mat. 24:14) Eze anyị a ọ̀ kụzierela anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma a? Ee. Ọ nọ n’eluigwe na-ahụ na a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ezi ndị nọ n’ebe dị iche iche ozi ọma. Ọ na-ahụkwa na a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ anyị n’ọgbakọ.

A Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-ezi Ozi Ọma

8, 9. (a) Olee ihe kacha mkpa mere e ji malite inwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? (b) Olee otú ọmụmụ ihe etiti izu sirila nyere gị aka izi ozi ọma nke ọma?

8 Kemgbe ọtụtụ afọ, nzukọ Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. A na-akụziri anyị ihe a ná mgbakọ anyị dị iche iche, nakwa n’ọmụmụ ihe. Nzukọ Ije Ozi so n’ọmụmụ ihe ndị a. Ma, malite n’ihe dị ka afọ 1941, ụmụnna ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị na-ahazi ọrụ anyị bidoro ịhazi ụlọ akwụkwọ dị iche iche a na-anọ akụziri anyị ihe.

9 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. N’isi nke iri na isii n’akwụkwọ a, anyị kwuru na a malitere inwe ụlọ akwụkwọ a n’afọ 1943. Ihe mere e ji malite ya ọ̀ bụ naanị ka a kụziere anyị otú anyị ga-esi na-ekwu okwu nke ọma n’ọgbakọ? Mba. Ihe kacha mkpa mere e ji malite inwe ụlọ akwụkwọ a bụ iji kụziere anyị otú anyị nwere ike isi zie ndị mmadụ ozi ọma, nke bụ́kwanụ otu ụzọ anyị si eto Jehova. (Ọma 150:6) Ụlọ akwụkwọ a na-enyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ na ya aka ka ha na-ekwusa ozi ọma nke ọma.

10, 11. Olee ndị a na-akpọ taa ka ha gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied? Olee ihe mere e ji enwe ya?

10 Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ụlọ akwụkwọ a malitere n’abalị mbụ nke ọnwa Febụwarị afọ 1943. Ihe e bu n’obi malite ụlọ akwụkwọ a bụ ịzụ ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile ka ha bụrụ ndị ozi ala ọzọ. Ma, kemgbe Ọktoba afọ 2011, ọ bụ naanị ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha, ndị na-eje ozi na Betel, na ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị ụlọ akwụkwọ a ka a na-azụ na ya.

11 Olee ihe e bu n’obi na-akụzi ihe ndị a na-akụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied? Otu nwanna nwoke na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ a kemgbe ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ọ bụ iji mee ka ndị bịara ụlọ akwụkwọ a mụọ Okwu Chineke nke ọma ka okwukwe ha sikwuo ike. Ọ bụkwa iji nyere ha aka ịna-akpa àgwà ndị ga-eme ka ha nọsie ike n’ozi ha n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ịbịara ha. Ihe ọzọkwa bụ ka e mee ka ikwusa ozi ọma na-agụsi ha agụụ ike.”—Efe. 4:11.

12, 13. Olee ike Ụlọ Akwụkwọ Gilied kparala n’ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile? Nye ihe atụ.

12 Olee ike Ụlọ Akwụkwọ Gilied kparala n’ozi ọma a anyị na-ezi n’ụwa niile? Kemgbe afọ 1943 e bidoro ụlọ akwụkwọ a, a zụọla ihe karịrị puku mmadụ asatọ na narị mmadụ ise na ya.c Ndị ozi ala ọzọ a zụrụla n’ụlọ akwụkwọ a na-eje ozi n’ihe karịrị otu narị mba na iri asaa. Ndị ozi ala ọzọ na-eme ihe a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ a. Ha na-ekwusasi ozi ọma ike, na-enyekwara ụmụnna ndị ọzọ aka ka ha na-eme otú ahụ. Ọ bụ ndị ozi ala ọzọ na-ahazi ozi ọma a na-ezi n’ọtụtụ ebe a na-enweghị ndị nkwusa ma ọ bụkwanụ n’ebe e nwere ndị nkwusa ole na ole.

13 Ụdị ihe a mere na Japan mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. N’oge ahụ, ụmụnna ndị bi n’obodo a kwụsịrị ịga ozi ọma. N’ihe dị ka Ọgọst afọ 1949, ndị nkwusa e nwere na Japan erughị mmadụ iri. Ma tupu afọ ahụ agwụ, e nweela ndị ozi ala ọzọ iri na atọ a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied nọ na-ekwusasi ozi ọma ike na Japan. E mechakwara zitekwuo ndị ozi ala ọzọ na Japan. Mgbe ha malitere ozi na Japan, ọ bụ naanị n’obodo ndị mepere emepe ka ha na-ekwusa ozi ọma. Ha mechakwara gawa n’obodo ndị ọzọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agbasi ndị ha na-amụrụ Baịbụl ume ike ka ha jisie ike banye n’ozi oge niile ma ha mee baptizim. Ha na-agbakwa ụmụnna ha ume ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Mbọ niile a ndị ozi ala ọzọ gbara na Japan efughị ọhịa. Ndị nkwusa e nwere taa na Japan karịrị narị puku abụọ na puku iri na isii. Ihe dị ka ndị nkwusa abụọ n’ime ndị nkwusa ise ọ bụla e nwere na Japan taa bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile.d

14. Gịnị ka ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova na-egosi? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Ji Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma.”)

14 Ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova. Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye, na Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị na-enyere ndị gara ha aka ka ha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ na-enyekwara ha aka iji ozi ọma kpọrọ ihe.e Ụlọ akwụkwọ a niile e nwere ná nzukọ Jehova na-egosi na Eze anyị enyela anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ije ozi anyị nke ọma.—2 Tim. 4:5.

Otú E Si Azụ Ụmụnna Nwoke Ka Ha Nwee Ike Ịrụ Ọrụ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova

15. Olee otú ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ga-esi na-eme ka Jizọs?

15 Ì chetara ihe ahụ Aịzaya kwuru banyere otú Chineke si kụziere Jizọs ihe? Jizọs mụtara ‘otú ọ ga-esi aza onye ike gwụrụ okwu,’ n’oge ahụ Chineke kụziiri ya ihe. (Aịza. 50:4) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe a a kụziiri ya. O mere ka ‘ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ’ nweta ume. (Mat. 11:28-30) Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịkwara ime ka ahụ́ na-eru ụmụnna ha ala. Ọ bụ ya mere nzukọ Jehova ji hazie ụlọ akwụkwọ dị iche iche ga-enyere ha aka ijere ụmụnna ha ozi nke ọma.

16, 17. Olee ihe mere e ji enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

16 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ụlọ akwụkwọ a malitere n’abalị itoolu n’ọnwa Mach afọ 1959. Ebe a nọ nwee klas nke mbụ ya bụ na Saụt Lansịn, dị na Niu Yọk. Ndị gara ya bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ohu ọgbakọ. Ụlọ akwụkwọ a na-ewe otu ọnwa n’oge ahụ. Ọ bụ asụsụ Bekee ka e ji kụziere ndị niile bịara ya ihe. Ma, e mechara na-enwe ya n’asụsụ ndị ọzọ. E mechakwara nwewe ya n’ụwa niile.f

Ebe Nwanna Lloyd Barry na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Japan n’afọ 1970

Ebe Nwanna Lloyd Barry na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze e nwere na Japan n’afọ 1970

17 Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 1962 (nke Bekee), kwuru ihe mere e ji enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ọ sịrị: “N’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị enwe ohere, okenye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova kwesịrị ịbụ onye na-ahazi ihe ndị ọ na-eme ka o nwee ike ilebara ndị niile nọ n’ọgbakọ anya ma na-enyere ha aka. O kwesịkwara ịna-elekọta ezinụlọ ya anya nke ọma n’agbanyeghị ọrụ ndị ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ụlọ akwụkwọ a bụ ezigbo ihe ọma e meere ndị ohu ọgbakọ n’ụwa niile. Ha na-amụta otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma otú ahụ Baịbụl kwuru ka ha na-arụ ọrụ ha.”—1 Tim. 3:1-7; Taị. 1:5-9.

18. Olee otú Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze si abara ndị Chineke niile uru?

18 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze abaarala ndị Chineke niile uru. Olee otú o si baara ha uru? Mgbe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-eme ihe a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ a, ha na-eme ka ụmụnna ha nwee ume otú ahụ Jizọs mere. Obi ọ́ naghị atọ gị ụtọ ma okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi gwa gị okwu ọma, ma gee gị ntị mgbe ị na-akọrọ ya mkpa gị? Obi ọ́ naghịkwa atọ gị ụtọ ma okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi bịa na nke gị ma gbaa gị ume? (1 Tesa. 5:11) O doro anya na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-abara ọgbakọ ha uru.

19. Olee ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ Kọmitii Izi Ihe na-ahazi? Oleekwa ihe mere e ji enwe ụlọ akwụkwọ ndị ahụ?

19 Ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova. Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi na-ahụ maka ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ e ji azụ ụmụnna nwoke na-arụ ọrụ dị iche iche n’ọgbakọ Jehova. A malitere ụlọ akwụkwọ ndị a ka e jiri ha zụọ ndị so na Kọmitii Alaka, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị okenye ọgbakọ ka ha na-arụ ọrụ ha nke ọma. Ihe ndị e ji Baịbụl na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ ndị a na-enyere ha aka iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ na-enyekwara ha aka ilekọta atụrụ Jehova nke ọma otú ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru. Atụrụ ndị a ha na-elekọta dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova.—1 Pita 5:1-3.

Ụmụ akwụkwọ mbụ a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Malawi

Ihe a bụ klas nke mbụ nke Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi e nwere na Malawi n’afọ 2007

20. Gịnị mere Jizọs ji kwuo na anyị niile bụ “ndị Jehova kụziiri ihe?” Olee ihe i kpebisiri ike ime?

20 O doro anya na Eze anyị bụ́ Mesaya na-ahụ na a na-akụziri anyị ihe nke ọma. Ihe a niile a na-akụziri anyị si n’aka Jehova n’ihi na ọ bụ ya kụziiri Ọkpara ya ihe, Ọkpara ya ana-akụzikwara anyị. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị na anyị niile bụ “ndị Jehova kụziiri ihe.” (Jọn 6:45; Aịza. 54:13) Eze anyị na-akụziri anyị ihe ma n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ma n’ọmụmụ ihe ndị ọzọ anyị na-enwe n’ọgbakọ, ma n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a. Ka anyị niile kpebisie ike ịna-eme ihe niile a na-akụziri anyị na ha. Ka anyị cheta na ihe mere e ji na-akụziri anyị ihe ndị a karịchaa bụ ka okwukwe anyị bụrụ a kwaa akwụrụ, nakwa ka anyị nwee ike ije ozi anyị nke ọma.

a Olee otú anyị si mara na Chineke kụziiri Ọkpara ya otú ọ ga-esi akụziri ndị mmadụ ihe? Chebara ihe a echiche: Jizọs ji ọtụtụ ihe atụ kụzie ihe. E buru amụma ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ ya na ọ ga-eme ihe a. (Ọma 78:2; Mat. 13:34, 35) O doro anya na Jehova, bụ́ onye amụma ahụ si n’aka, kwuru ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Ọkpara ya na Ọkpara ya ga-eji ihe atụ ma ọ bụ ilu kụziere ndị mmadụ ihe.—2 Tim. 3:16, 17.

b Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara, Jizọs “họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ ma zipụ ha abụọ abụọ” ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ọ kụzikwaara ha otú ha ga-esi eme ya.—Luk 10:1-16.

c Ụfọdụ ndị a kpọrọ ka ha bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied agaala ya mbụ.

d Ị chọọ ịmatakwu otú ndị ozi ala ọzọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilied sirila kpaa ike n’ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile, gụọ isi nke 23 n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom.

e Ihe a na-akpọzi Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye na Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.

f Ndị okenye niile na-agazi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Abalị ole ụlọ akwụkwọ a na-ewe n’otu oge, nwere ike ịdị iche n’oge ọzọ. Ọ na-abụkwa a nọọ afọ ole na ole, a gaa ya. Ndị ohu na-eje ozi malitere ịga ụlọ akwụkwọ a kemgbe afọ 1984.

Ì Kwetasiri Ike na Alaeze Chineke Bụ Ọchịchị Dị Adị?

  • Olee ihe Jehova kụziiri Jizọs?

  • Olee otú Eze anyị sirila kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe ka ha nwee ike izi ozi ọma nke ọma?

  • Olee otú e sirila zụọ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ka ha nwee ike ịna-arụ ọrụ ha nke ọma?

  • Olee otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe niile Eze anyị na-akụziri anyị?

ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ E JI AZỤ NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA

OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Iji nyere ndị nkwusa aka ka ha bụrụ aka ochie n’izi ozi ọma na ịkụzi Baịbụl.

Oge A Na-agụru Ya: A naghị agụcha ya agụcha.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ndị A Na-edebanye Aha Ha: Ndị na-abịachi ọmụmụ ihe anya, ndị kwetara ihe Baịbụl na-akụzi, ma na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ. Ị chọọ ideba aha gị, gwa onye nlekọta ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ.

Uru Ọ Na-aba: Ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ na-akụziri anyị otú e si eme nchọnchọ na otú e si ekwu okwu ya edoo ndị mmadụ anya. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-ege ndị ọzọ ntị ma ha na-ekwu okwu nakwa otú anyị ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka ka ha na Chineke dị ná mma, ọ bụghị naanị ime ka okwukwe anyị sie ike.”

Arnie bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị sịrị: “Abụ m onye nsụ, ọ na-esikwara m ike ile ndị ọzọ anya n’ihu ma m na-agwa ha okwu. Ma, ụlọ akwụkwọ a enyerela m aka inwe obi ike, meekwa ka m ghọta na m bara uru. Jehova ejirila ya nyere m aka ịmụta otú m ga-esi na-ekwu okwu ghara ịna-eku ume ọkụ ọkụ, na otú m ga-esi mee ka uche m na-adị n’ihe a na-ekwu. M na-ekele Chineke maka ime ka m nwee ike na-eto ya ma n’ọgbakọ ma n’ozi ọma.”

Ebe obere onye nkwusa na-agụ Baịbụl n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ OKENYE ỌGBAKỌg

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: A na-akụziri ndị okenye otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha nke ọma, meekwa ka ha ghọtakwuo ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme.

Oge Ọ Na-ewe: Ụbọchị ise.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya. Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị okenye mgbe ha ga-aga ya.

Uru Ọ Na-aba: Ụfọdụ ndị gara klas nke iri itoolu na abụọ na Patasịn dị na Niu Yọk, n’Amerịka sịrị:

“Ụlọ akwụkwọ a baara m uru. O nyerela m aka ileru onwe m anya na ịmata otú m nwere ike isi na-elekọta atụrụ Jehova.”

“Agaghị m echefu ihe a kụziiri m n’ụlọ akwụkwọ a echefu.”

ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Iji kụziere ndị ọsụ ụzọ otú ha ga-esi “jezuo ozi” ha.—2 Tim. 4:5.

Oge Ọ Na-ewe: Abalị isii.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a na-anọ enwe ya. Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ndị Na-aga ya: Ndị sụrụla ụzọ oge niile ruo otu afọ ma ọ bụ karịa. Ọ bụ onye nlekọta sekit na-agwa ha mgbe ha ga-aga ya. A na-akpọkwa ndị ọsụ ụzọ nọrurula afọ ise kemgbe ha gara nke ikpeazụ ka ha gaa ọzọ.

Uru Ọ Na-aba: Nwanna Nwaanyị Lily sịrị: “Ụlọ akwụkwọ a enyerela m aka imeri nsogbu ndị m na-enwe n’ozi ọma nakwa ná ndụ m. Amụtakwuola m otú e si amụ ihe, otú e si akụzi ihe, na otú e si akọwa Baịbụl. O meela ka m nwee ike ịna-enyere ndị ọzọ aka, na-akwado ndị okenye, na-enyekwa aka ka ndị ọzọ na-abatakwu n’ọgbakọ.”

Nwanna Nwaanyị Brenda garala ụlọ akwụkwọ a ugboro abụọ, kwuru, sị: “Ụlọ akwụkwọ a mere ka m jirikwuo ofufe Jehova kpọrọ ihe, mee ka akọnuche m na-arụ ọrụ nke ọma, ma jirikwuo oge m na-enyere ndị ọzọ aka. O doola m anya na Jehova na-emesapụ aka.”

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ BỊARA BETEL ỌHỤRỤ

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Iji nyere ndị bịara Betel ọhụrụ aka ka ha nwee ike ime nke ọma n’ọrụ ha na-arụ na Betel.

Oge Ọ Na-ewe: Abalị anọ. A na-eji awa anọ kwa ụbọchị akụziri ndị na-aga ya ihe.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ bụ na Betel.

Ndị Na-aga Ya: Ndị Betel nakwa ndị ọzọ a kpọrọ ka ha rụọ ọrụ na Betel ruo otu afọ ma ọ bụ karịa.

Uru Ọ Na-aba: Nwanna Demetrius gara ụlọ akwụkwọ a n’ihe dị ka afọ 1982. Ọ sịrị: “Amụtara m ịmụ ihe nke ọma, mụtakwa ihe nyeere m aka ije ozi na Betel ruo ọtụtụ afọ. Otú ndị nkụzi anyị si kụziere anyị ihe, na ihe ndị ha kụziiri anyị, nakwa ezigbo ndụmọdụ e nyere anyị mere ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya nakwa na ọ chọrọ ka ihe gaziere m n’ozi m na-eje na Betel.”

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA ALAEZEh

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Iji zụọ ndị ozi oge niile (ma ndị di na nwunye, ma ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị, ma ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di) ka ha jekwuoro Jehova na nzukọ ya ozi. Ha gụchaa, a na-eziga ọtụtụ n’ime ha n’ebe e nwere mkpa ná mba ha. E nwere ike ịhọpụta ụfọdụ ndị na-erubeghị afọ iri ise ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge. A na-ezigakwa ha n’ime ime obodo.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a ga-anọ enwe ya. Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Ebe nwanna nwaanyị nọ n’ozi ọma

Ihe Jehova na-akụziri anyị na-abara anyị niile uru

Ndị Na-aga Ya: Ndị ozi oge niile nọ n’agbata afọ iri abụọ na atọ na afọ iri isii na ise, ma ndị nke lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ma ndị nke na-alụbeghị. Ha ga-abụ ndị ahụ́ gbasiri ike, ndị nwekwara mmasị ije ozi n’ebe e nwere mkpa. Ha ga-enwekwa ụdị àgwà Aịzaya nwere, bụ́ onye sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8) Ha ga-abụ ndị jerela ozi oge niile ruo afọ abụọ n’akwụsịghị akwụsị. Ndị bụ́ di na nwunye ga-abụrịrị ndị lụrụla ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala. Ndị nwoke ga-abụrịrị ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi jerela ozi ruo afọ abụọ ma ọ dịkarịa ala n’akwụsịghị akwụsị. Ná mba ọ bụla ụlọ akwụkwọ a maliterela, a na-enwe nzukọ maka ndị chọrọ ịga ya ná mgbakọ ukwu.

Uru Ọ Na-aba: E nwere okwu ọma ụmụnna kwuru gbasara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị nakwa Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye. Ndị kwuru ha bụ ndị garala ụlọ akwụkwọ ndị a. N’afọ 2013, Òtù Na-achị Isi bukọtara ụlọ akwụkwọ abụọ a ọnụ ma kpọọ ya Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ọ ga-abara ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ uru, ma ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di.

ỤLỌ AKWỤKWỌ GILIED

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: E nwere ike iziga ndị gara ya ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ha abụrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụkwanụ ndị Betel. Ha na-enye aka eme ka e zisiwe ozi ọma ike n’ebe e zigara ha, na-enyekwa aka ahazi ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa ise.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, nke dị na Niu Yọk.

Ebe ụmụ akwụkwọ Gilied nọ na klas na-ege onye nkụzi ha ntị

Ihe a bụ klas Ụlọ Akwụkwọ Gilied dị na Patasịn, nke dị na Niu Yọk

Ndị Na-aga Ya: Ndị di na nwunye, ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị, ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di. Ha ga-abụrịrị ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche. Ndị ọzọ bụ ndị ozi ala ọzọ na-agabeghị ụlọ akwụkwọ a, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha, nakwa ndị Betel. Kọmitii Alaka na-agwa ụmụnna ndị a ka ha dejupụta akwụkwọ ịga ya. Ha ga-abụ ndị na-asụ Bekee nke ọma, na-agụ ya ma na-ede ya.

Uru Ọ Na-aba: E nwere di na nwunye bụ́ ndị Amerịka kwuru banyere ụlọ akwụkwọ a. Aha ha bụ Lade na Monique. Ha ejeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ.

Lade kwuru, sị: “Ụlọ Akwụkwọ Gilied mere ka anyị jikere ịga ebe ọ bụla n’ụwa ma soro ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya jee ozi.”

Monique kwuru, sị: “Ka m na-eme ihe ndị m mụtara n’Okwu Chineke, m na-enwe ọṅụ n’ozi m. Aghọtara m na ọṅụ a m na-enwe gosiri na Jehova hụrụ m n’anya.”

ỤLỌ AKWỤKWỌ IJE OZI ALAEZE

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Ịkụziri ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha. (Ọrụ 20:28) A na-eleba anya n’ihe ndị na-eme n’ọgbakọ na nsogbu ọgbakọ na-enwe. A na-enwe ya mgbe ọ bụla Òtù Na-achị Isi kwuru ka e nwee ya.

Oge Ọ Na-ewe: Malite n’afọ ole na ole gara aga, abalị ole ụlọ akwụkwọ a na-ewe na-adị iche iche.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Ọ na-abụkarị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ.

Otú E Si Edenye Aha: Onye nlekọta sekit na-agwa ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi mgbe ha ga-aga ya. Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mgbe ha ga-aga nke ha.

Uru Ọ Na-aba: Nwanna Quinn sịrị: “N’agbanyeghị na a na-eji ụbọchị ole na ole akụzi ọtụtụ ihe n’ụlọ akwụkwọ a, ọ na-enyere ndị okenye aka iji obi ụtọ arụ ọrụ ha. Ọ na-emekwa ka ha na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Ma ndị okenye ọhụrụ ma ndị bụrụla okenye ọtụtụ afọ na-amụta otú e si azụ atụrụ Chineke nke ọma. Ọ na-emekwa ka ndị okenye dịrị n’otu n’ihe ọ bụla ha na-eme.”

Nwanna Michael kwuru, sị: “A kụziiri anyị otú anyị ga-esi ghọta ihe ndị ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sie ike, na otú anyị ga-esi zere ihe ndị nwere ike imebi okwukwe anyị, nakwa otú anyị ga-esi na-azụ ìgwè atụrụ Chineke.”

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ NLEKỌTA SEKIT NA NWUNYE HAi

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Iji kụziere ndị nlekọta sekit otú ha ga-esi na-eleta ọgbakọ nke ọma ma “na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.”—1 Tim. 5:17; 1 Pita 5:2, 3.

Oge Ọ Na-ewe: Otu ọnwa.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: Alaka ụlọ ọrụ na-ekpebi ebe a na-anọ enwe ya.

Otú E Si Edenye Aha: Alaka ụlọ ọrụ na-agwa ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha mgbe ha ga-aga ya.

Uru Ọ Na-aba: Nwanna Joel na Connie nwunye ya gara klas nke mbụ n’afọ 1999. Ha sịrị: “E mere ka anyị ghọtakwuo otú anyị ga-esi na-akwanyere Jizọs bụ́ onyeisi nzukọ Jehova ùgwù. Anyị mụtara na anyị kwesịrị ịna-agba ụmụnna ndị anyị na-elekọta ume, na-emekwa ka ọgbakọ ọ bụla anyị letara dịrị n’otu. Ụlọ akwụkwọ a nyekwaara anyị aka ịghọta na n’agbanyeghị na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-adụ ụmụnna ọdụ ma na-agbazi ha mgbe ụfọdụ, ihe kacha mkpa ha na-arụ bụ inyere ụmụnna ha aka ịghọta na Jehova hụrụ ha n’anya.”

ỤLỌ AKWỤKWỌ MAKA NDỊ KỌMITII ALAKA NA NWUNYE HA

Ihe Mere E Ji Enwe Ya: Iji kụziere ndị so na Kọmitii Alaka otú ha ga-esi na-elekọta Betel, na-eleba anya ná nsogbu ọgbakọ dị iche iche na-enwe n’ihe gbasara ozi ọma, nakwa otú ha ga-esi na-elekọta sekit dị iche iche.—Luk 12:48b.

Oge Ọ Na-ewe: Ọnwa abụọ.

Ebe A Na-anọ Enwe Ya: N’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, nke dị na Niu Yọk.

Otú E Si Edenye Aha: Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi na-agwa ndị so na Kọmitii Alaka ma ọ bụ ndị so na Kọmitii Na-elekọta Mba na ndị nwunye ha mgbe ha ga-aga.

Uru Ọ Na-aba: Nwanna Lowell na Cara nwunye ya gara klas nke iri abụọ na ise. Ha na-eje ozi ugbu a na Naịjirịa.

Nwanna Lowell sịrị: “Ụlọ akwụkwọ a chetaara m na n’agbanyeghị ụdị ọrụ e nyere m ma ọ bụ otú m si jiri ọrụ n’aka, ihe kacha amasị Jehova bụ ime ihe ọ chọrọ.”

Nwanna Nwaanyị Cara kwuru otu ihe ọ mụtara n’ụlọ akwụkwọ a. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ agaghị akọwali ihe otú ọ ga-edo anya, m kwesịrị ịmụ ya nke ọma tupu mụ akụziwere ya ndị ọzọ.”

g A malitebeghị inwe ụlọ akwụkwọ a ná mba niile.

h A malitebeghị inwe ụlọ akwụkwọ a ná mba niile.

i A malitebeghị inwe ụlọ akwụkwọ a ná mba niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya