Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 13 p. 154-167
  • “Jehova Emewo Ihe O bu n’Obi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Jehova Emewo Ihe O bu n’Obi”
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ MERE OBI JI SIE YA IKE NA Ọ GA-EMEZU?
  • AMỤMA NDỊ JEREMAYA BURU MA HỤ MGBE HA MEZURU
  • AMỤMA NDỊ MEZURU MGBE OGE JEREMAYA GACHARA
  • AMỤMA NDỊ GBASARA GỊ
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ị̀ Na-ajụ Kwa Ụbọchị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 13 p. 154-167

ISI NKE IRI NA ATỌ

“Jehova Emewo Ihe O bu n’Obi”

1. Mgbe e bibichara Jeruselem, gịnị ka Jeremaya kwuru banyere amụma ndị Jehova buru?

WEREGODỊ anya nke uche gị hụ mgbe e bibiri Jeruselem. Ndị Babịlọn meriri ya, gbaa ya ọkụ, anwụrụ ọkụ si na ya ana-akwụ. Jeremaya chetara mkpu ákwá ndị mmadụ na-eti mgbe a na-egbu ha. Chineke ebula ụzọ gwa ya ihe ga-emenụ. Ha niile mezukwara. Onye amụma ahụ sụrụ ude kwuo, sị: “Jehova emewo ihe o bu n’obi.” Ọdịda Jeruselem bụ ọdachi n’ezie!—Gụọ Abụ Ákwá 2:17.

2. Olee amụma e buru kemgbe ọtụtụ narị afọ nke Jeremaya hụrụ mgbe o mezuru?

2 N’eziokwu, Jeremaya hụrụ mgbe ọtụtụ ihe Chineke bu ụzọ gwa ndị ya mezuru, tinyere ndị ọ gwara ha n’oge ochie. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Mozis gwara ụmụ Izrel na ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi, ha ga-enweta “ngọzi” ya, gwakwa ha na ọ bụrụ na ha enupụrụ ya isi, ha ga-enweta “nkọcha.” Jehova na-echere ndị ya echiche ọma, ya bụ na ọ chọrọ ka ha nweta ngọzi. Ma, nkọcha ha ga-enweta ma ha nupụ isi ga-ajọgbu onwe ya. Mozis dọrọ ha aka ná ntị na ndị na-egeghị Jehova ntị nakwa ndị na-emegide ya ‘ga-eri anụ ụmụ ha ndị ikom na anụ ụmụ ha ndị inyom.’ Jeremaya mechara gwa ha otu ihe ahụ. (Diut. 30:19, 20; Jere. 19:9; Lev. 26:29) O nwere ike ịbụ na ụfọdụ nọ na-eche, sị: ‘Ụdị ihe ahụ jọgburu onwe ya ò nwere ike ime eme?’ O mere n’eziokwu mgbe ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, nke mere ka nri gwụ n’obodo ahụ. Jeremaya kọrọ ihe merenụ, sị: “Ndị inyom nwere ọmịiko ejiriwo aka ha sie ụmụ ha. Ha aghọọla nri ngụgụ obi n’oge e bibiri ada bụ́ ndị m.” (Abụ Ákwá 4:10.) Ọ bụ ọdachi jọgburu onwe ya!

3. Gịnị mere Chineke ji zigara ndị ya ndị amụma?

3 N’eziokwu, ihe mere Jehova ji zigara ndị ya ndị amụma dị ka Jeremaya abụghị naanị ka ha buo amụma na mbibi na-abịa. Chineke chọrọ ka ndị ya maliteghachi irubere ya isi. Ọ chọrọ ka ndị mmehie chegharịa. Ọ bụ ya mere Ezra ji kwuo, sị: “Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha wee na-ezigara ha ndị ozi ya ka ha dọọ ha aka ná ntị, o zigara ha ugboro ugboro, n’ihi na o nweere ndị ya ọmịiko, nweekwa ọmịiko maka ebe obibi ya.”—2 Ihe 36:15; gụọ Jeremaya 26:3, 12, 13.

Foto dị na peeji nke 154

4. Olee otú ozi ahụ Jeremaya ziri ndị Juu mere ka obi dị ya?

4 Jeremaya nweere ndị ya ọmịiko otú ahụ Jehova nweere ha. Ihe o kwuru tupu e bibie Jeruselem gosiri na ọ bụ eziokwu. Ọdachi ahụ na-abịanụ churu ya ụra. Naanị ihe ga-eme ka ọ ghara ịdakwasị ha bụ ige ntị n’ozi Jeremaya ziri ha na ime ihe o kwuru! Chegodị otú obi dị Jeremaya ka ọ na-ezi ha ozi Chineke. O tiri mkpu, sị: “Eriri afọ m, eriri afọ m! Obi na-egbusi m mgbu ike. Obi m na-agba ghara ghara. Apụghị m ịgbachi nkịtị, n’ihi na mkpụrụ obi m anụwo ụda opi, ya bụ, opi agha.” (Jere. 4:19) Ọ gbachighị nkịtị na-eche ọdachi ahụ na-abịanụ.

GỊNỊ MERE OBI JI SIE YA IKE NA Ọ GA-EMEZU?

5. Gịnị mere obi ji sie Jeremaya ike na ozi o ziri ndị Juu ga-emezu?

5 Gịnị mere obi ji sie Jeremaya ike na ihe o buru n’amụma ga-emezu? (Jere. 1:17; 7:30; 9:22) Ọ bụ nwoke nwere okwukwe. Ọ mụrụ Akwụkwọ Nsọ ma ghọta na amụma ọ bụla Jehova Chineke buru na-emezu. Ihe ndị mere tupu oge ahụ gosiri na Jehova nwere ike ibu amụma nke ga-adị ndị mmadụ ka ọ gaghị eme eme, dị ka amụma o buru na ọ ga-akpọpụta ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. Jeremaya ma ihe ahụ a kọrọ n’akwụkwọ Ọpụpụ nakwa ihe onye ji anya ya hụ mgbe o mere kwuru. Jọshụa chetaara ndị Izrel ibe ya, sị: ‘Unu ji obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.’—Jọsh. 23:14.

6, 7. (a) Gịnị mere i ji kwesị ichebara amụma ndị Jeremaya buru echiche? (b) Gịnị ga-eme ka obi sie gị ike na ozi ị na-ekwusa ga-emezu?

6 Gịnị mere i ji kwesị ịna-echebara amụma ndị Jeremaya buru echiche? Nke mbụ bụ na e nwere ezi ihe mere obi ji sie ya ike na ihe ọ bụla Jehova kwuru ga-emezu. Ihe nke abụọ bụ na ụfọdụ ihe Chineke si n’ọnụ Jeremaya kwuo na-emezu ugbu a. Ị ka ga-ahụkwa otú amụma ya ndị ọzọ ga-esi emezu. Ihe nke atọ bụ na ozi niile Jeremaya ziri n’aha Chineke, nakwa otú o si jiri ịnụ ọkụ n’obi zie ha, gosiri na ọ bụ ohu Chineke nke pụrụ iche. Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Jeremaya pụrụ iche ma e jiri ya tụnyere ndị amụma ndị ọzọ.” N’ihe niile a kọrọ banyere otú Chineke na ndị ya si mekọọ ihe, ndị Juu ghọtara na Jeremaya bụ onye amụma dị mkpa. Ọ bụ ya mere mgbe Jizọs na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị nụrụ ihe o kwuru chere na ọ ga-abụrịrị Jeremaya.—Mat. 16:13, 14.

7 Dị ka Jeremaya, i bi n’oge amụma Baịbụl ndị dị oké mkpa na-emezu. Obi kwesịkwara isi gị ike otú ahụ o siri Jeremaya na Chineke ga-emezu nkwa ndị o kwere. (2 Pita 3:9-14) Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike otú ahụ? Ọ bụ ịmụ ihe ndị ga-eme ka obi sikwuo gị ike na amụma ndị Chineke buru n’Okwu ya ga-emezurịrị. N’ihi ya, n’isiokwu a, anyị ga-atụle ụfọdụ amụma ndị Jeremaya buru ma mechaa hụ mgbe ha mezuru. Amụma ndị ọzọ anyị ga-atụle mezuru mgbe oge Jeremaya gachara. E nwere amụma ndị ọzọ gbasara gị ugbu a. Ha ga-agbasakwa gị n’ọdịnihu. Ka ihe ndị ahụ anyị ga-atụle mee ka ị tụkwasịkwuo amụma ndị Jehova buru obi, nke ga-eme ka obi sikwuo gị ike na ‘ọ ga-eme ihe o bu n’obi.’—Ákwá 2:17.

Gịnị mere Chineke ji zigara ndị ya ndị amụma? Gịnị mere obi ji sie gị ike na amụma ndị e buru banyere mbibi na-abịanụ ga-emezu?

AMỤMA NDỊ JEREMAYA BURU MA HỤ MGBE HA MEZURU

8, 9. Olee otu ihe mere Baịbụl ji bụrụ akwụkwọ pụrụ iche?

8 E nwere ọtụtụ ndị na-agbalị ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Chegodị banyere ndị ọkà ná nhazi akụnụba, ndị ọchịchị, ndị na-agba afa, na ndị na-akọ otú ihu ígwé ga-adị. O doro anya na ị chọpụtala na ọ na-esiri ha ike ikwu ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya, ya bụ, ihe ga-eme n’ụbọchị ole na ole ma ọ bụ n’izu ole na ole, ya emezuo otú ahụ ha kwuru. Ma otu n’ime ihe ndị e ji mara Baịbụl bụ na amụma ọ bụla o buru na-emezu. (Aịza. 41:26; 42:9) Amụma niile Jeremaya buru mezuru, ma ndị o buru ga-eme n’oge na-adịghị anya ma ndị o buru ga-eme n’oge dị anya n’ọdịnihu. Ọtụtụ n’ime ha bụ amụma ndị o buru banyere ndị mmadụ nakwa mba dị iche iche. Ka anyị burugodị ụzọ tụlee amụma ụfọdụ mezuru n’oge Jeremaya.

9 Taa, ọ̀ dị onye nwere ike ibu amụma ihe ga-eme n’ụwa n’otu afọ ma ọ bụ n’afọ abụọ na-abịa abịa? Dị ka ihe atụ, olee ọkachamara nke na-enyocha ihe na-eme ná mba dị iche iche nke nwere ike ikwu ma à ga-enwe mgbanwe ọchịchị, ya emee otú ahụ? Ma Chineke nyere Jeremaya ike o ji buo amụma na ebe Babịlọn na-achị ga-ebukwu ibu. O kwuru na Babịlọn bụ “iko ọlaedo” nke Jehova ga-eji wụsa Juda na ọtụtụ ndị na obodo ndị ha na ha gbara agbata obi ọnụma ya ma mee ka ha ghọọ ohu. (Jere. 51:7) Jeremaya na ndị ha na ya dịkọrọ ndụ ji anya ha hụ mgbe o mere.—Tụlee Jeremaya 25:15-29; 27:3-6; 46:13.

10. Gịnị ka Jehova buru amụma ga-eme ndị eze Juda anọ?

10 Jehova sikwa n’ọnụ Jeremaya kwuo ihe ga-eme ndị eze Juda anọ. Chineke buru amụma na a ga-adọrọ nwa Eze Josaya bụ́ Jehoahaz ma ọ bụ Shalọm n’agha, na ọ gaghịkwa alọta na Juda ọzọ. (Jere. 22:11, 12) Amụma ahụ mezuru. (2 Eze 23:31-34) Chineke bukwara amụma na a ga-eli Jehoyakim bụ́ onye nọchiri Jehoahaz “dị ka oké ịnyịnya ibu.” (Jere. 22:18, 19; 36:30) Baịbụl ekwughị otú o si nwụọ ma ọ bụ ihe e mere ozu ya, ma o kwuru na nwa ya bụ́ Jehoyakin nọchiri ya mgbe a nọchibidoro obodo ahụ. Jeremaya buru amụma na a ga-adọrọ Jehoyakin n’agha laa Babịlọn nakwa na ọ ga-anwụ n’ebe ahụ. Aha ndị ọzọ a kpọrọ Jehoyakin bụ Konaya na Jekonaya. (Jere. 22:24-27; 24:1) Amụma ahụ mezuru. Oleekwanụ banyere Zedekaya bụ́ eze ikpeazụ chịrị Juda? Jeremaya buru amụma na a ga-enyefe Zedekaya n’aka ndị iro ya, na ha agaghị emere ya ebere. (Jere. 21:1-10) Gịnị mechara mee? Ndị iro ya nwụchiri ya, gbuo ụmụ ya ndị ikom n’ihu ya, rụkpọsịa ya anya ma kpụrụ ya laa Babịlọn, bụ́ ebe ọ nọ nwụọ. (Jere. 52:8-11) N’ezie, amụma ahụ niile mezuru.

11. Ònye bụ Hananaya, oleekwa ihe Jehova kwuru ga-eme ya?

11 Jeremaya isi iri abụọ na asatọ gwara anyị na mgbe Zedekaya na-achị, onye amụma ụgha bụ́ Hananaya kwuru ihe megidere ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo banyere ọchịchị Babịlọn ga-achị Jeruselem. Hananaya leghaara ihe Chineke kwuru anya. O kwuru na Chineke ga-agbaji yok Nebukadneza nyakwasịrị n’olu Juda na mba ndị ọzọ. Ma, Jehova mere ka Jeremaya kwuo na ihe ahụ Hananaya kwuru bụ ụgha, kwughachi na ọtụtụ mba ga-ejere ndị Babịlọn ozi, gwakwa onye amụma ụgha ahụ na ọ ga-anwụ n’afọ ahụ. Amụma ahụ mezuru.—Gụọ Jeremaya 28:10-17.

12. Gịnị ka ọtụtụ ndị obodo Jeremaya mere mgbe ha nụrụ amụma bụ́ isi o buru?

12 N’eziokwu, amụma bụ́ isi Chineke si n’ọnụ Jeremaya buo bụ banyere mbibi Jeruselem. Jeremaya dọrọ ndị Juu aka ná ntị ugboro ugboro na a ga-ebibi obodo ahụ ma ọ bụrụ na ha echegharịghị ma kwụsị ikpere arụsị, ikpe ikpe na-ezighị ezi na ime ihe ike. (Jere. 4:1; 16:18; 19:3-5, 15) Ọtụtụ ndị obodo Jeremaya chere na Jehova enweghị ike ime ụdị ihe ahụ. Ọ bụ na Jeruselem ka ụlọ nsọ Chineke dị. Olee otú ọ ga-esi kwe ka e bibie ebe ahụ dị nsọ? Ha chere na o nweghị ike ime eme. Ma ị ma na Jehova anaghị agha ụgha. O mere ihe o bu n’obi.—Jere. 52:12-14.

Foto dị na peeji nke 160

Ndị nne na nna: Jirinụ ihe ndị Rikab, Ibed-melek, na Barọk mere mee ka ụmụ unu nwee okwukwe

13. (a) Olee otú oge anyị si yie oge Jeremaya? (b) Gịnị mere nkwa ndị ahụ Chineke kwere ụfọdụ ndị n’oge Jeremaya ji kwesị ịgbasa gị?

13 Ọnọdụ ndị Chineke taa yiri nke ndị ahụ rubeere Jehova isi n’oge Jeremaya. Anyị ma na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị niile jụrụ aka ná ntị ọ na-adọ ha. Ma nkwa ndị o kwere kwesịrị ịkasi anyị obi, otú ahụ o si kasie ndị Juu ahụ nọsiri ike n’ofufe Chineke n’oge Jeremaya. Jehova kwuru na ndị Rikab ga-alanahụ mbibi Jeruselem n’ihi na ha rubeere ya isi, debekwa iwu nna nna ha nyere ha. Ha lanahụrụ mbibi ahụ. Otú anyị si mata bụ na e mechara kpọọ “Malkaịja nwa Rikab” aha. Ọ bụ ya nyere aka rụzie Jeruselem mgbe Nehemaya bụ gọvanọ. (Nehe. 3:14; Jere. 35:18, 19) Jehova mesiri Ibed-melek obi ike na ọ ga-alanahụ mbibi ahụ n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi ma kwado Jeremaya. (Jere. 38:11-13; 39:15-18) Chineke kwekwara Barọk, bụ́ onye ya na Jeremaya rụkọrọ ọrụ, nkwa na ya ‘ga-enye ya mkpụrụ obi ya ka ọ bụụrụ ya ihe nkwata.’ (Jere. 45:1, 5) Olee ihe ị chọpụtara n’otú amụma ndị ahụ si mezuo? Gịnị ka i chere Jehova ga-emere gị ma ọ bụrụ na ị tụkwasị ya obi mgbe niile?—Gụọ 2 Pita 2:9.

Olee otú obi dị Ibed-melek, Barọk, na ndị Rikab n’ihi otú Chineke si mezuo amụma ndị o buru? Olee otú obi dị gị n’ihi amụma ndị ahụ?

AMỤMA NDỊ MEZURU MGBE OGE JEREMAYA GACHARA

14. Gịnị mere amụma Chineke buru banyere Babịlọn ji pụọ iche?

14 Chineke buru amụma na Nebukadneza ga-emeri ma Juda ma Ijipt. (Jere. 25:17-19) O nwere ike iyi ihe na-agaghị eme eme n’ihi na Ijipt siri ezigbo ike n’oge ahụ. Juda nọkwa n’okpuru ha. (2 Eze 23:29-35) Mgbe e merichara Jeruselem, ụfọdụ ndị Juu bu n’obi ịhapụ obodo ha gbaga Ijipt, bụ́ ebe ha chere na a ga-echebe ha, obi eruokwa ha ala. Ọ bụ ihe ha chọrọ ime n’agbanyeghị na Jehova adọọla ha aka ná ntị ka ha ghara ime otú ahụ, gwakwa ha na ya ga-agọzi ha ma ọ bụrụ na ha anọrọ na Juda. Ma, ọ bụrụ na ha agbaga Ijipt, mma agha ahụ ha na-atụ egwu ya ga-enweta ha n’ebe ahụ. (Jere. 42:10-16; 44:30) N’akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere, Jeremaya ekwughị ma ọ̀ hụrụ mgbe ndị Babịlọn busoro Ijipt agha ma ọ̀ bụ na ọ hụghị. Ihe doro anya bụ na mgbe ndị Babịlọn meriri ndị Ijipt ná mmalite narị afọ nke isii T.O.A., ihe ndị ahụ Jehova buru n’amụma mere ndị Izrel ahụ gbagara ọsọ ndụ n’Ijipt.—Jere. 43:8-13.

15, 16. Olee otú ihe Chineke kwuru na a ga-ahapụ ndị ya ka ha laghachi si mezuo?

15 Jeremaya bukwara amụma na a ga-emeri Babịlọn, bụ́ obodo meriri Ijipt. Otu narị afọ tupu e merie Babịlọn, Jeremaya buru amụma na a ga-emeri ya na mberede. O mezukwara. Olee otú o si buo amụma ahụ? Onye amụma Chineke kwuru na mmiri nke na-echebe Babịlọn ‘ga-ata,’ nakwa na ndị dike ya agaghị alụ agha. (Jere. 50:38; 51:30) Amụma ndị ahụ mezuru mgbe ndị Midia na ndị Peshia mere ka Osimiri Yufretis na-asọga ebe ọzọ. Ha jizi ụkwụ gafee osimiri ahụ ma banye n’obodo ahụ, bịakwasị ndị Babịlọn na mberede. Amụma ọzọ e buru banyere obodo ahụ nke i nwere ike ịghọta na ọ pụrụ iche bụ na ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ n’efu nke mmadụ na-agaghị ebi. (Jere. 50:39; 51:26) Otú Babịlọn, bụ́ obodo kpara ike n’oge ochie, si tọgbọrọ n’efu ruo taa gosiri na amụma ọ bụla Chineke buru ga-emezurịrị.

16 Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo na ndị Juu ga-ejere ndị Babịlọn ozi afọ iri asaa. E mechaa, Chineke ga-akpọlata ndị ya n’ala ha. (Gụọ Jeremaya 25:8-11; 29:10.) Obi siri Daniel ike na amụma ahụ ga-emezu. O jikwa ya ghọta “afọ ole Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu.” (Dan. 9:2) Ezra kwuru, sị: “Ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya wee mezuo, Jehova kpaliri mmụọ Saịrọs eze Peshia,” bụ́ onye meriri Babịlọn, ka ọ gwa ndị Juu ka ha laghachi n’ala ha. (Ezra 1:1-4) Mgbe ha mechara laghachi, ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi udo e nwere n’ala nna ha ma maliteghachi ezi ofufe n’ebe ahụ, otú ahụ Jeremaya buru n’amụma.—Jere. 30:8-10; 31:3, 11, 12; 32:37.

17. Kọwaa otú o si bụrụ na ihe Jeremaya kwuru banyere ‘ịkwa ákwá’ na Rema na-ekwu banyere ihe mere n’oge abụọ dịgasị iche.

17 Jeremaya dekwara amụma ndị ga-emezu n’ọdịnihu dị ezigbo anya. O kwuru, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A na-anụ olu ákwá arịrị na ákwá dị ilu na Rema; Rechel na-akwara ụmụ ya ákwá. O kweghị ka a kasie ya obi n’ihi ụmụ ya, n’ihi na ha anọkwaghị.’” (Jere. 31:15) Mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A., ọ dị ka ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha hà gbakọtara n’obodo Rema, n’ihe dị ka kilomita asatọ n’ebe ugwu Jeruselem. O nwere ike ịbụ na e gburu ụfọdụ n’ime ha na Rema. Ma eleghị anya, ọ bụ ya bụ mgbe mbụ amụma ahụ mezuru, dị ka à ga-asị na ọ bụ Rechel na-akwa ákwá na “ụmụ” ya nwụrụ. Ma mgbe ihe karịrị narị afọ isii gachara, Eze Herọd mere ka e gbuo ụmụaka na Betlehem. Matiu, bụ́ onye so dee banyere Oziọma Jizọs, kọwara na amụma ahụ Jeremaya buru gosiri ákwá arịrị ndị mmadụ ga-ebe n’ihi ụmụaka ndị ahụ e gburu.—Mat. 2:16-18.

Foto dị na peeji nke 163

Olee ebe ndị Idọm nọ taa?

18. Olee otú e si mezuo amụma Chineke buru banyere Idọm?

18 E nwere amụma ọzọ mezuru na narị afọ mbụ Oge Anyị. Chineke si n’ọnụ Jeremaya buo amụma na Idọm so ná mba ndị Babịlọn ga-emeri. (Jere. 25:15-17, 21; 27:1-7) Ihe Chineke kwuru abụghị naanị na a ga-emeri Idọm. Idọm ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra. Ị manụ ihe ọ pụtara, ya bụ na o nweghịzi onye ga-ebi na ya. Ọ gaghị adịkwa. (Jere. 49:7-10, 17, 18) Ọ bụ kpọmkwem ihe mere Idọm. Olee ebe i chere e nwere ike ịhụ aha ahụ bụ́ Idọm na ndị Idọm taa? Ọ̀ bụ na map ebe e sere obodo ndị dị ugbu a? Mbanụ. Ebe a na-ahụkarị ya bụ n’akwụkwọ mgbe ochie ma ọ bụ n’ihe a kọrọ na Baịbụl ma ọ bụkwanụ na map ebe e sere obodo ndị dịrị n’oge ochie. Fleviọs Josifọs kọrọ na a manyere ndị Idọm ịghọ ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu na narị afọ nke abụọ T.O.A. Mgbe e mechara bibie Jeruselem n’afọ 70 O.A., e nweghịzi ndị a ma bụ́ ndị Idọm.

19. Gịnị ka akwụkwọ Jeremaya na-eme ka anyị mata banyere ike Chineke nwere imezu amụma?

19 Ị̀ hụlanụ na ihe juru n’akwụkwọ Jeremaya bụ amụma ndị e buru banyere ndị mmadụ na mba dị iche iche? Ọtụtụ amụma ndị ahụ emezuola. Eziokwu a doro anya kwesịrị ime ka ị na-agụ akwụkwọ Jeremaya ma na-amụ ya n’ihi na o nwere ihe ọ ga-eme ka ị ghọta banyere Chineke gị bụ́ Onye dị ukwuu. Jehova emeela ihe o bu n’obi. Ọ ka ga-emekwa otú ahụ. (Gụọ Aịzaya 46:9-11.) O kwesịrị ime ka obi sikwuo gị ike na amụma ndị e buru na Baịbụl ga-emezu. N’eziokwu, otú amụma ụfọdụ Jeremaya dere si mezuo gbasara gị ugbu a. Otú amụma ya ụfọdụ ga-esi mezuo n’ọdịnihu ga-agbasakwa gị. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ na paragraf ndị fọrọ n’isiokwu a.

Olee amụma ụfọdụ mezuru mgbe Jeremaya nwụchara, gịnịkwa mere ha ji dị gị mkpa?

AMỤMA NDỊ GBASARA GỊ

20-22. Gịnị mere a ga-eji kwuo na ụfọdụ amụma ndị e dere n’akwụkwọ Jeremaya na ndị ọzọ e dere na Baịbụl nwere ike imezu ihe karịrị otu ugboro? Nye ihe atụ.

20 Otu amụma Baịbụl nwere ike imezu ihe karịrị otu ugboro. Otu ihe atụ bụ ihe ahụ Jizọs zara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha jụrụ ya banyere ihe ‘ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a.’ (Mat. 24:3) Mgbe mbụ o mezuru bụ n’afọ 66 ruo 70 O.A. Ma o doro anya na amụma ahụ ka ga-emezu ọzọ mgbe a ga-enwe “oké mkpagbu” nke ga-abịakwasị ụwa ọjọọ a. Ọ ga-abụ mkpagbu “nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Mat. 24:21) Ị ga-ahụ amụma ndị yiri ya n’amụma ndị Jeremaya dere. Ụfọdụ n’ime ha bu ụzọ mezuo n’afọ 607 T.O.A. ma mechaa mezuo ọzọ mgbe ọtụtụ afọ gachara, dị ka anyị kwuru na mbụ banyere ‘ákwá Rechel kwaara ụmụ ya.’ (Jere. 31:15) N’eziokwu, e nwere ụfọdụ amụma ndị Jeremaya buru banyere oge a anyị bi ugbu a. Otú ha ga-esikwa emezu gbasara gị.

21 I nwere ike ịhụ ụfọdụ amụma ahụ n’akwụkwọ Mkpughe. Jọn onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo banyere amụma ndị ahụ Jeremaya buru, bụ́ ndị gbasara otú a ga-esi emeri Babịlọn n’afọ 539 T.O.A. N’akwụkwọ Mkpughe, anyị na-ahụ otú ihe ahụ mere n’oge ochie si yie ihe ka nke ahụ, nke Chineke kwuru ga-eme n’ọdịnihu. Otu n’ime amụma ndị Jeremaya buru nke mezuru n’oge anyị a bụ amụma ahụ o buru banyere otú otu alaeze ukwu ga-esi daa, ya bụ, alaeze okpukpe ụgha nke zuru ụwa ọnụ, nke bụ́ “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpu. 14:8; 17:1, 2, 5; Jere. 50:2; 51:8) Ndị Chineke kwesịrị ‘isi n’ime ya pụta’ ka a ghara ime ha ihe a ga-eme ya. (Mkpu. 18:2, 4; Jere. 51:6) Mmiri nke gbara obodo ahụ gburugburu nọchiri anya ndị òtù ya ma ọ bụ ndị na-akwado ya. Mmiri ahụ ‘ga-ata.’—Jere. 51:36; Mkpu. 16:12.

22 Ihe ọzọ ka ga-emezu n’ọdịnihu bụ nkwa ahụ Chineke kwere na ya ga-abọ ọbọ n’isi okpukpe ụgha n’ihi arụrụala ọ rụsara ndị Chineke. Jehova ‘ga-akwụ ya ụgwọ dị ka ihe niile o mere si dị.’ (Jere. 50:29; 51:9; Mkpu. 18:6) Babịlọn Ukwu ahụ, nke bụ́ okpukpe ụgha, ga-atọgbọrọ n’efu otú ahụ ala Babịlọn oge ochie si tọgbọrọ n’efu taa.—Jere. 50:39, 40.

23. Olee amụma Jeremaya buru banyere ịmaliteghachi ezi ofufe nke mezuru n’ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ otu narị afọ gara aga?

23 O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na Jeremaya bukwara amụma banyere ihe ọma ndị ga-emenụ. Dị ka ihe atụ, o buru amụma na a ga-amaliteghachi ezi ofufe n’ụwa n’oge anyị a. Otú ahụ e si tọhapụ ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn n’oge ochie yiri otú e si tọhapụ ndị Chineke n’oge a n’aka Babịlọn Ukwu ahụ mgbe e hiwechara Alaeze Chineke n’eluigwe. Jehova mere ka ndị ya maliteghachi ife ya ofufe dị ọcha, nke mere ka ha na-ekele ya ma na-aṅụrị ọṅụ. Ọ gọziela mgbalị ha na-eme inyere ndị ọzọ aka ịbịa fee ya ma rijuo nri ime mmụọ afọ. (Gụọ Jeremaya 30:18, 19.) O doro anya na ị hụkwala n’oge anyị a otú Jehova si na-emezu nkwa o kwere na ya ga-enye ndị ya ndị ga na-azụ ha dị ka atụrụ, ya bụ, ndị ikom tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị ga na-azụ atụrụ Chineke ma na-elekọta ha.—Jere. 3:15; 23:3, 4.

24. Olee ihe dị ezigbo mkpa Jeremaya kwuru nke ga-emezu n’ọdịnihu?

24 N’okwu Chineke si n’ọnụ Jeremaya gwa ndị ya n’oge ochie, o kwere ha nkwa na ha ga-enweta ihe ọma ma ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi. Ọ dọkwara ha aka ná ntị na a ga-ebibi ha ma ọ bụrụ na ha emebie adịm ná mma ha na Jehova. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị taa. Jeremaya 25:33 kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa. A gaghị akwara ha ákwá arịrị, a gaghịkwa achịkọta ha ma ọ bụ lie ha. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.” Anyị kwesịrị ịghọta na ịdọ aka ná ntị ahụ dị oké mkpa.

25. Olee ọrụ e nyere ndị ohu Chineke taa?

25 N’ezie, dị ka Jeremaya, anyị bi n’oge dị oké mkpa. Dị ka ọ dị n’oge Jeremaya, ihe ndị mmadụ mere mgbe ha nụrụ okwu Jehova nwere ike ime ka ha dị ndụ ma ọ bụ nwụọ. Taa, ndị Chineke abụghị ndị amụma. E nyeghị anyị mmụọ nsọ itinye ihe n’ihe Jehova kwuru na Baịbụl, nke bụ́ eziokwu. Ma e nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke mgbe niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a. (Mat. 28:19, 20) O doro anya na anyị achọghị ‘izuru okwu Jehova,’ nke pụtara izochiri ndị mmadụ ihe na-aga ime. (Gụọ Jeremaya 23:30.) Anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ewepụ ihe ọ bụla n’okwu ya ma ọ bụ gwagbuo ya. Ọtụtụ amụma Chineke si n’ọnụ Jeremaya buo emezuola. Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ndị na-emezubeghị ga-emezurịrị. Anyị kwesịrị ịgwa ndị mmadụ na Chineke ga-emerịrị ‘ihe o bu n’obi na ihe o nyere n’iwu ogologo oge gara aga.’—Ákwá 2:17.

Foto dị na peeji nke 166

‘Ezurula okwu Jehova,’ nke pụtara izochiri ndị mmadụ ihe na-aga ime

26. Olee amụma ọzọ anyị ga-atụle?

26 Anyị agaghị ekwu na anyị atụlechaala ọrụ Jeremaya rụrụ na amụma ndị o buru ma ọ bụrụ na anyị atụleghị nkwa Jehova kwere na ya na ndị ya ga-agba “ọgbụgba ndụ ọhụrụ,” nke ọ ga-ede iwu ya n’obi ha. (Jere. 31:31-33) Amụma ahụ na otú o si mezuo gbasara gị. Ọ bụ ihe anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Anọ.

Olee amụma ndị e dere n’akwụkwọ Jeremaya bụ́ ndị mezuru n’oge anyị a? Gịnị ka i chere banyere amụma ndị na-emezubeghị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya