Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 7 p. 81-91
  • “M Ga-eme Ka Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “M Ga-eme Ka Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ NWERE IKE IME KA MMADỤ DAA MBÀ
  • Ị̀ GA-EME KA MKPỤRỤ OBI IKE GWỤRỤ NWEE UME?
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 7 p. 81-91

ISI NKE ASAA

“M Ga-eme Ka Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”

1. Olee ihe ọma ị na-atụ anya ya n’ụwa ọhụrụ?

Ị NỤ “ụwa ọhụrụ,” ọ̀ na-eme ka i cheta ụfọdụ ihe ọma a na-ahụ anya, bụ́ ndị e buru n’amụma? Ma eleghị anya, ọ na-eme ka i cheta mgbe ndị mmadụ ga-ezu okè, nri na-edozi ahụ́ eju ebe niile, ụmụ anụmanụ na ndị mmadụ ebiri n’udo, onye ọ bụla enweekwa ezigbo ụlọ. Ikekwe, i nwere ike ikwu ụfọdụ amaokwu Baịbụl ebe e kwere nkwa ndị ahụ. Ma, ihe ọma ọzọ ị na-ekwesịghị ichefu bụ na ndị mmadụ na Chineke ga-adị ná mma, obi eruokwa ha ala. E wezụga ya, ihe ọma niile ndị ọzọ agaghị adịte aka.

2, 3. Olee ihe ọma pụrụ iche akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere na-eme ka anyị na-atụ anya ya?

2 N’amụma ahụ Chineke gwara Jeremaya ka o buo na ndị Juu ga-esi Babịlọn lọta, o kwuru otú obi ga-adị ha, sị: “Ị ga-eji obere ịgbà gị chọọ onwe gị mma ọzọ wee na-agba egwú dị ka ndị obi dị ụtọ.” (Gụọ Jeremaya 30:18, 19; 31:4, 12-14.) Chineke kwuru ihe ọzọ nwere ike ịgba gị ume, sị: “M ga-eme ka mkpụrụ obi ike gwụrụ nwee ume, m ga-emekwa ka afọ ju mkpụrụ obi niile ike gwụrụ.”—Jere. 31:25.

3 Nkwa ahụ magburu onwe ya! Jehova kwuru na ya ga-eme ka onye ike gwụrụ na onye dara mbà nwee ume. N’ezie, Chineke na-emezu nkwa ọ bụla o kwere. Akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke ga-emekwa ka anyị nwee ume. Ihe ọzọ bụ na akwụkwọ ndị ahụ na-eme ka anyị ghọta otú e nwere ike isi gbaa anyị ume ugbu a, meekwa ka anyị nwee olileanya. Ha na-emekwa ka anyị ghọta otú anyị nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume, ka mkpụrụ obi ha ike gwụrụ nwee ume.

4. Gịnị mere anyị nwere ike iji ghọta otú obi dị Jeremaya?

4 Nkwa ahụ kasiri Jeremaya obi, o nwekwara ike ịkasi anyị obi. N’ihi gịnị? Cheta na n’Isi nke Mbụ n’akwụkwọ a, e kwuru na Jeremaya bụ mmadụ “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe,” dị ka Ịlaịja onye amụma. (Jems 5:17) Chegodị banyere ihe ụfọdụ nwere ike ime ka Jeremaya daa mbà mgbe ụfọdụ ma ọ bụ mee ka ike ụwa chọọ ịgwụ ya. Ka ị na-eche banyere ha, chee otú obi ga-adị gị ma ụdị ihe ahụ mee gị nakwa ihe mere nsogbu ndị ị na-enwe nwere ike iji mee ka ị daa mbà.—Rom 15:4.

5. Ma eleghị anya, gịnị mere ka obi jọọ Jeremaya njọ?

5 O nwere ike ịbụ na ndị obodo Jeremaya so mee ka obi jọọ ya njọ. O toro n’Anatọt, bụ́ obodo ndị Livaị nke dị kilomita ole na ole ma é si n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Jeruselem gaa ya. Ọ dị ka onye amụma ahụ ò nwere ndị ikwu na ibe n’Anatọt. Jizọs kwuru na a naghị asọpụrụ onye amụma n’obodo ya. Ọ bụ otú ahụ ka e mere Jeremaya. (Jọn 4:44) Ihe ndị obodo Jeremaya mere abụghị naanị na ha kparịrị ya ma ọ bụ na ha achọghị ige ya ntị. O nwere mgbe Chineke kwuru na ‘ndị Anatọt na-achọ mkpụrụ obi Jeremaya.’ Ha ji obi ọjọọ gwa ya, sị: “Ebula amụma n’aha Jehova, ka ị ghara ịnwụ n’aka anyị.” Ndị ahụ bụ ndị agbata obi ya na ma eleghị anya, ndị ikwu ya, bụ́ ndị kwesịrị ịkwado ya. Ma, leenụ ụdị egwu ha yiri ya!—Jere. 1:1; 11:21.

Foto dị na peeji nke 83

6. Ọ bụrụ na ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ndị ọzọ na-emegide gị, olee otú ihe Jehova mere “ndị Anatọt” n’oge Jeremaya nwere ike isi baara gị uru?

6 Ọ bụrụ na ndị agbata obi gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ụfọdụ ndị ezinụlọ unu na-enye gị nsogbu, ka otú Jehova si nyere Jeremaya aka kasie gị obi. N’oge ahụ, Chineke kwuru na ya ‘ga-elebara’ ndị Anatọt anya, bụ́ ndị na-emegide onye amụma ya. (Gụọ Jeremaya 11:22, 23.) O doro anya na otú Chineke si mesie Jeremaya obi ike nyeere ya aka idi nsogbu ndị obodo ya nyere ya, nke gaara eme ka ọ daa mbà. Chineke ga-emecha lebara ndị Anatọt anya, mee ka ‘ọdachi dakwasị ha.’ O mechara mee otú ahụ. Ka obi sie gị ike na Jehova na-ahụ nsogbu gị niile. (Ọma 11:4; 66:7) Ọ bụrụ na ị “nọgide” n’ihe Baịbụl na-akụzi ma na-eme ihe ziri ezi, i nwere ike inyere ụfọdụ ndị mmegide aka izere ọdachi nke gaara adakwasị ha.—1 Tim. 4:16.

N’akwụkwọ Jeremaya, gịnị gosiri na Chineke chọrọ ịma otú obi dị ndị ya, oleekwa otú nke a si nyere onye amụma ahụ aka?

IHE NDỊ NWERE IKE IME KA MMADỤ DAA MBÀ

7, 8. Olee arụrụala a rụsara Jeremaya, oleekwa otú o mere ka obi dị ya?

7 Ọ bụghị naanị okwu ọjọọ ka ndị obodo Jeremaya gwara ya. Ihe otu nwoke a ma ama na Jeruselem mere ya gosiri na ọ bụ eziokwu. Nwoke ahụ bụ onye nchụàjà aha ya bụ Pash-họ.a Mgbe Pash-họ nụrụ amụma Chineke, ‘o tiri Jeremaya onye amụma ihe ma tinye ya n’ọtọsị.’ (Jere. 20:1, 2) O nwere ike ịbụ na ihe o mere ya karịrị ịma ụra. Ụfọdụ kwuru na Pash-họ pịara Jeremaya ihe dị ka ọnụ ụtarị iri anọ. (Diut. 25:3) Ma eleghị anya, mgbe a na-ata Jeremaya ahụhụ, ndị mmadụ nọ na-achị ya ọchị, na-akparị ya, na-agbụkwa ya ọnụ mmiri. Ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Pash-họ tinyere Jeremaya “n’ọtọsị.” Ọ nọkwa ebe ahụ chi abọọ. Okwu Hibru e si sụgharịta ‘ọtọsị’ gosiri na otú Jeremaya nọ mgbe ahụ mere ka ahụ́ dum na-egbu ya mgbu. N’ezie, e ji obi ọjọọ manye Jeremaya ịnọ otú ahụ chi abọọ, ma eleghị anya, fanye aka ya, ụkwụ ya, na isi ya n’ọtọsị ahụ e ji osisi rụọ.

8 Olee otú obi dị Jeremaya n’ihi ahụhụ ahụ a tara ya? Ọ gwara Chineke, sị: “Aghọrọ m onye a na-achị ọchị ogologo ụbọchị dum.” (Jere. 20:3-7) E nwedịrị mgbe ọ dị ya ka ya kwụsị ikwu okwu n’aha Chineke. Ma, ị manụ na o nweghị ihe ga-eme ka Jeremaya kwụsị ikwu okwu n’aha Chineke. O nweghịkwa mgbe ọ kwụsịrị. Kama ime otú ahụ, ozi ahụ Chineke gwara Jeremaya zie dị ka “ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ [ya],” nke mere ka o kwuo okwu n’aha Jehova.—Gụọ Jeremaya 20:8, 9.

Foto dị na peeji nke 84, 85

9. Gịnị mere ichebara ihe mere Jeremaya echiche ga-eji baara anyị uru?

9 Akụkọ ahụ nwere ike inyere anyị aka mgbe ndị anyị ma ji obi ọjọọ na-akwa anyị emo, ma hà bụ ndị ikwu anyị, ndị agbata obi anyị, ndị ọrụ ibe anyị ma hà bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị. O kwesịghị iju anyị anya ma ọ bụrụ na otú ha si emegide anyị emee ka anyị dawa mbà mgbe ụfọdụ. Anyị nwekwara ike ịdawa mbà ma ọ bụrụ na a na-arụsa anyị arụrụala n’ihi na anyị na-efe ezi ofufe. Ihe ndị ahụ e mere Jeremaya bụ́ nwoke na-ezughị okè wutere ya. Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị ihe na-emetụ n’ahụ́ ka ya? Ma, anyị ekwesịghị ichefu na Chineke nyeere Jeremaya aka inweghachi ọṅụ na obi ike. Jeremaya dara mbà n’obi, ma ọ dịteghị aka, nke anyị ekwesịghịkwa ịdịte aka.—2 Kọr. 4:16-18.

10. Olee ihe Baịbụl kọọrọ anyị banyere otú obi dị Jeremaya?

10 Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ, obi dị Jeremaya mma, ya nọtụ obere, obi ajọọ ya ezigbo njọ. Ò nweela mgbe ụdị ihe ahụ mere gị, ya bụ, mgbe i nwekatara olileanya na ihe ga-adị mma, obere oge, iwe eju gị obi, obi adaakwa gị mbà? Otu ihe atụ nke gosiri na e nwere mgbe Jeremaya nwere olileanya na ihe ga-adị mma bụ ihe e kwuru na Jeremaya 20:12, 13. (Gụọ ya.) Mgbe Pash-họ tachara Jeremaya ahụhụ, Jeremaya ṅụrịrị ọṅụ na ya dị ka ogbenye nke a napụtara “n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ.” Ma eleghị anya, e nweela mgbe ị na-aṅụrị ọṅụ ma chọọ ịbụku Jehova abụ n’ihi na ọ napụtara gị ná nsogbu ma ọ bụ iji gosi na obi dị gị ụtọ n’ihi ihe ọma meere gị ná ndụ ma ọ bụ n’ozi gị. Inwe ụdị obi ụtọ ahụ magburu onwe ya!—Ọrụ 16:25, 26.

Foto dị na peeji nke 86

Olee otú mmegide ma ọ bụ ịkwa emo nwere ike ime ka obi dị anyị?

11. Ọ bụrụ na ọ na-abụ, anyị nwekata obi ụtọ, obi ajọọ anyị njọ, gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’aka Jeremaya?

11 Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, obi ụtọ anyị nwere ike ịla na mberede, dị ka o mere Jeremaya. Mgbe o kwuchara ka a ‘bụkuo Jehova abụ,’ obi jọrọ ya njọ nke ukwuu, ikekwe, anya mmiri ana-agba ya. (Gụọ Jeremaya 20:14-16.) Obi adịghị ya mma, nke mere ka o chewe ma ọmụmụ a mụrụ ya ọ̀ bakwara uru! Mgbe ahụ ọ nọ ná mwute, o kwuru na, dị ka Sọdọm na Gọmọra, ahụhụ ga-adịrị nwoke ziri ozi na a mụọla ya. Ma ihe dị mkpa bụ: Jeremaya ọ̀ nọgidere ná mwute? Ike ụwa ọ̀ gwụrụ ya, ya echee na o nweghị ihe ga-eme ka obi ịda mbà ya kwụsị? Mbanụ. Kama ime otú ahụ, ọ ga-abụrịrị na ọ gbalịsiri ike ime ka obi ịda mbà ya kwụsị, ọ kwụsịkwara. Ka anyị tụlee ihe ọzọ akwụkwọ Jeremaya kwuru mgbe o kwuchara ihe a. Pash-họ nke ọzọ bụ́ onyeisi bịakwutere Jeremaya ma jụọ ya ihe Eze Zedekaya jụrụ banyere ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem. Kama ịtụ ụjọ, Jeremaya ji obi ike gwa ya ihe Jehova kpebiri ime na ihe ga-emecha mee ha. (Jere. 21:1-7) O doro anya na Jeremaya nọsiri ike n’ọrụ ibu amụma ya!

12, 13. Ọ bụrụ na ọ na-abụ, anyị nwetụ obi ụtọ, obi ajọwa anyị njọ, gịnị ka anyị nwere ike ime?

12 Taa, ụfọdụ ndị ohu Chineke na-abụ, ha nwekata obi ụtọ, obi ajọwa ha njọ. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime mmadụ n’ihi otú ahụ́ dị ya ma ọ bụkwanụ n’ihi ọrịa. Dọkịta ma nke a na-akọ nwere ike ịgwa onye ahụ ihe ga-enyere ya aka ná nsogbu ahụ. (Luk 5:31) E nwere mgbe ụfọdụ ọtụtụ n’ime anyị na-enwe oké obi ụtọ ma ọ bụ daa mbà n’obi, ma ọ pụtaghị na ahụ́ adịghị ha. O yiri ka ọ̀ bụ ezughị okè anyị mere anyị ji ada mbà n’obi mgbe ụfọdụ. O nwere ike ịbụ n’ihi ike ọgwụgwụ ma ọ bụ n’ihi na onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee anyị, anyị kwesịrị icheta na o nwere mgbe ụfọdụ obi jọrọ Jeremaya njọ, ma o meghị ka ọ kwụsị ife Chineke. Ihe nwere ike inyere anyị aka bụ ịhazigharị ihe anyị na-eme n’ụbọchị ka anyị nwee ike ịna-ezukwu ike. Ma ọ̀ bụkwanụ, ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ, o nwere ike iwetụ oge tupu ya apụọ anyị n’obi. Ma ọ dị oké mkpa ka anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya, sorokwa na-eme ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke otú anyị na-emebu. Ihe ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ozi Chineke ma na-enwe ọṅụ na ya.—Mat. 5:3; Rom 12:10-12.

13 Ma ị̀ na-ada mbà n’obi mgbe ụfọdụ ma ọ bụ mgbe niile, akụkọ banyere Jeremaya nwere ike ịkasi gị obi. Dị ka anyị kwuru na mbụ, o nwere mgbe ụfọdụ obi jọrọ ya njọ. Ma, o kweghị ka obi ahụ jọrọ ya njọ mee ka ọ kwụsị ife Chineke ọ hụrụ n’anya, bụ́ onye o jeere ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Mgbe ndị na-emegide ya ji ihe ọjọọ kwụọ ya ụgwọ ihe ọma o meere ha, ọ kpọkuru Jehova ma tụkwasị ya obi. (Jere. 18:19, 20, 23) Kpebisie ike iṅomi Jeremaya.—Ákwá 3:55-57.

Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ mgbe ụfọdụ, olee otú ị ga-esi eme ihe ị mụtara n’akwụkwọ Jeremaya?

Ị̀ GA-EME KA MKPỤRỤ OBI IKE GWỤRỤ NWEE UME?

14. Olee otú e si gbaa Jeremaya ume?

14 Anyị kwesịrị ịtụle otú e si gbaa Jeremaya ume nakwa otú o si gbaa ndị ọzọ bụ́ “mkpụrụ obi ike gwụrụ” ume. (Jere. 31:25) Onye kacha gbaa onye amụma ahụ ume bụ Jehova. Chegodị otú obi gaara esi sie gị ike ma a sị na ọ bụ gị ka Jehova gwara, sị: “Lee, emewo m taa ka ị bụrụ obodo e wusiri ike . . . Ha ga-alụsokwa gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n’ihi na ‘anọnyeere m gị,’ ka Jehova kwuru, ‘ịnapụta gị.’” (Jere. 1:18, 19) Ọ ga-abụrịrị ya mere Jeremaya ji kpọọ Jehova “ike m na ebe m e wusiri ike na ebe mgbaba m n’oge ahụhụ.”—Jere. 16:19.

15, 16. Gịnị ka otú Jehova si gbaa Jeremaya ume na-akụziri anyị banyere ihe anyị nwere ike ime iji gbaa ndị ọzọ ume?

15 Anyị ekwesịghị ichefu na Jehova gwara Jeremaya, sị: “Anọnyeere m gị.” È nwere ihe nke ahụ kụziiri gị i nwere ike ime ma ọ bụrụ na e nwere onye ị ma nke e kwesịrị ịgba ume? E nwere ihe dị iche n’ịghọta na e kwesịrị ịgba nwanna ma ọ bụ ma eleghị anya onye ikwu anyị ume na ịgba onye ahụ ezigbo ume. Ọtụtụ mgbe, ihe na-akacha aba uru bụ ime ihe ahụ Chineke meere Jeremaya, ya bụ, ịnọnyere onye ahụ nọ ná nsogbu. O nweziri mgbe ọ ga-eru, gị agbatụ ya ume, ma ọ bụghị ịgwa ya ọtụtụ okwu. O yiri ka okwu ole na ole ị gwara ya hà ga-aka aba uru ma ọ bụrụ na ha bụ okwu ga-emesi ya obi ike ma gbaa ya ume. Ọ dịghị mkpa na ị ga-abụ ọkà okwu. Gwa ya okwu ga-adịrị ya mfe nghọta, nke ga-eme ka ọ ghọta na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ, na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi nakwa na ị hụrụ ya n’anya. Ụdị okwu ahụ nwere ike ịba uru dị ukwuu.—Gụọ Ilu 25:11.

16 Jeremaya rịọrọ Jehova, sị: “Biko, cheta m ma chee ihu n’ebe m nọ.” Gịnị meziri? Onye amụma ahụ kwuru, sị: “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ.” (Jere. 15:15, 16) O nwere ike ịdị onye ahụ ị chọrọ ịgba ume mkpa ka ị gwa ya okwu ọma otú ahụ Jehova gwara Jeremaya. N’eziokwu, okwu gị enweghị ike ịdị ka nke Jehova. Ma, i nwere ike iwebata okwu Chineke n’okwu gị. Ọ bụrụ na okwu ndị ị gwara ya si gị n’obi, sikwa na Baịbụl, o nwere ike ime ka onye ahụ dara mbà n’obi ṅụrịa ọṅụ.—Gụọ Jeremaya 17:7, 8.

17. Olee ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’otú Jeremaya si mesoo Zedekaya na Johenan?

17 Buru n’obi na ọ bụghị naanị na Chineke gbara Jeremaya ume, Jeremaya gbakwara ndị ọzọ ume. Olee otú o si gbaa ha ume? E nwere mgbe Eze Zedekaya gwara Jeremaya na ya na-atụ ndị Juu gbakwuuru ndị Babịlọn ụjọ. Onye amụma ahụ gbara eze ume, gwa ya ka o rubere Jehova isi ka ihe gaziere ya. (Jere. 38:19, 20) Mgbe e merichara Jeruselem, ndị Juu ole na ole afọdụ na ya, ọchịagha ha bụ́ Johenan chọrọ ịkpọrọ ha gaa Ijipt. Ma o bu ụzọ jụọ Jeremaya ihe ha ga-eme. Onye amụma ahụ gere Johenan ntị ma kpekuo Jehova ekpere. O mechara gwa ya ihe na-agba ume Jehova kwuru, gwakwa ya na ọ ga-abara ha uru ma ọ bụrụ na ha emee ihe Jehova kwuru, nke bụ́ ka ha nọrọ n’ala ahụ. (Jere. 42:1-12) Jeremaya gere ma Zedekaya ma Johenan ntị, nke pụtara na o gere ntị tupu ya ekwuo okwu. Ige ntị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgba ndị ọzọ ume. Hapụ onye ahụ nọ ná nsogbu ka o kwuo otú obi dị ya. Gee ya ntị mgbe ọ na-ekwu nsogbu ya na ihe bụ́ ụjọ ya. Gbaa ya ume mgbe o kwesịrị ekwesị. Chineke agaghị esi n’eluigwe gwa gị ihe ị ga-agwa onye e kwesịrị ịgba ume. Ma, i nwere ike ịgwa ya okwu ọma ndị si n’Okwu Chineke, bụ́ ihe Chineke ga-eme n’ọdịnihu.—Jere. 31:7-14.

Foto dị na peeji nke 91

18, 19. Olee otú ihe a kọrọ banyere ndị Rikab na Ibed-melek si gosi otú e kwesịrị isi na-agba ndị ọzọ ume?

18 Zedekaya na Johenan anabataghị ndụmọdụ Jeremaya nyere ha. Ma eleghị anya, ụfọdụ ndị taa agaghị anabata ndụmọdụ i nyere ha. Ekwela ka nke ahụ mee ka ị daa mbà. E nwere ndị nabatara ume Jeremaya gbara ha, e nwekwara ike inwe ọtụtụ ndị ga-anabata ume ị gbara ha. Cheta ndị Rikab, bụ́ ndị Kenaịt ha na ndị Juu bụrụ enyi ọtụtụ afọ. Otu n’ime iwu nna nna ha bụ́ Jehọnadab nyere ha bụ ka ha ghara ịṅụ mmanya n’ihi na ha bụ ndị mbịarambịa. Mgbe ndị Babịlọn na-ebuso ndị Juu agha, Jeremaya kpọbatara ndị Rikab n’ụlọ iri nri dị n’ụlọ Jehova. Ọ dọwara mmanya n’ihu ha, nke bụ́ ihe Chineke sịrị ya mee. Kama inupụ isi ka ndị Izrel, ndị Rikab rubeere nna nna ha isi. Ha ekweghị aṅụ mmanya ahụ. (Jere. 35:3-10) Jeremaya gwara ha otú Jehova si jaa ha mma nakwa ihe Jehova kwere nkwa imere ha n’ọdịnihu. (Gụọ Jeremaya 35:14, 17-19.) I kwesịrị ime ụdị ihe ahụ mgbe ị na-agba ndị mmadụ ume: Jiri obi gị niile jaa ha mma mgbe o kwere gị omume.

19 Jeremaya gwakwara Ibed-melek otú Jehova si jaa ya mma. Ibed-melek bụ onye Itiopia nke na-eje ozi n’obí Eze Zedekaya. Ndị isi ndị Juu rụsara Jeremaya arụrụala, tụba ya n’olulu apịtị juru ma hapụ ya ebe ahụ ka ọ nwụọ. Ibed-melek rịọrọ Eze Zedekaya, ya enye ya ikike ịga kpọpụta onye amụma ahụ. Nwoke ahụ na-abụghị onye Juu gara kpọpụta Jeremaya n’agbanyeghị na ndị ọzọ nwere ike imegide ya. (Jere. 38:7-13) Ebe ọ bụ na ihe ahụ Ibed-melek mere nwere ike ime ka ndị isi ndị Juu na-ele ya anya ọjọọ, ọ ga-abụ na ọ tụrụ ụjọ ihe ha nwere ike ime ya n’ọdịnihu. Jeremaya agbachighị nkịtị, na-eche na Ibed-melek ga-emecha kwụsị ịtụ ụjọ. Ọ gbara Ibed-melek ume, gwa ya ihe ọma Chineke ga-emere ya n’ọdịnihu.—Jere. 39:15-18.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị imere ụmụnna anyị, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi?

20 N’eziokwu, ka anyị na-agụ akwụkwọ Jeremaya, anyị ga-ahụ ihe atụ ndị magburu onwe ha bụ́ ndị ga-eme ka anyị mata otú anyị ga-esi eme ihe Pọl onyeozi gbara ụmụnna anyị nọ na Tesalonaịka ume ka ha mee, nke bụ́: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu . . . Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere unu.”—1 Tesa. 5:11, 28.

Olee ihe ndị ị mụtara n’aka Jeremaya, bụ́ ndị ị ga-achọ ime mgbe ị na-agba mkpụrụ obi ike gwụrụ ume?

a N’oge Zedekaya na-achị, e nwere Pash-họ ọzọ, nke bụ́ onyeisi rịọrọ eze ka o gbuo Jeremaya.—Jere. 38:1-5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya