Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 6/15 p. 3-4
  • Ọchịchọ a na-achọ Ịnọ Ná Ntụkwasị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọchịchọ a na-achọ Ịnọ Ná Ntụkwasị Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Mgbalị Iji Kwụsị Mpụ
    Teta!—1996
  • Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Iweta Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Na-adịgide Adịgide?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ọgụ Na-enweghị Isi A Na-alụso Mpụ
    Teta!—1998
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 6/15 p. 3-4

Ọchịchọ a na-achọ Ịnọ Ná Ntụkwasị Obi

ỊNỌ ná ntụkwasị obi. Ndị ndú ụwa na-ekwurịta okwu iji nweta ya. Ndị ndú okpukpe na-ekpe ekpere maka ya. Ma, nye onye nkịtị na-aga n’okporo ụzọ, ịnọ ná ntụkwasị obi yiri nrọ nke na-apụghị imezu emezu. Were, dị ka ihe atụ, Ron, onye ji ụkwụ na-eje ọrụ n’obodo kasị buo ibu na South Africa, bụ́ Johannesburg.

“Ụmụ nwoke ise gbara m gburugburu, otu onye ji mma tụgide m n’akpịrị, onye nke ọzọ jikwa mma nọrọ n’azụ m. Ha manyesịrị aka n’akpa uwe m nile ná ntabi anya ole na ole. Eyiri m ọkụkọ e fochasịrị abụba. Ndị na-agafe n’okporo ụzọ lefuuru m nnọọ anya.” Ron alụsoghị ha ọgụ, o wee lanarị n’enweghị mmerụahụ ọ bụla.

Nye ọtụtụ ndị, ịga ije n’okporo ụzọ ndị dị n’obodo ukwu ọ bụla bụ ihe na-akpata nchegbu. ‘M ga-esi aṅaa zere ịbụ onye a wakwasịrị?’ bụ ajụjụ nke dị n’uche ha. Ha na-eme ngwa ngwa ije zụrụ ihe ha chọrọ ịzụrụ n’ahịa ka ha nwee ike ịlaghachi n’ịnọ ná ntụkwasị obi nke ebe obibi ha. Ma, ọ̀ bụ ruo n’ókè ha aṅaa ka ebe obibi ha nọ ná nchebe? Akwụkwọ ahụ bụ Total Home Security kwuru, sị, “Ohere e nwere nke mmadụ ịmabata n’ụlọ gị, bukọrọ ụfọdụ ma o bụ ihe onwunwe gị nile ma gbafuo n’enweghị ụzọ ọ bụla a ga-esi chọta ya na-amụbawanye nke ukwuu kwa afọ.”

N’ihi nke a, ndị nwe ụlọ na-ede ịma ọkwa dị iche iche ndị na-adọ ndị na-eme mwabata aka ná ntị na e nwere nkịta ndị dị oké egwu na mbara èzí ahụ ma ọ bụ na ndị bucha égbè na-eche nche n’ebe ahụ. N’ógbè dị iche iche, ndị nwe ụlọ na-ejikọta aka ná mgbalị ha na-eme ibuso imempụ agha. Akwụkwọ akụkọ bụ Security Focus kwuru, sị, “E nwere ihe karịrị 60,000 atụmatụ na Britain nanị, bụ́ ndị jikọtara 750,000 ezinụlọ dị iche iche.” Otu onye ọrụ inshọransị nọ n’Africa kwuru, sị, “Ebe imempụ na-amụba, ọ bụ ihe mgbe ochie, bụ́ ndị agbata obi ịnọ n’adịghị emesorịta onwe ha omume enyi.”

Ndị so n’atụmatụ iche nche n’ógbè dị iche iche na-elepụrịta anya iji chebe ọdịmma ibe ha, na-akpọtụkwara ndị ụlọ ọrụ uwe ojii mgbe ọ bụla ha hụrụ ihe a na-enyo enyo.a Ma otu akwụkwọ mgbasa ozi kọwaara otu onye so n’òtù dị otú a, bụ́ onye a wabatara n’ụlọ ya ma zuo ohi, sị: “Ọ dị mwute ịmara na atụmatụ ahụ abụghị ihe na-ekwe nkwa na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ a ga-abịa zuo ohi n’ụlọ gị. Ọ dịghị atụmatụ nchebe ọ bụla dị adị nke pụrụ ikwe nkwa dị otú ahụ. . . . I ghaghị ịnọgide na-ahụ na a kpọchisịrị ụzọ gị nile akpọchi, na i nwere ihe na-agba àmà mgbe mmadụ wabatara n’ụlọ gị, na i mewokwa ihe ndị ezi uche dị na ha iji hụ maka nchebe.”

Ọ bụ ezie na atụmatụ iche nche n’ógbè dị iche iche enwewo mmetụta ụfọdụ, ọ bụ ihe a na-arụ ụka ma hà na-ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ imempụ ná ngụkọta ya. Shapland na Vagg kọwara n’akwụkwọ bụ Policing by the Public, sị, “Mbelata ndị e kwuru na a na-enwe n’imempụ n’otu ógbè dị nta bụ nanị ‘ihe ịga nke ọma’ ma ọ bụrụ na e nweghị ‘mbufe’ nke imempụ ahụ gaa n’ógbè ndị dị nso.” Otú a, n’obodo ukwu ụfọdụ ebe òtù ndị na-eche nche n’ógbè dị iche iche kwuworo na ha enwewo ihe ịga nke ọma ndị pụtara ìhè, e nwewo oké mmụba n’imempụ n’ógbè ndị ọzọ nke otu obodo ndị ahụ ebe ọ bụ ihe siri ike ịhazi atụmatụ iche nche ndị dị otú ahụ.

Onye odeakwụkwọ nke otu atụmatụ zuru mba ọnụ nke nwere ihe karịrị 20,000 ndị so na ya kwetara, sị, “E nwere ógbè ụfọdụ ebe atụmatụ iche nche na-adịghị adịcha irè dị ka ọ na-adị ná ndị ọzọ.” Ihe ọ na-ekwu bụ banyere ebe ndị buru ibu “ndị dịpụrụ adịpụ site n’obodo, ebe ndị agbata obi na-adịghị ahụrịta onwe ha, ebe iche nche na-adịghị adịkwa irè.” Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye si n’otu obodo ukwu dị n’America kwafee n’otu mbara ala dị 50 eka [20 hekta] nke dị nso otu obodo nta. N’ime afọ ole na ole, ndị ajọ mmadụ tikara ụlọ ha ugbo abụọ. Nwanyị ahụ kwupụtara mmetụta nke ọtụtụ ndị bi n’ime ime obodo, sị: “Ana m agbalị ime ka ọ́ dịghị ihe merenụ, ma egwu na-atụ m. . . . Ọ dịghị mgbe m na-enwe mmetụta nke onye nọ ná nchebe.” Ná mba ebe e nwere ọtụtụ nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị bi n’ime ime obodo na-eche ime ihe ike ka ukwu ihu, bụrụkwa ndị a na-arụgidekarị gaa n’inwe ndị ha ga-adụnyere úkwù.

Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị ji na-enwe agụụ ‘ịlaghachi n’oge ọma ndị gaworo aga.’ Akwụkwọ ahụ bụ The Growth of Crime kwuru, sị, “N’ihe dị ka mmalite narị afọ nke a, e nwere . . . echiche ahụ zuru ebe nile nke bụ na [imempụ] ga-ebelatatụ n’ihe banyere ọdịdị ya.” Ma gịnị mere kama nke ahụ? Ndị odeakwụkwọ bụ Sir Leon Radzinowicz na Joan King kọwara, sị: “N’ime iri afọ abụọ mbụ nke narị afọ nke a, ọbụna n’oge agha ụwa mbụ ahụ, ọ̀tụ̀tụ̀ imempụ nọgidere n’agbanweghị agbanwe, ya bụ na mmụba ya agabigaghị ọ̀tụ̀tụ̀ mmụba nke ọnụ ọgụgụ mmadụ bi n’ụwa. Ọ bụ n’oge oké ndakpọ ahụ sochiri agha ahụ ka a malitere ịhụ usoro nke na-adịgide adịgide. N’ime afọ ndị ahụ nke ọgba aghara n’ihe banyere akụ na ụba, enweghị ọrụ na oké agha ọzọ daranụ, [imempụ] mụbara n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwu . . . Otu ihe nke ị na-ahụta ozugbo i lere anya n’ihe banyere imempụ n’ụwa dum bụ mmụba nke nọgidere na-aga n’ihu n’ebe nile.”

‘Ịba ụba mmebi iwu’ nke a, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-atụghị anya ya, bụ n’ezie ihe e buru n’amụma. E bururịị ụzọ kwuo okwu n’ime Bible banyere oké ọdachi ndị bịakwasịworo ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe mmalite nke agha ụwa mbụ ahụ na 1914. Jisọs buru amụma na ajọ usoro ihe nke mmadụ na-abịaru njedebe ya nso: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba uba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.”—Matiu 24:3, 7, 12; leekwa Luk 21:10, 11.

Jisọs kwukwara, sị: “Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” Ya mere, i nwere ihe mere ị ga-eji na-atụ anya ọdịnihu dị mma. Ọ fọrọ ntakịrị ka e mezuo ọchịchọ mmadụ na-achọ ịnọ ná ntụkwasị obi n’ụwa dum.—Luk 21:28-32.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe a gbara ha ume isonyere òtù ndị nche, ọ na-enye ndị Kraịst obi ụtọ inwe, dị ka ihe nduzi, ụkpụrụ ndị ahụ di n’Aịsaịa 2:2-4 na Jọn 17:16.—Lee Ụlọ Nche, January 15, 1984, peji 23-25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya