Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ie p. 30-31
  • Atụmanya Pụrụ Iche!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Atụmanya Pụrụ Iche!
  • Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị Pụkwara Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi
  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Ga-adị na Ya—Ị Pụrụ Ibi na Ya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Oké Ìgwè Mmadụ Ndị Nọ n’Ihu Ocheeze Jehova
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
ie p. 30-31

Atụmanya Pụrụ Iche!

“Onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.”—JỌN 11:26.

1. A ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ugbu a n’ọnwụ gaa n’ụdị gburugburu ebe obibi ndị dị aṅaa?

MGBE a kpọlitere ọtụtụ nde mmadụ ná mbilite n’ọnwụ, a gaghị akpọghachi ha ná ndụ n’ụwa tọgbọ chakoo. (Ọrụ 24:15) Ha ga-eteta n’ime gburugburu ebe obibi a chọkwuru mma, ha ga-achọpụtakwa na a kwadebeworo ha ebe obibi, ákwà, na ụba nke ihe oriri. Olee ndị ga-akwadebe ihe ndị a dum? N’ụzọ doro anya, a ga-enwe ndị bi n’ụwa ọhụrụ ahụ tupu mbilite n’ọnwụ elu ala amalite. Ma olee ndị ka ha bụ?

2-4. Atụmanya dị aṅaa pụrụ iche na-echere ndị bi ná “mgbe ikpeazụ”?

2 Mmezu amụma Bible na-egosi na anyị na-ebi ná “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a.a (2 Timoti 3:1) N’oge na-adịghị nnọọ anya ugbu a, Jehova Chineke gaje itinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ ma hichapụ ihe ọjọọ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:10, 11; Ilu 2:21, 22) N’oge ahụ, gịnị ga-eme ndị na-ejere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi?

3 Jehova agaghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 145:20) O metụbeghị ihe dị otú ahụ, ọ gaghịkwa eme ya mgbe ọ ga-ekpochapụ ihe ọjọọ nile n’ụwa. (Tụlee Jenesis 18:22, 23, 26.) N’ezie, akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-ekwu banyere “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” na-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpughe 7:9-14) Ee, oké ìgwè mmadụ ga-alanarị oké mkpagbu ahụ nke ga-eweta ụwa ọjọọ dị ugbu a ná njedebe, ha ga-abanyekwa n’ụwa ọhụrụ nke Chineke. N’ebe ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi pụrụ irite uru zuru ezu site ná ndokwa magburu onwe ya nke Chineke ime ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ha pụọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ. (Mkpughe 22:1, 2) Otụ́ a, “oké ìgwè mmadụ” ahụ agaghị anwụkwa anwụ ma ọlị. Lee atụmanya pụrụ iche nke a bụ!

4 Ànyị pụrụ inwe obi ike n’olileanya a dị ịtụnanya? Kpọmkwem! Jisọs Kraịst n’onwe ya gosiri na a ga-enwe oge mgbe ndị mmadụ ga-adị ndụ n’anwụghị anwụ ma ọlị. Ntakịrị oge tupu ọ kpọlite enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ, Jisọs gwara Mata, sị: “Onye ọ bụla nke na-adị ndụ, nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.”—Jọn 11:26.

Ị Pụkwara Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

5, 6. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala, gịnị ka i kwesịrị ime?

5 Ị̀ chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala? Ọ̀ na-agụ gị agụụ ịhụ ndị ị hụrụ n’anya ọzọ? Mgbe ahụ ị ghaghị ịnara ezi ihe ọmụma banyere uche na nzube Chineke. N’otu ekpere o kpegaara Chineke, Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

6 Ọ bụ uche Chineke ka ‘mmadụ nile bịaruo mmazu nke eziokwu.’ (1 Timoti 2:3, 4) Ugbu a bụ oge ịmụta otú gị onwe gị, tinyere ọtụtụ nde ndị ọzọ nọworị na-eme uche Chineke, pụrụ isi dị ndụ n’ime Paradaịs n’elu ala. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmụtakwu ihe banyere Chineke na ihe ọ chọrọ. Gịnị ma ị kpọtụrụ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres dịkarịsịrị gị nso nke e depụtara na peji na-esonụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, peji nke 98-107, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ọ gaghị adị “oké ìgwè mmadụ” mkpa ịnwụ anwụ ma ọlị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya