Gịnị Na-eme Ka I Nwee “Aṅụrị”?
1. Gịnị na-eme ka anyị nwee aṅụrị mgbe ọ bụla ọnwa gwụrụ?
1 Gịnị na-eme ka i nwee “aṅụrị” mgbe ọnwa gwụrụ a gwa ndị nkwusa ka ha weta akụkọ ozi ha? (Gal. 6:4) Anyị niile kwesịrị ịna-aṅụrị ọṅụ na anyị ji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi. Ya sọkwa ya ya bụrụ na anyị bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-enye otu narị awa na iri atọ n’ọnwa ma ọ bụkwanụ na anyị na-enye nkeji iri na ise n’ọnwa n’ihi otú ihe si dịrị anyị.—Ọma 100:2.
2. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova?
2 Anyị chọọ inye Jehova onyinye, anyị kwesịrị inye ya ihe kacha mma anyị nwere n’ihi na ọ bụ Ọkaakaa eluigwe na ala. (Mal. 1:6) Anyị raara onwe anyị nye ya ime uche ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. N’ihi ya, aṅụrị na-eju anyị obi ma ọ bụrụ na anyị echeta ná ngwụcha ụbọchị ma ọ bụkwanụ ná ngwụcha ọnwa ọ bụla na anyị wepụtara oge jiri ike anyị niile jeere Jehova ozi. (Ilu 3:9) Ma, ọ bụrụ na akọnuche anyị na-ama anyị ikpe na anyị emechaghị ihe anyị kwesịrị ime, anyị amara na anyị kwesịrị ịrụkwu ọrụ n’otú anyị si ejere Jehova ozi.—Rom 2:15.
3. Olee ihe mere na ọ dịghị mma mmadụ iji onwe ya atụnyere onye ọzọ?
3 Ejila Onwe Gị Atụnyere Onye Ọzọ: Ọ dịghị mma mmadụ iji onwe ya na-atụnyere ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ na-enwe mwute na ihe ọ na-eme ugbu a n’ozi Jehova aharughịzi ka ihe ọ na-eme mgbe ume ka dị ya n’ahụ́. Otú ihe si dịrị gị ugbu a nwere ike ịdị iche n’otú o si dịrị gị n’oge gara aga. Ike mmadụ niile ahaghị. Ọ bụrụ na mmadụ ejiri onwe ya na-atụnyere onye ọzọ, o nwere ike chọwa ime ka onye ahụ n’agbanyeghị na ọ gaghị emeli ihe onye ahụ na-eme. Nke a nwekwara ike ime ka o chewe na o nweghị ihe ya dị mma ya. (Gal. 5:26; 6:4) O nweghị onye Jizọs ji tụnyere onye ọzọ. Kama nke ahụ, ọ na-aja ndị mmadụ mma ma ha mee ike ha.—Mak 14:6-9.
4. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe atụ ahụ Jizọs ji talent mee?
4 O nwere ihe atụ Jizọs mere gbasara otu nwoke nke nyere ohu ya nke ọ bụla talent ọ ga-eji zụọ ahịa “dị ka ike ya hà.” (Mat. 25:15) Mgbe ọ lọtara ebe ọ gara ma chọọ ka ha gwa ya otú ha na ije si gaa, ọ jara ndị nke ji ike ha niile zụọ ahịa ahụ mma, ha sokwaara ya ṅụrịa ọṅụ. (Mat. 25:21, 23) Ọ bụrụ na anyị ejiri ike anyị niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị na Jehova ga-adị ná mma, nke a ga-emekwa ka anyị nwee aṅụrị.